Akụkụ nke 6
Ihe Mere Chineke Jiworo Kwere ka Ahụhụ Dịrị
1, 2. Olee otú nne na nna mbụ anyị si bibie ezi mmalite nke Chineke nyere ha?
GỊNỊ gahiere? Gịnị weere ọnọdụ nke bibiri mmalite ahụ mara mma nke Chineke nyere nne na nna mbụ anyị na Paradaịs nke Iden. N’ihi gịnị ka e ji nwee ajọ omume na ahụhụ n’ebe nile eri ọtụtụ puku afọ, kama inwe udo na ịdị n’otu nke Paradaịs?
2 Ihe kpatara ya bụ na Adam na Iv ji inwe onwe ha ime mkpebi mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ha atụleghị eziokwu ahụ nke bụ na e keghị ha ime nke ọma n’anọghị n’okpuru Chineke na iwu ya. Ha kpebiri inwere onwe ha pụọ n’okpuru Chineke, na-eche na nke a ga-eme ka ndụ ha kara mma. Ya mere ha gabigara ebe njedebe ndị Chineke setịpụrụ maka inwe onwe ime mkpebi.—Jenesis, isi 3.
Ihe Iseokwu Banyere Ịbụ Ọkaaka Eluigwe na Ala
3-5. N’ihi gịnị ka Chineke na-ejighị bibie Adam na Iv ma malite n’isi?
3 N’ihi gịnị ka Chineke na-ejighị bibie Adam na Iv ma jiri mmadụ abụọ ọzọ malite? N’ihi na ọkaaka eluigwe na ala ya, ya bụ, iru eru ya nke a na-apụghị ịhapụrụ onye ọzọ, ịchị achị, abụrụwo nke a mara aka.
4 Ajụjụ bụ: Ònye ka o ruuru ịchị achị, ọ̀ bụkwa ọchịchị nke ònye ziri ezi? Ya ịbụ onye pụrụ ime ihe nile na Onye Okike nke ihe nile e kere eke nyere Chineke iru eru ịchị ha. Ebe ọ bụ na o nwezuru amamihe n’ihe nile, ọchịchị ya bụ nke kasị mma nye ihe nile e kere eke. Ma a mawo ọchịchị Chineke aka ugbu a. Ọzọ, è nwere ihe ọ bụla na-adịghị agazi agazi n’ihe o kere eke—bụ́ mmadụ? Mgbe e mesịrị, anyị ga-atụle otú o si metụta okwu banyere mmadụ iguzosi ike n’ezi ihe.
5 N’ihi mmadụ inwere onwe ya pụọ n’okpuru Chineke, ajụjụ ọzọ na-ebilite: Ụmụ mmadụ hà pụrụ ime nke ọma karị ma ọ bụrụ na Chineke achịghị ha? N’ezie Onye Okike ahụ maara azịza ya, ma ụzọ kasị mma isi mee ka ụmụ mmadụ chọpụta bụ inye ha nnwere onwe a na-akparaghị ókè nke ha chọrọ. Ha họọrọ ụzọ nke ahụ n’onwe ha, ya mere Chineke hapụru ha.
6, 7. N’ihi gịnị ka Chineke jiworo nye ụmụ mmadụ nnwere onwe a na-akparaghị ókè ruo ogologo oge?
6 Site n’inye ụmụ mmadụ oge zuru ezu iji jiri nnwere onwe a na-akparaghị ókè mee nnwale, Chineke ga-egosipụta ruo mgbe nile, ma ọ̀ kara mmadụ mma ịnọ n’okpuru iwu Chineke ka ọ̀ bụ n’okpuru nke onwe ha. Oge ahụ e nyere aghaghịkwa izu ezu iji nye ụmụ mmadụ ohere irute n’ihe ha lere anya dị ka ókè kasị elu nke ihe ha rụpụtara n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, mmepụta ihe, sayensị, na nkà mmụta ọgwụ na ahụ ike.
7 Ya mere, Chineke enyewo mmadụ ohere zuru ezu ruo n’oge anyị iji gosi n’ụzọ a na-apụghị ịrụ ụka ma ọchịchị mmadụ n’adabereghị n’ebe ọ nọ ọ̀ ga-enwe ihe ịga nke ọma. Otú a, mmadụ enwewo ike ime nhọrọ n’etiti obi ọma na obi ịta mmiri, n’etiti ịhụnanya na ịkpọasị, n’etiti ezi omume na ajọ omume. Ma ihe ndị si ná nhọrọ o mere pụta echewokwa ya ihu: ịdị mma na udo ma ọ bụ mmebi iwu na ahụhụ.
Nnupụisi nke Ndị Mmụọ E Kere Eke
8, 9. (a) Olee otú nnupụisi si tiwapụ n’ógbè ndị bụ mmụọ? (b) Òle ndị ma e wepụ Adam na Iv ka Setan mere ka ha nupụ isi?
8 E nwere ihe ọzọ a ga-atụle. Ọ bụghị nanị ndị nne na nna mbụ ahụ nupụrụ isi megide iwu Chineke. Ma olee ndị ọzọ dị adị na mgbe ahụ? Ọ bụ ndị mmụọ e kere eke. Tupu Chineke e kee ụmụ mmadụ, o kere ụdị ka elu nke ndụ, bụ́ ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị mmụọ ozi, ibi n’eluigwe. Ha bụkwa ndị e kere eke nweere onwe ha ime mkpebi, nweekwa mkpa nke ido onwe ha n’okpuru ịchịisi Chineke.—Job 38:7; Abụ Ọma 104:4; Mkpughe 5:11.
9 Bible na-egosi na nnupụisi bu ụzọ malite n’ógbè ndị bụ mmụọ. Otu mmụọ e kere eke chọrọ nnwere onwe a na-akparaghị ókè. Ọbụna na ọ chọrọ ka ụmụ mmadụ fee ya ofufe. (Matiu 4:8, 9) Mmụọ nke a na-enupụ isi ghọrọ ihe kpaliri Adam na Iv inupụ isi, na-eme nzọrọ na-abụghị eziokwu na Chineke na-anapụ ha ihe dị mma. (Jenesis 3:1-5) Ya mere a kpọrọ ya Ekwensu (Onye Nkwutọ) na Setan (Onye Na-ebu Iro). Mgbe e mesịrị, ọ kpaliri mmụọ ndị ọzọ e kere eke inupụ isi. Ha ghọrọ ndị a maara dị ka ndị mmụọ ọjọọ.—Deuterọnọmi 32:17; Mkpughe 12:9; 16:14.
10. Gịnị si ná nnupụisi nke ụmụ mmadụ na ndị mmụọ e kere eke pụta?
10 Site n’inupụ isi megide Chineke, ụmụ mmadụ nyefere onwe ha ná mmetụta nke Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. Ọ bụ ya mere Bible ji kpọọ Setan “chi nke oge a,” onye “mere ka anya nke uche nke ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì.” N’ihi nke a, Okwu Chineke na-asị na “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” Jisọs n’onwe ya kpọrọ Setan “onye isi ụwa nke a.”—2 Ndị Kọrint 4:4; 1 Jọn 5:19; Jọn 12:31.
Ihe Iseokwu Abụọ
11. Banyere ihe iseokwu ọzọ dị aṅaa ka Setan mara Chineke aka?
11 Setan welitere ihe iseokwu ọzọ nke mara Chineke aka. Dị ka a pụrụ isi ghọta ya, ọ sịrị na Chineke hiere ụzọ n’ụzọ O si kee ụmụ mmadụ, na ọ dịghịkwa onye ga-achọ ime ihe ziri ezi ma ọ nọrọ n’okpuru ihe nrụgide. N’ezie ọ sịrị na ha ga-akọcha Chineke ma ha nọrọ n’ule. (Job 2:1-5) N’ụzọ dị otú a, Setan welitere ihe ịrụ ụka banyere iguzosi ike n’ezi ihe nke ụmụ mmadụ e kere eke.
12-14. Olee otú oge ga-esi kpughee ihe bụ eziokwu banyere ihe iseokwu abụọ ndị ahụ Setan welitere?
12 Ya mere, Chineke ekwewo ka e nwee oge zuru ezu ka ihe nile e kere eke nwere ọgụgụ isi wee hụ otú a ga-esi dozie ihe iseokwu nke a nakwa ihe iseokwu nke ọkaaka Chineke. (Tụlee Ọpụpụ 9:16.) Ihe ga-emesị mee n’akụkọ ihe mere eme nke ụmụ mmadụ ga-ekpughe ihe bụ eziokwu banyere ihe iseokwu abụọ ndị a.
13 Nke mbụ, gịnị ka oge ga-ekpughe banyere ihe iseokwu nke ọkaaka eluigwe na ala, bụ́ iru eru nke Chineke ịchị achị? Ụmụ mmadụ hà pụrụ ịchị onwe ha nke ọma karịa Chineke? Ọ̀ dị usoro ihe ọ bụla nke ọchịchị mmadụ n’adabereghị n’ebe Chineke nọ, nke ga-eweta ụwa obi ụtọ nke agha, imempụ, na ikpe na-ezighị ezi na-agaghị adị na ya? Ọ̀ dị nke ọ bụla ga-ewepụ ịda ogbenye ma mee ka mmadụ nile nwee ọganihu? Ọ̀ dị nke ọ bụla ga-emeri ọrịa, nká, na ọnwụ? A kwadebere ọchịchị Chineke ime ihe ndị ahụ nile.—Jenesis 1:26-31.
14 Banyere ihe iseokwu nke abụọ, gịnị ka oge ga-ekpughe banyere ihe bụ uru ụmụ mmadụ e ekere eke bara? Ọ̀ bụ ihie ụzọ n’akụkụ nke Chineke ikeworị ụmụ mmadụ otú o si kee ha? Ọ̀ dị onye o bụla n’ime ha nke ga-eme ihe ziri ezi n’okpuru ule? Ọ̀ dị ndị ọ bụla ga-egosipụta na ha chọrọ ọchịchị Chineke kama ọchịchị mmadụ nke na-adabereghị na Chineke?
[Foto dị na peeji nke 13]
Chineke enyewo oge ka ụmụ mmadụ wee rute n’ókè kasị elu nke ihe ha rụpụtara
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ụgbọ mbara igwe: Dabere na foto NASA