Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwex isiokwu 16
  • A Zara Ekpere Otu Nwaanyị Kpuru Ìsì

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Zara Ekpere Otu Nwaanyị Kpuru Ìsì
  • Ihe Ndịàmà Jehova Kọrọ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Kụziere Ndị Ìsì Okwu Jehova
    Ozi Alaeze Anyi—2015
  • “Onye Ihe Na-agara nke Ọma Ka Mmadụ nke Chọtaworo Amamihe Bụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • “Ọ Dịtụbeghị Mgbe E Gosiri M Ụdị Ịhụnanya A”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Ihe Ndịàmà Jehova Kọrọ
ijwex isiokwu 16
Ebe otu nwanna nwaanyị na-enyere otu nwaanyị kpuru ìsì aka ka ọ gafee okporo ụzọ.

A Zara Ekpere Otu Nwaanyị Kpuru Ìsì

Otu Onyeàmà Jehova bi n’Eshia aha ya bụ Yanmei nyeere otu nwaanyị kpuru ìsì aha ya bụ Mingjie aka ya agafee okporo ụzọ.a Mingjie kelere ya ma sị ya: “I meela. Chineke gọzie gị!” Yanmei mechaziri jụọ Mingjie ma ọ̀ ga-achọ ka ya na ya mụwa Baịbụl. Mingjie mechara gwa ya na ya na-ekpe ekpere kwa ụbọchị ka Chineke gosi ya ndị na-efe ya n’eziokwu. Gịnị mere o ji na-ekpe ụdị ekpere a?

Mingjie kọwara na n’afọ 2008, otu enyi ya kpukwara ìsì gwara ya ka o soro ya gaa otu chọọchị na-enyere ndị nwere nkwarụ aka. Mgbe Mingjie gechara okwuchukwu e kwuru ebe ahụ, ọ jụrụ ụkọchukwu ahụ akwụkwọ o si na ya gụọ ihe ndị o kwuru. Ọ gwara ya na ọ bụ na Baịbụl, Okwu Chineke, ka ya si gụọ ya. Mingjie chọsiri nnọọ ike ịgụ ya. N’ihi ya, ọ nwetara Baịbụl dị n’asụsụ Chaịniiz, nke e dere ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì. Baịbụl a nwere mpịakọta iri atọ na abụọ, ọ gụchakwara ya n’ime ọnwa isii. Ka Mingjie na-agụ Baịbụl ahụ ka ọ nọ na-achọpụta na ozizi Atọ n’Ime Otu, bụ́kwanụ nke chọọchị ahụ ọ na-aga na-akụzi, bụ ozizi ụgha. Mụtakwa na aha Chineke bụ Jehova.

Ka oge na-aga, Mingjie bidoro hụwa àgwà ọjọọ ndị chọọchị ahụ na-akpa, nke a wutekwara ya. Ọ chọpụtara na ndụ ha na-ebi dị iche n’ihe ndị ọ na-agụta na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, ha na-enye ndị na-ahụ ụzọ nri nke dị mma, ma nye ndị mkpuru ìsì nri e rifọrọ erifọ. Ụdị mmegbu ahụ wutere Mingjie, nke a meziri o ji chọwa chọọchị ndị ọzọ dị n’ebe o bi ka ọ mara ma à ga-enwe ihe dị iche. Ọ bụ ihe a mere Mingjie ji na-ekpe ekpere ka ya chọta ndị bụ́ ezigbo Ndị Kraịst.

Ihe ọma ahụ Yanmei meere Mingjie mere ka Mingjie kweta na ya na ya ga-amụ Baịbụl. Mingjie mechara gaa ọmụmụ ihe ya mbụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova. Mingjie kọrọ ihe mere ụbọchị ahụ, sị: “O nweghị ihe ga-eme ka m chefuo ọmụmụ ihe mbụ ahụ m gara. Ụmụnna ndị nwoke na ndị nwaanyị niile kelere m ọfụma. Ihe ahụ ha mere metụrụ m n’ahụ́. Ọ bụ eziokwu na m kpuru ìsì, achọpụtara m na ịhụnanya ha abụghị nke ihu abụọ.”

Ọmụmụ Baịbụl Mingjie na-amụ nọ na-aga ọfụma nke na o bidoro ịgachi ọmụmụ ihe anya. Ihe kacha atọ ya ụtọ bụ ịgụ abụ Alaeze. Ma ọ na-esiri ya ike ịgụ n’ihi na e nweghị akwụkwọ abụ anyị ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì nke ọ ma agụ. N’ihi ya, ndị nọ n’ọgbakọ nyeere Mingjie aka ya ejiri aka ya mepụta akwụkwọ abụ nke ya. O were ya awa iri abụọ na abụọ tupu ya emepụtaghachi abụ anyị dị otu narị na iri ise na otu ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì! N’Eprel afọ 2018, Mingjie malitere iso kwusawa ozi ọma ụlọ n’ụlọ, o mechakwara na-eji ihe dị ka awa iri atọ na-ekwusa ozi ọma kwa ọnwa.

Ebe e ji ihe ndị e ji emepụta mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì na-emepụtaghachi akwụkwọ.

Imepụtaghachi akwụkwọ ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì abụghị obere ọrụ

Mgbe Mingjie na-akwadebe ime baptizim, Yanmei tinyere ajụjụ niile na amaokwu Baịbụl ndị dị n’akwụkwọ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova na teepu ka o nwee ike gere ha. Na Julaị afọ 2018, e mere Mingjie baptizim. Ọ sịrị: “Ịhụnanya ụmụnna gosiri m ná mgbakọ ahụ metụrụ m n’ahụ. O mere ka anya mmiri gbaa m n’ihi na ugbu a ka m batara n’ezigbo ọgbakọ Chineke.” (Jọn 13:​34, 35) Mingjie ekpebisiela ike na ya ga na-egosikwa ndị ọzọ ụdị ịhụnanya ahụ e gosiri ya, nke a mere o ji bụrụ onye ozi oge niile ugbu a.

a Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya