Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 89
  • Jizọs Emee Ka Ụlọ Nsọ Dị Ọcha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Emee Ka Ụlọ Nsọ Dị Ọcha
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jizọs Mere Ka Ụlọ Nsọ Dị Ọcha
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ịnụ Ọkụ n’Obi Maka Ofufe Jehova
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Jizọs Egosi na Ofufe Chineke Na-anụ Ya Ọkụ n’Obi
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ụmụ Anụmanụ
    Teta!—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 89
Mgbe Jizọs na-achụpụ ndị na-agbanwe ego n’ụlọ nsọ, kpuokwa tebụl ha ihu

AKỤKỌ NKE 89

Jizọs Emee Ka Ụlọ Nsọ Dị Ọcha

N’EZIE, iwe ji Jizọs ebe a, ọ́ bụghị ya? Ị̀ ma ihe mere ezigbo iwe ji ewe ya? Ọ bụ n’ihi na ndị ikom ndị a, bụ́ ndị nọ n’ụlọ nsọ Chineke dị na Jeruselem, bụ ndị anyaukwu. Ha chọrọ inweta ego buru ibu n’aka ndị bịara ife Chineke n’ebe a.

Ị̀ na-ahụ ụmụ ehi na atụrụ na nduru niile ahụ? Ndị ikom ndị a na-ere anụmanụ ndị a kpọmkwem n’ime ụlọ nsọ ebe a. Ị̀ ma ihe kpatara ya? Ọ bụ n’ihi na anụmanụ na nnụnụ dị ndị Izrel mkpa iji chụọrọ Chineke àjà.

Iwu Chineke sịrị na ọ bụrụ na onye Izrel emee ihe ọjọọ, ọ ga-eji anụmanụ chụọrọ Chineke àjà. E nwekwara oge ndị ọzọ ụmụ Izrel na-achụ àjà. Ma olee ebe onye Izrel ga-enweta nnụnụ na anụmanụ ndị ọ ga-eji chụọrọ Chineke àjà?

Ụfọdụ ụmụ Izrel nwere nnụnụ na anụmanụ. Ha pụrụ iji ihe ndị a chụọ àjà. Ma, ọtụtụ ụmụ Izrel enweghị nnụnụ ma ọ bụ anụmanụ ọ bụla. Ndị ọzọ bi ebe dị nnọọ anya site na Jeruselem nke na ha apụghị isi n’ụlọ ha kpụrụ anụmanụ ha bịa n’ụlọ nsọ ahụ. N’ihi ya, ha na-abịa ebe a azụrụ anụmanụ na nnụnụ ndị ha chọrọ. Ma ndị ikom ndị a na-ana nnukwu ego. Ha na-aghọgbu ndị mmadụ. E wezụga nke ahụ, ha ekwesịghị ịnọ n’ime ụlọ nsọ Chineke na-ere ihe.

Nke a bụ ihe were Jizọs iwe. N’ihi ya, o kpuru tebụl ego ha ihu, wee wụsasịa ego ha. O jikwa ụdọ mere ụtarị, wee chụpụsịa anụmanụ niile ahụ n’ụlọ nsọ ahụ. O nyere ndị na-ere nduru iwu, sị: ‘Wepụnụ ha n’ebe a! Kwụsịnụ ime ka ụlọ Nna m bụrụ ebe a na-akpa nnukwu ego.’

Ụfọdụ n’ime ụmụazụ Jizọs so ya nọrọ n’ebe a n’ụlọ nsọ a dị na Jeruselem. O juru ha anya ịhụ ihe Jizọs na-eme. Mgbe ahụ ka ha chetara ebe e kwuru n’ime Bible banyere Ọkpara Chineke, sị: ‘Ịhụnanya o nwere maka ụlọ Chineke ga na-ere dị ka ọkụ.’

Ka Jizọs nọ n’ebe a maka Ememe Ngabiga na Jeruselem, ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube. N’ikpeazụ, Jizọs hapụrụ Judia wee malite ịlaghachi Galili. Mgbe ọ na-ala, o si n’ógbè Sameria gafee. Ka anyị hụ ihe mere n’ebe ahụ.

Jọn 2:13-25; 4:3, 4.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya