Isi 7
Mmekọahụ—Olee Ndụmọdụ nke Dị Irè n’Ezie?
1-4. Olee ihe ndị na-eme ugbu a mere a ga-eji tụlee ndụmọdụ Bible banyere mmekọahụ? (Ilu 2:6-12)
ỌBỤRỤ na ị ga-ajụta echiche ọha mmadụ banyere “Gịnị na-eweta obi ụtọ?” ọtụtụ n’ime azịza ya ga-agụnye mmekọahụ. A ga-atụ anya nke ahụ, n’ihi na mmetụta na ọchịchọ mmekọahụ bụ akụkụ nke Chineke kenyere onye ọ bụla nwere ezi ahụ ike.
2 Nkwurịta okwu banyere mmekọahụ aghọwo nke a na-eme n’ezoghị ọnụ karịa otú e mere n’ọgbọ ndị gara aga. Ọzọ, omume mmekọahụ agbanwewo. Ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị ntorobịa na-amalite inwe mmekọahụ n’afọ ndụ dị nta, ọbụna mgbe ha ka banyere n’afọ iri na ụma. Ọtụtụ nde ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị, gụnyere ọtụtụ ndị laworo ezumike nká, na-ebikọ ọnụ ma na-enwe mmekọahụ n’alụghị di na nwunye. N’etiti ndị lụrụ di na nwunye, ọtụtụ anwalewo mmekọahụ n’ìgwè, mgbanwere nwunye ma ọ bụ “alụmdi na nwunye ghere oghe,” ebe di na nwunye na-ekwekọrịta isoro onye ha na-alụghị na-enwe mmekọahụ.
3 Okwu ndụmọdụ banyere ihe ndị a na-esite n’ebe dị iche iche. Ihe e lere anya dị ka ihe na-ewu ewu taa abụrụwo nke ọtụtụ ndị dọkịta, ndị ndụmọdụ alụmdi na nwunye na ndị ụkọchukwu gbara ume ya ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ kwadoo. Ụfọdụ ndị na-enweta echiche ha site n’akwụkwọ ma ọ bụ isiokwu magazin ndị na-akọ “ụzọ e si eme ihe.” A kpụziwo echiche ndị ọzọ site n’usoro ihe ọmụmụ mmekọahụ n’ụlọ akwụkwọ. Ma ndị ọzọ na-enweta echiche ndị nke ha site n’akwụkwọ ọgụgụ, ihe nkiri na ihe omume telivishọn ndị na-akọ maka mmekọahụ n’ezoghị ọnụ.
4 Dị ka ọtụtụ ndị maara, Bible na-atụlekwa isiokwu ahụ. Ọtụtụ ndị ugbu a na-agbara ụkpụrụ Bible ọsọ, na-eche na ndị a na-eke mmadụ agbụ gabiga ókè. Ma ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị? Ka ọ̀ pụrụ ịbụ na itinye okwu ndụmọdụ Bible n’ọrụ na-echebe mmadụ n’ezie pụọ n’oké obi mgbu ma na-eme ka o kwe mee inweta obi ụtọ ka ukwuu ná ndụ?
MMEKỌAHỤ TUPU ALỤMDI NA NWUNYE—GỊNỊ MERE A GAGHỊ EME YA?
5-7. N’ihi gịnị ka mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye jiworo rịa elu?
5 Ọchịchọ na ikike mmekọahụ na-ebilitekarị ma na-arị elu n’oge afọ iri na ụma. Ya mere n’akụkọ ihe mere eme nile, ọtụtụ ndị na-eto eto enwewo mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye. (Jenesis 34:1-4) Ma n’afọ ndị a mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye abụrụwo ihe a na-ahụ ebe nile n’ụzọ na-aba ụba. N’ebe ụfọdụ, ọ fọrọ nke nta ka onye ọ bụla na-eme ya. N’ihi gịnị?
6 Otu ihe mere e ji nwee ịrị elu ná mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye metụtara mkpọsa nke a na-enye mmekọahụ n’ihe nkiri na akwụkwọ ọgụgụ ndị na-ewu ewu. Ọtụtụ ndị na-eto eto nwere ọchịchọ ịmara ihe, ha ‘chọrọ ịmara ihe ọ dị ka ya.’ Nke a, n’aka nke ya, na-akpalite nrụgide ndị ọgbọ ma na-eme ka ndị ọzọ kwekọọ. Ka mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye na mmekọahụ n’alụghị di na nwunye ghọworo ihe gbasapụrụ ebe nile, ọtụtụ ndị ụkọchukwu na-ekwu ugbu a na ọ bụ ihe a na-anabata ọ bụrụhaala na ndị ahụ ‘hụrụ onwe ha n’anya.’ N’ihi ya ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị na-alụbeghị di na nwunye na-eche ajụjụ ahụ ihu nke bụ, ‘N’ihi gịnị ka a na-agaghị eji nwee mmekọahụ, karịsịa ọ bụrụ na anyị ji ihe e ji achịkwa ọmụmụ eme ihe?’
7 Onye na-ede akụkụ pụrụ iche banyere ahụ ike bụ́ Dr. Saul Kapel depụtara ihe ndị ọzọ na-akpata mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye, ma kwuo ihe ụfọdụ banyere mmetụta ya:
‘A na-eji mmekọahụ na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi dị ka ụzọ isi nupụ isi megide nne na nna. A na-eji ya na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi iji dọta mmasị, dị ka ụdị nke “arịrịọ maka enyemaka.” A na-eji ya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi dị ka ụzọ isi “gosi” ịbụ nwoke ma ọ bụ ịbụ nwanyị. A na-eji ya na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi dị ka nkwado mmekọrịta ọha na eze ná mgbalị efu ịbụ onye a na-anabata.
‘Mgbe e ji mmekọahụ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi otú a, ọ dịghị agwọtali nsogbu nke kpalitere ya. Dị ka o si adịkarị, nanị ihe ọ na-eme bụ izo ha.’
8. Gịnị bụ echiche Chineke banyere mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye?
8 N’agbanyeghị ihe kpatara mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye, n’agbanyeghị otú o si bụrụ ihe zuru ebe nile, n’agbanyeghị ndị ndụmọdụ na ndị ụkọchukwu ole kwadoro ya, Bible na-enye ndụmọdụ, sị:
“Nke a bụ ihe Chineke na-achọ, . . . ka unu ghara ịkwa iko; . . . ka onye ọ bụla ghara ịghọgbu na irigbu nwanna ya n’ihe a.”—1 Ndị Tesalọnaịka 4:3-6.
Ụfọdụ pụrụ iche na Chineke na-etinye ihe mgbochi na-enweghị isi n’ebe a. Ma echefula na mmekọahụ n’onwe ya bụ onyinye sitere n’aka Jehova Chineke; ọ bụ ya bụ Onye kere ụmụ mmadụ ma nye ha ikike ịmụ ụmụ. (Jenesis 1:28) Ezi uche ọ́ dịghị ya na Onye Malitere ikike mmekọahụ nke mmadụ kwesịrị inwe ike inye ndụmọdụ kasị mma banyere ya, ndụmọdụ nke pụrụ ichebe anyị n’ezie pụọ ná mwute?
MMETỤTA—HÀ NA-ATỌ ỤTỌ KA HA NA-EGBU MGBU?
9-12. Mmetụta dịgasị aṅaa ka mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye na-enwe?
9 N’ọnọdụ ziri ezi, ndọrọ na ọchịchọ mmekọahụ pụrụ inwe mmetụta ndị dị mma. Otu, n’ezie, bụ ụmụ. Ihe atụ mbụ e dekọrọ banyere mmekọahụ na-ekwu, sị: “Mmadụ ahụ [Adam] wee mara ahụ Iv, bụ́ nwunye ya; o wee tụrụ ime.” (Jenesis 4:1) N’ime ezinụlọ, ụmụ a mụtara pụrụ ịbụ ihe na-akpata ezi obi ụtọ. Ma, olee ma ọ bụrụ na ndị na-alụbeghị di na nwunye enwee mmekọahụ? Mmetụta ọ na-enwe na-abụkarịkwa otu ihe ahụ—afọ ime na ụmụ.
10 Ọtụtụ ndị na-ekere òkè ná mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye na-eche na nke a ekwesịghị ịbụ ihe ga-akpata oké nchegbu. Ha bu ọgwụ mgbochi ime ndị e nwere n’uche. N’ebe ụfọdụ ndị ka nọ n’afọ iri na ụma pụrụ inweta ndị a ma ndị mụrụ ha agaghị ama. Otú o sina dị, afọ ime nke ndị nọ n’afọ iri na ụma ka jupụtara ọbụna n’etiti ndị ntorobịa wara anya, ndị na-asị, “Ọ pụghị ime m.” Akụkọ ndị dị ka ndị a na-anwapụta ya:
“Ihe karịrị otu nwa ọhụrụ n’ime ise ọ bụla a mụrụ na New Zealand n’afọ gara aga bụ nke onye na-alụghị di mụrụ.”
“N’ime ndị inyom Britain atọ ọ bụla na-erubeghị 20 afọ na-aṅụ iyi alụmdi na nwunye ha, otu adịworị ime.”
“Otu n’ime ụmụ agbọghọ ise nọ n’afọ iri na ụma [na U.S.A.] ga-atụrụ ime tupu ọ gụsịa akwụkwọ sekọndrị.”
11 Mmetụta nke a na-egbu mgbu nke mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye ewetaworo ọtụtụ ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ nrụgide. Ụfọdụ na-achọ isikwopụ ime. Ma ndị na-enwe oké mmetụta na-enwe oké nchegbu n’echiche nke ibibi nwa nke ka na-etolite n’ime afọ nne ya. (Ọpụpụ 20:13) O metụtakwara mmetụta uche na akọ na uche nke onye bụ nwanyị. Ndị a siri ike nke ukwuu nke na ọtụtụ ndị nakwewooro isikwopụ afọ ime akwawo ụta nke ukwuu mgbe e mesịrị.—Ndị Rom 2:14, 15.
12 Afọ ime nke ndị nọ n’afọ iri na ụma na-ewetara nne na nwa ihe ize ndụ ka ukwuu karịa afọ ime nke ụmụ nwanyị toworo eto. A na-enwe ihe ize ndụ ka elu nke ụkọ ọbara, ọbara ọjọọ, oké ọgbụgba ọbara, ime ómúmé ruo ogologo oge na ịmụ nwa n’ike, tinyekwara ọnwụ mgbe a na-amụ nwa. Nwa nke a mụrụ nye nne nke na-erubeghị afọ 16 ji okpukpu abụọ yikarịa ka ọ ga-anwụ n’afọ nke mbụ ya. Ịmụ nwa mkpuke na-ewetakwara ndị mụrụ ya ọtụtụ nsogbu onwe onye, nke ọha na eze, na nke akụ̀ na ụba. Tụkwasịkwa, nchebe na ntolite nke nwata dabeere n’ókè dị ukwuu na gburugburu ebe obibi nke kwụ chịm. Ụmụaka a napụrụ nke a site n’ịkwata ha n’iko pụrụ ịbụ ndị e merụrụ ahụ ná ndụ nile. Mgbe ahụ ị̀ ga-asị na ngụkọta nke mmetụta inwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye na-enwe na-atọ ụtọ ka ọ̀ bụ na ọ na-egbu mgbu? Ndụmọdụ Bible nke bụ́, “Ka unu ghara ịkwa iko,” ọ̀ bụ ihe nchebe nke amamihe dị na ya?
13, 14. Olee ihe ndị ọzọ ị pụrụ ikwu mere a ga-eji jiri ndụmọdụ Bible n’ihe banyere mmekọahụ kpọrọ ihe?
13 Ileghara ndụmọdụ Bible anya ekpughewokwa ọtụtụ ndị nye mmetụta ọzọ na-egbu mgbu—ọrịa. Ndị inyom malitere isoro ọtụtụ ndị na-enwe mmekọahụ mgbe ha nọ n’afọ iri na ụma nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ka elu nke ukwuu nke ọrịa cancer ọnụ akpa nwa. E nwekwara ihe ize ndụ doro anya nke ọrịa mmekọahụ. Ụfọdụ na-eduhie onwe ha site n’iche na a pụrụ ịchọpụta ma gwọọ ọrịa gonorrhea na syphilis n’ụzọ dị mfe. Ma ndị ọkà nke Òtù Ahụ Ike Ụwa nke Mba Ndị Dị n’Otu na-akọ na ọrịa mmekọahụ ụfọdụ na-eguzogide ọgwụ ndị na-egbu nje ugbu a. Ndị dọkịta na-echegbukwa onwe ha banyere ịrị elu n’ọrịa herpes nke akụkụ ahụ e ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị. Mgbe mgbe ọ na-emerụ ụmụ ndị inyom bu ọrịa ahụ mụrụ ahụ. Ee, ọtụtụ ndị na-eto eto ji mwute na-amụta izi ezi nke ịdọ aka ná ntị Bible:
“Mmehie nile ọ bụla nke mmadụ na-eme dị n’elu ahụ; ma onye na-akwa iko na-emehie megide ahụ nke onwe ya.”—1 Ndị Kọrint 6:18.
14 Ụfọdụ na-eche na inwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye na-enye ahụmahụ nke pụrụ ime ka nhazigharị n’ụzọ mmekọahụ dị mfe karị n’alụmdi na nwunye. Ọ bụ omenala n’ala ụfọdụ ka ndị nna nwere ego kpọrọ ụmụ ha ndị nwoke gaa na nke ndị akwụna ka a ‘kụziere ha ihe.’ Ụfọdụ pụrụ iche na nke a na-enye aka. Ma n’ezie ọ dịghị, dị ka Onye Okike anyị na-ekwu, bụ́ onye hụworo ahụmahụ nile nke mmadụ. Ijigide ịdị ọcha tupu alụmdi na nwunye na-eguzobe ntọala ka mma nke ukwuu maka alụmdi na nwunye obi ụtọ. Ihe ọmụmụ ndị e mere na Canada gosiri na ndị nọ n’afọ iri na ụma malitere mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye mgbe ha dị ntakịrị yikarịrị ka ha ga-aghọgbu onye ha lụrụ ozugbo ha lụrụ di ma ọ bụ nwunye. Ma ndị na-ejigide ịdị ọcha tupu alụmdi na nwunye yikarịrị ka ha ga-adị ọcha n’alụmdi na nwunye; nsọpụrụ na ùgwù ha nwere maka alụmdi na nwunye tupu ụbọchị agbamakwụkwọ ahụ na-aga n’ihu mgbe ọ gasịrị.
OLEE BANYERE ỊKWA IKO DI MA Ọ BỤ NWUNYE?
15-18. Gịnị ka ihe àmà na-egosi banyere ndụmọdụ Bible n’ihe metụtara ịkwa iko di ma ọ bụ nwunye?
15 Ndụmọdụ onye mere otú masịrị ya banyere mmekọahụ taa edujewokwa n’ịkwa iko di ma ọ bụ nwunye karị. Akụkọ ndị si Europe na Ebe Ugwu America na-egosi na ihe dị ka ọkara nke ndị ikom lụrụ nwunye na-aghọgbu nwunye ha. Ọtụtụ ndị inyom karị ugbu a na-akwadokwa ma na-ekere òkè n’ịkwa iko di ma ọ bụ nwunye, na-enwe olileanya ọtụtụ mgbe na ọ ga-etinyekwu mmekọrịta ịhụnanya ná ndụ ha.
16 Bible na-enye ndụmọdụ doro anya na nke a: “Ka di kwụghachi nwunye ya ụgwọ [mmekọahụ] o ji ya: otú a kwa ka nwunye kwụghachikwa di ya ụgwọ o ji ya.” (1 Ndị Kọrint 7:3, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ị pụkwara ịgụ Ilu 5:15-20, nke, n’okwu ihe atụ, na-ekwu na ndị lụrụ di na nwunye kwesịrị inweta ihe ụtọ mmekọahụ n’ime alụmdi na nwunye, ọ bụghị site n’onye na-anọghị n’ime ya. Ahụmahụ ndị e nwere eri ọtụtụ narị afọ egosipụtawo na ndụmọdụ a bụ ihe nchebe. Ọ na-echebe pụọ n’ọrịa na ịtụ ime mkpuke. Ọ na-echebekwa pụọ ná mwute na iru újú nke ịkwa iko di ma ọ bụ nwunye na-akpatakarị.
17 Mgbe nwoke na nwanyị lụrụ di na nwunye, ha ewerewo onwe ha nyefee ibe ha. Olee ihe na-eme mgbe otu n’ime ha mebiri ntụkwasị obi ahụ site n’ịghọ aghụghọ? Otu ihe ọmụmụ nke mmekọahụ n’abụghị n’ime alụmdi na nwunye na-akọ, sị:
“Ikpe ọmụma dị ukwuu dị n’ihi mmadụ ime ihe megidere okwu ya. Ị kwa iko di ma ọ bụ nwunye bụ mpụ nke mmadụ na-emeso onwe ya, n’ihi na ị maara kpọmkwem onye ị na-arafu ma ọ bụ na-emerụ ahụ.”
Nke a ghọrọ ihe doro anya karị mgbe ọtụtụ di na nwunye gbasosịrị ndụmọdụ banyere “alụmdi na nwunye ghere oghe,” bụ́ nke e lere anya na a ga-enwe nkwekọrịta banyere isoro ndị ọzọ nwee mmekọahụ na ya. Ka oge na-aga ndị nkwado bụ isi nke “alụmdi na nwunye ghere oghe” aghaghị ime mgbanwe. Ihe mwute ndị ọ na-arụpụta rụgidere ha ikwubi na “ijide ikwesị ntụkwasị obi ná mmekọahụ n’aka ka bụ àgwà dị oké mkpa nke ọtụtụ alụmdi na nwunye.”
18 Ịkwa iko di ma ọ bụ nwunye yiri ka ọ na-amụpụta ekworo na anọghị ná ntụkwasị obi nke onwe onye. Chineke ji amamihe dụọ ọdụ banyere mmerụ ahụ ihe ndị a na-eweta. (Ilu 14:30; 27:4) N’ihi ya, ọ bụ ezie na ụfọdụ na-eche na ha maara ihe karị, na ịkwa iko di ma ọ bụ nwunye bụkwa ihe ziri ezi, ihe ndị mere eme na-egosi na ọ dịghị otú ahụ. Ọkà mmụta akparamàgwà bụ́ Dr. Milton Matz kwuru n’eziokwu, sị:
“Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị na-abụ ndị mmekọahụ n’abụghị n’ime alụmdi na nwunye merụsịrị ahụ mgbe o weere ọnọdụ ná ndụ anyị, ma ànyị so mee ya ma ọ̀ bụ na anyị bụ ndị e megbutere. . . .
“Ahụmahụ m nwere na ya abụrụwo na mmekọahụ n’abụghị n’ime alụmdi na nwunye na-egbu mgbu nke ukwuu nye onye ọ bụla o metụtara. Dị ka ọgwụ na-enye obi ụtọ, ọ dịghị arụ ọrụ.”
MMEKỌAHỤ N’IME ALỤMDI NA NWUNYE
19-22. Gịnị ka Bible na-ekwu banyere mmekọahụ n’ime alụmdi na nwunye?
19 Banyere mmekọahụ, Bible adịghị adụ anyị ọdụ nanị metụta ihe ndị a ga-ezere. Ọ na-adụkwa anyị ọdụ metụta ihe anyị ga-eme n’ụzọ dị mma nke ga-etinye ihe ná ndụ nke na-enye ụgwọ ọrụ.
20 Kama igosi mmekọahụ dị ka nanị ihe omume nke usoro ịdị ndụ, Akwụkwọ Nsọ na-egosi n’ụzọ ziri ezi na ọ pụrụ ịbụ isi iyi nke ihe ụtọ nye di na nwunye. Bible na-ekwu banyere ịdị ‘na-awagharị’ na ‘inwe afọ ojuju’ ná mmekọahụ nke dị n’alụmdi na nwunye. (Ilu 5:19) Ikwu okwu hoo haa otú a na-enye aka iwezụga àgwà ime nsọ nsọ ma ọ bụ ihere banyere mmekọrịta ịhụnanya ziri ezi n’etiti di na nwunye.
21 Onye Okike ahụ na-adụ ndị bụ di ọdụ, sị: “Hụnụ nwunye unu na-anya, unu enwekwala obi ilu n’ebe ha nọ.” (Ndị Kọlọsi 3:19) Ka mmekọahụ wee bụrụ ihe na-enye ụgwọ ọrụ n’ezie, di na nwunye ahụ agaghị enwe ihe mgbochi ọ bụla nke obi ilu ma ọ bụ iwe n’etiti ha. Mgbe ahụ a pụrụ inweta ọṅụ nke ihe mmekọrịta alụmdi na nwunye bụ n’ezie, ụzọ isi gosipụta ịhụnanya dị omimi, nraranye na ịdị nro.
22 Ọzọkwa, Chineke na-agba ndị bụ di ume isoro nwunye ha bikọọ “n’ụzọ ihe ọmụma.” (1 Pita 3:7) Iji kwekọọ, onye bụ di kwesịrị iburu n’obi mmetụta uche na usoro ahụ nke nwunye ya. Ọ bụrụ na, kama iji obi ịta mmiri na-ana ihe mgbe nile, o ji iche echiche na-aghọta mmetụta na mkpa ndị nwunye ya nwere, o yiri ka nwunye ya ọ ga-aghọta mkpa ndị nke ya karị. Nke a ga-arụpụta afọ ojuju nye ha abụọ.
23-26. Olee otú itinye ndụmọdụ a n’ọrụ si abara mmadụ uru?
23 Mkpesa a na-anụkarị bụ na ndị nwunye ụfọdụ jụrụ oyi ma ọ bụ ghara ịdị na-egosighachi mmetụta. Ihe pụrụ iso kpata nke a bụ di yiri ka ọ nọ ebe dị anya, na-anọ duu ma ọ bụ na-amachi ihu ọ gwụla ma ọ chọrọ mmekọahụ. Ma í kweghị na egosighachighị mmetụta nke nwunye yiri ka ọ gaghị adị ma ọ bụrụ na di na-ekpo ọkụ mgbe nile ma na-anọ nwunye ya nso? Ọ bụ ka o si adịkarị na nwunye ga-anabata di nke na-ege ntị n’okwu ndụmọdụ ahụ nke bụ iyikwasị onwe ya “obi ebere, obi ọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi.”—Ndị Kọlọsi 3:12, 13.
24 Bible na-asị: “Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) A pụrụ iji nke ahụ mee ihe n’ọtụtụ ụzọ, dịkwa ka ụkpụrụ ọ bụwo ihe enyemaka n’ezie n’obi ụtọ nke mmekọahụ. Ò si aṅaa dị otú ahụ? Nwunye ịnụ ụtọ mmekọahụ dabeere n’ụzọ dị ukwuu n’obi na n’uche. N’oge ndị a, e mesiwo okwu ike nke ukwuu banyere ụmụ nwanyị itinye uche ná mkpali ahụ na obi ụtọ ndị nke onwe ha, ma afọ ojuju ka na-akwa ọtụtụ. Otú ọ dị, Dr. Marie Robinson, onye nyochara okwu ahụ, mere ka ọ pụta ìhè na mgbe nwunye zụlitere nkwanye ùgwù maka di ya ma na-ele mmekọahụ anya dị ka ụzọ ‘inye ihe’ kama ịnara ihe, o yiri ka ọ ga-enweta afọ ojuju n’onwe ya karị. Onye dọkịta a kwuru, sị:
“Nke nta nke nta [nwunye ahụ] na-ahụ onwe ya ka ọ na-ekwe ka ịdị nro na nchegbu ọhụrụ ya maka di ya ghọọ akụkụ nke nzube nke mmakụ nke mmekọahụ ya. Ọ na-ahụ ma na-enwe obi ụtọ nke mmesapụ ahụ mmekọahụ ya na-ewetara di ya, usoro a na-agakwa gburugburu, obi ụtọ di ya nke hiwanyere nne na-enyekwu ya obi ụtọ.”
Ya mere ndụmọdụ Bible maka ịdị na-enye ihe ma na-enwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ na-eme ka e nwee obi ụtọ, ọbụna n’akụkụ a chiri anya nke ndụ.—Ndị Filipaị 2:4.
25 Ige ntị na ndụmọdụ a na-abara anyị uru n’ụzọ ọzọkwa. Echiche anyị nwere banyere mmekọahụ, nke gụnyere ikike nke ibufe ndụ, na-emetụta mmekọrịta anyị na Chineke, bụ́ Onye Na-enye Ndụ. Ya mere, izere ịkwa iko bụ ihe amamihe, ọ bụghị nanị n’ihi na ọ na-abara anyị uru n’ụzọ anụ ahụ, n’echiche na ná mmetụta uche, kamakwa n’ihi na ha bụ ‘mmehie megide Chineke.’ (Jenesis 39:9) Banyekwara ikwesị ntụkwasị obi nye di ma ọ bụ nwunye, Ndị Hibru 13:4 na-asị:
“Ka ịlụ di na nwunye bụrụ ihe a na-asọpụrụ n’etiti unu nile, ka ihe ndina unu bụrụkwa ihe a dịghị emerụ emerụ: n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko ikpe, ha na ndị na-akwa iko, bụ́ ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di.”
26 Mgbe anyị na-atụle otú mmekọahụ si emetụta obi ụtọ mmadụ, ọ dị anyị mkpa ile anya gabiga n’oge dị ugbu a. N’iburu ọdịmma anyị na-adịgide adịgide n’uche, Bible na-enyere anyị aka ịtụle otú ihe anyị na-eme ga-esi metụta ma onwe anyị ma ndị ọzọ echi, n’afọ ọzọ na ná ndụ anyị nile.
Igbe dị na peeji nke 70]
“Ma eleghị anya, ‘nnwere onwe mmekọahụ’ ọhụrụ ‘na-anapụta anapụta,’ . . . Ma ihe m nọgidere na-anụ, n’ebe nile, bụ ihe dị iche. Ihe m nọgidere na-anụ bụ na inwere onwe n’inwe mmekọahụ na-eme ọtụtụ mmadụ ihe n’ezie. Inwere onwe n’inwe mmekọahụ na-emerụ ahụ.”—Onye na-ede akụkụ pụrụ iche bụ́ G. A. Geyer, “The Oregonian.”
Igbe dị na peeji nke 71]
“Ekwesịghị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye yiri ka ọ na-akpata ikpe ọmụma, ihe mgbu, na enweghị ntụkwasị obi, ebe ikwesị ntụkwasị obi na-akwalite ịnọ ná ntụkwasị obi na ọṅụ miri emi.”—Dr. C. B. Broderick, onye ntụzi nke otu ụlọ ọrụ na-ahụ maka alụmdi na nwunye na ezinụlọ.
[Foto dị na peeji nke 69]
Ndụmọdụ Bible na-enyere ndị mmadụ aka izere mmetụta ndị dị mwute nke omume rụrụ arụ—ime mkpuke na ọrịa mmekọahụ