Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 85
  • A Mụọ Jizọs n’Ụlọ Anụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Mụọ Jizọs n’Ụlọ Anụ
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Onye A Bụ Ọkpara M”
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Olee Ebe A Mụrụ Jizọs, Oleekwa Mgbe A Mụrụ Ya?
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ndị Mmụọ Ozi Mere Ka A Mata na A Mụọla Jizọs
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ọmụmụ Jisọs—n’Ole Ebe, Ole Mgbekwa?
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 85
Mgbe Josef, Meri na Jizọs nọ n’ụlọ anụ mgbe a mụrụ Jizọs ọhụrụ

AKỤKỌ NKE 85

A Mụọ Jizọs n’Ụlọ Anụ

Ị̀ MA onye nwa ọhụrụ a bụ? Ee, ọ bụ Jizọs. A mụrụ ya ọhụrụ n’ụlọ anụ. Meri na-enyiwe Jizọs n’ime ebe a na-edebere ịnyịnya na anụmanụ ndị ọzọ nri ka ha rie. Ma gịnị mere Meri na Josef ji soro anụmanụ ndị a nọrọ n’ebe a? Ebe a abụghị ebe e kwesịrị ịmụ nwa, ka ọ̀ bụ?

Ee e, ọ bụghị. Ma lee ihe mere ha ji nọrọ n’ebe a: Siza Ọgọstọs, bụ́ onye na-achị Rom, nyere iwu na mmadụ ọ bụla ga-ala n’obodo a mụrụ ya iji debanye aha ya n’akwụkwọ. Ọ bụ na Betlehem ebe a ka a mụrụ Josef. Ma mgbe ya na Meri rutere, ọ dịghị ebe ọ bụla ha hụrụ ụlọ. N’ihi ya, ha bịara n’ụlọ anụmanụ ebe a. Ọ bụkwa n’ụbọchị ahụ ka Meri mụrụ Jizọs! Ma, dị ka ị pụrụ ịhụ, ahụ́ dị ya mma.

Mgbe ndị ọzụzụ atụrụ bịara Betlehem ka ha hụ Jizọs

Ị̀ na-ahụ ka ndị na-azụ atụrụ na-abịa ịhụ Jizọs? Ha nọrịị n’ọhịa n’abalị na-elekọta atụrụ ha, ìhè wee nwuo gburugburu ha. Ọ bụ otu mmụọ ozi! Egwu tụrụ ndị ọzụzụ atụrụ ahụ nke ukwuu. Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ha: ‘Unu atụla egwu! Ana m ewetara unu ozi ọma. A mụwo Kraịst Onyenwe anyị taa n’ime Betlehem. Ọ ga-azọpụta ndị ya! Unu ga-ahụ ya ka a fụchiri ya ákwà nyiwe ya n’ụlọ anụ.’ Na mberede, ọtụtụ ndị mmụọ ozi bịara ma malite ito Chineke. Ya mere, n’egbughị oge, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ jere ịchọ Jizọs, ugbu a kwa, ha achọtawo ya.

Ị̀ ma ihe mere Jizọs ji bụrụ onye pụrụ iche? Ị̀ ma onye ọ bụ n’ezie? Cheta na anyị kọrọ ihe banyere Ọkpara Chineke n’akụkọ mbụ dị n’akwụkwọ a. Ọkpara nke a so Jehova rụọ ọrụ n’ike eluigwe na ala na ihe niile ọzọ. Nke a bụ onye Jizọs bụ!

N’ezie, Jehova si n’eluigwe were ndụ Ọkpara ya tinye n’afọ Meri. Ngwa ngwa, nwa ahụ malitere ito n’ime afọ ya dị ka ụmụ ndị ọzọ na-eto n’ime afọ nne ha. Ma nwa a bụ Ọkpara Chineke. N’ikpeazụ, a mụrụ Jizọs n’ụlọ anụ ebe a na Betlehem. Ị̀ hụrụ ugbu a ihe mere ndị mmụọ ozi ji nwee obi ụtọ ịkọrọ ndị mmadụ na a mụwo Jizọs?

Luk 2:1-20.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya