Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g16 nke 4 p. 6
  • 3 Adala Mbà

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 3 Adala Mbà
  • Teta!—2016
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị Ga-emeli Ihe Ndị I Kpebiri Ime n’Ofufe Jehova
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Kwee Ka Omume Maara Gị Ahụ Baara Gị Uru
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Otú Ị Ga-esi Akwụsị Àgwà Ririla Gị Ahụ́
    Teta!—2016
  • Gaa n’Ihu Irute Ihe Mgbaru Ọsọ ahụ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2016
g16 nke 4 p. 6
Ebe otu nwaanyị na-akanye ihe na kalenda

ISIOKWU TETA! A | OTÚ Ị GA-ESI AKWỤSỊ ÀGWÀ RIRILA GỊ AHỤ́

3 Adala Mbà

Kalenda a kanyechara ihe

O nwere otu ọkachamara kwuru na ịmụta àgwà ọhụrụ na-ewe mmadụ ụbọchị iri abụọ na otu. Ma, ihe ndị a chọpụtarala na-egosi na ndị ụfọdụ anaghị eru ụbọchi ole ahụ tupu ha amụta àgwà ọhụrụ. O nwekwara ndị nke ha na-akarị ụbọchị ole ahụ. Ma, ihe a ekwesịghị ime ka anyị daa mbà.

Ka e were ya na ị chọrọ ịna-emega ahụ́ ugboro atọ n’izu.

  • N’izu nke mbụ, i megara ahụ́ ugboro atọ ahụ i kpebiri.

  • N’izu nke abụọ, gị emee ya ugboro abụọ.

  • N’izu nke atọ gị emezuokwa ya ugboro atọ.

  • N’izu nke anọ, gị ejisie ike mee ya naanị otu ugboro.

  • N’izu nke ise, gị emezuokwa ya ugboro atọ ahụ ọzọ. Malite mgbe ahụ gawa, ị nọzi na-emezu ya otú ahụ ị chọrọ.

Ihe ọ pụtara bụ na o were gị izu ise tupu ya amara gị ahụ́. O nwere ike ịdị gị ka à ga-asị na o were gị oge hiri nne. Ma, obi ga-adị gị ụtọ na i mewela ihe ọhụrụ i kpebiri ịna-eme.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Onye ezi omume nwere ike ịda ọbụna ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha.”—Ilu 24:16.

Amaokwu Baịbụl a na-ekwu na anyị ekwesịghị ịda mbà. Ihe ka mkpa bụ na anyị mechara mewe ihe anyị kpebiri ime, ya amarakwa anyị ahụ́, ọ bụghị ugboro ole anyị dara.

Ihe ka mkpa abụghị ugboro ole ị dara, kama ọ bụ ugboro ole i biliri mgbe ị dara

IHE I NWERE IKE IME

  • Ọ bụrụ na i kpebiri ịkwụsị otu ihe ririla gị ahụ́, gị emechaa mee ya ọzọ, echekwala na ọ pụtara na ị gaghị akwụsịli ya. Buru n’obi na i nwere ike ịda mgbe ụfọdụ.

  • Na-echeta oge ndị i mere nke ọma. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i kpebiri na ị gaghịzi eji olu ike na-agwa ụmụ gị okwu, i nwere ike ịjụ onwe gị, sị: ‘Olee mgbe ikpeazụ iwe juru m obi, mụ ejide onwe m kama ịbawara ụmụ m mba? Gịnị ka m mere mgbe ahụ? Olee otú m ga-esi eme ya ọzọ?’ Ichebara ụdị ajụjụ ndị a echiche ga-eme ka ị na-emekwu nke ọma.

Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịma ihe Baịbụl kwuru gbasara ihe ndị ọzọ nwere ike inyere gị aka ná ndụ, dị ka otú ị ga-esi kwụsị ịna-echegbu onwe gị, otú unu ga-esi na-ebi n’udo n’ezinụlọ unu, nakwa otú ị ga-esi na-enwe ezigbo obi ụtọ, gwa Onyeàmà Jehova ọ bụla ị hụrụ ma ọ bụ gị agaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org/ig.

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ ỌZỌ GA-ENYERE GỊ AKA

“Anya gị nke na-enwu gbaa kwesịrị ilegide n’ihu gị.”—Ilu 4:25.

“Ana m echefu ihe ndị dị n’azụ, na-amatịkwa onwe m inweta ihe ndị dị n’ihu, ana m achụso ihe mgbaru ọsọ ahụ.”—Ndị Filipaị 3:13, 14.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya