Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g19 nke 3 p. 12-13
  • Ihe Ime Mmụọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ime Mmụọ
  • Teta!—2019
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • INWE OLILEANYA
  • ỊMATA AZỊZA AJỤJỤ NDỊ NA-ECHU ANYỊ ỤRA
  • IHE NDỊ ỌZỌ BAỊBỤL KWURU
  • Olee Otú Anyị Ga-esi Amata Azịza Ajụjụ Ndị Na-echu Anyị Ụra?
    Olee Otú Anyị Ga-esi Amata Azịza Ajụjụ Ndị Na-echu Anyị Ụra?
  • Ihe Ga-enyekwuru Ezinụlọ Aka
    Teta!—2018
  • Ihe Ndị Ọzọ Ga-enyere Ndị Nne na Nna Aka
    Teta!—2019
  • Jiri Ofufe Chineke Kpọrọkwuo Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2019
g19 nke 3 p. 12-13
Ebe otu nwaanyị nọ ọdụ n’oche na-atụgharị uche

Ihe Ime Mmụọ

Dị ka e kwuru n’isiokwu nke mbụ n’akwụkwọ a, ọtụtụ ndị kwetara na Baịbụl bụ akwụkwọ dị nsọ na-ekwu banyere Chineke. Ha chọpụtara na ha gụọ Baịbụl, ọ na-eme ka ha bịaruo Chineke nso, ha aghọtakwa ihe mere Chineke ji kee anyị.

Na Baịbụl, a na-ekwukarị okwu bụ́ “ihe ime mmụọ” ma e kwuwe banyere otú mmadụ si ebi ndụ ma ọ bụ otú mmadụ si ele ihe anya. (Jud 18, 19) Ihe na-akakarị onye anụ ahụ́ na-achị mkpa bụ ihe gbasara onwe ya. Ma, onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe anaghị eji ihe Chineke kwuru egwu egwu.—Ndị Efesọs 5:1.

INWE OLILEANYA

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ì nwewo obi ịda mbà n’ụbọchị ahụhụ? Ike gị ga-adị ntakịrị.”—Ilu 24:10.

IHE Ọ PỤTARA: Ịda mbà n’obi nwere ike ime ka o siere anyị ike idi nsogbu. Ma, ọ bụrụ na anyị nwere olileanya, ọ ga-enyere anyị aka idi nsogbu. Ọ ga-emekwa ka anyị na-ele ọtụtụ nsogbu anyị nwere anya ka ihe ga-emecha kwụsị. Ihe ọma nwedịrị ike isi na ha pụta.

IHE I NWERE IKE IME: Na-eche banyere ihe ọma ndị ga-eme n’ọdịnihu. Kama ịna-echegbu onwe gị banyere ihe ndị nwere ike ime ma ọ bụkwanụ ichere ka ihe niile dịchaa mma, gbaa mbọ na-eme ihe ndị i bu n’obi ime ná ndụ. Ma, “ihe a na-atụghị anya ya” nwekwara ike ime. (Ekliziastis 9:11) Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ oge, ihe anaghị adịcha njọ otú anyị chere na ọ ga-adị. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo, sị: “Ghaa mkpụrụ gị n’ụtụtụ, ekwekwala ka aka gị zuo ike ruo n’anyasị; n’ihi na ị maghị ebe ọ ga-eme nke ọma, ma ọ̀ bụ n’ebe a ma ọ bụ n’ebe ahụ, ma ọ̀ bụ na ha abụọ ga-adịcha mma.”—Ekliziastis 11:6.

ỊMATA AZỊZA AJỤJỤ NDỊ NA-ECHU ANYỊ ỤRA

IHE BAỊBỤL KWURU: “Mee m ka m nwee nghọta . . . Okwu gị dum bụ eziokwu.”—Abụ Ọma 119:144, 160.

IHE Ọ PỤTARA: Baịbụl na-aza ajụjụ ọtụtụ ndị na-ajụkarị. Dị ka ihe atụ, ọ na-aza ajụjụ ndị dị ka

  • Olee ebe anyị si bịa n’ụwa?

  • Gịnị mere anyị ji nọrọ n’ụwa a?

  • Gịnị na-eme mmadụ ma ọ nwụọ?

  • Mmadụ nwụọ, nke ya ọ̀ gaala?

Ndụ ọtụtụ nde mmadụ bi n’ụwa akala mma n’ihi na ha mụtara ihe Baịbụl na-akụzi banyere ajụjụ ndị a na ajụjụ ndị ọzọ.

IHE I NWERE IKE IME: Jiri aka gị chọpụta ihe Baịbụl na-akụzi. Gwa otu n’ime Ndịàmà Jehova ka o nyere gị aka ịghọta Baịbụl. Gaa na jw.org, ma ọ bụkwanụ gị agaa ọmụmụ ihe anyị, onye ọ bụla nwekwara ike ịga ya. A naghị ana ndị bịara ọmụmụ ihe anyị ego.

IHE NDỊ ỌZỌ BAỊBỤL KWURU

Ebe otu nwaanyị na-ele vidio aha ya bụ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị? na jw.org

Gaa na jw.org/ig lee vidio bụ́ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị? Ọ dị n’ihe karịrị asụsụ 880

MARA MKPA IME MMỤỌ GỊ.

“Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.”—MATIU 5:3.

MỤTAKWUO BANYERE CHINEKE.

“Chọọ Chineke . . . ma chọta ya n’ezie . . . ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.”—ỌRỤ NDỊOZI 17:27.

GỤỌ MA TỤGHARỊA UCHE N’OZI DỊ NA BAỊBỤL.

“Iwu Jehovaa na-atọ ya ụtọ, ọ na-agụkwa iwu ya n’olu dị ala ehihie na abalị. . . . Ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma.”—ABỤ ỌMA 1:2, 3.

a Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya