Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lv p. 207-p. 209 para. 3
  • Otú Anyị Ga-esi Na-akpaso Onye A Chụpụrụ n’Ọgbakọ Àgwà

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Anyị Ga-esi Na-akpaso Onye A Chụpụrụ n’Ọgbakọ Àgwà
  • “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gosipụta Iguzosi Ike n’Ihe Ndị Kraịst Mgbe Ọ Dị Onye Ikwu A Chụpụrụ Achụpụ
    Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Mgbe Onye Anyị Hụrụ n’Anya Hapụrụ Jehova
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Ṅomie Obi Ebere Chineke Taa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
“Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
lv p. 207-p. 209 para. 3

ISIOKWU NDỊ ỌZỌ

Otú Anyị Ga-esi Na-akpaso Onye A Chụpụrụ n’Ọgbakọ Àgwà

Ọ na-ewute anyị nke ukwuu ma a chụpụ onye ikwu anyị ma ọ bụ enyi anyị n’ọgbakọ n’ihi na o mere mmehie ma jụ ichegharị. Otú anyị si eme omume n’ihe Baịbụl kwuru n’okwu a ga-egosi otú anyị hụruru Chineke n’anya, gosikwa otú anyị jiruru mmekọrịta anyị na ya kpọrọ ihe.a Ka anyị leba anya n’ajụjụ ụfọdụ a na-ajụkarị n’okwu a.

Olee otú anyị ga-esi na-akpaso onye a chụpụrụ n’ọgbakọ àgwà? Baịbụl sịrị: “Ka unu na onye ọ bụla a na-akpọ nwanna bụ́ onye na-akwa iko ma ọ bụ onye anyaukwu ma ọ bụ onye na-ekpere arụsị ma ọ bụ onye na-ekwujọ mmadụ ma ọ bụ onye aṅụrụma ma ọ bụ onye na-apụnara mmadụ ihe kwụsị ịdị na-akpakọ, ka unu na onye dị otú a ghara ọbụna irikọ ihe.” (1 Ndị Kọrịnt 5:11) Baịbụl kwukwara banyere onye ọ bụla nke ‘na-adịghị anọgide n’ozizi Kraịst,’ sị: “Unu anabatala ya n’ebe obibi unu, unu ekelekwala ya. N’ihi na onye kelere ya ekerewo òkè n’ajọ ọrụ ya.” (2 Jọn 9-11) Anyị na ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ anaghị ekwurịta ihe banyere ofufe anyị, anyị na ha anaghịkwa emekọ ihe. Ụlọ Nche December 15, 1981, peeji nke 25, kwuru, sị: “‘Ekele’ nkịtị pụrụ ịbụ nzọụkwụ mbụ nke pụrụ iduba ná nkwurịta okwu, na eleghị anya, ọbụna n’ịbụ enyi. Ị̀ ga-achọ ịzọpụ nzọụkwụ mbụ dị otú a n’ebe onye a chụpụrụ achụpụ nọ?”

Ànyị kwesịrị n’ezie izere ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ kpamkpam? Ee, n’ihi ọtụtụ ihe. Nke mbụ bụ na ọ na-egosi na anyị na-erubere Chineke na Okwu ya isi. Anyị anaghị erubere Jehova isi naanị mgbe ọ dịịrị anyị mfe, kama anyị na-erubekwara ya isi mgbe o siiri anyị ike ime otú ahụ. Ịhụnanya anyị hụrụ Chineke na-eme ka anyị na-erube isi n’iwu ya niile n’ihi na anyị ghọtara na ọ na-eme ihe ziri ezi, nweekwa ịhụnanya. Anyị ghọtakwara na iwu ya na-abara anyị ezigbo uru. (Aịzaya 48:17; 1 Jọn 5:3) Ihe nke abụọ bụ na, ọ bụrụ na anyị na onye mere mmehie ma jụ ichegharị anaghị emekọ ihe, ọ ga-eme ka a ghara imerụ ofufe anyị, omume anyị, na nke ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ, meekwa ka ọgbakọ nwee aha ọma. (1 Ndị Kọrịnt 5:6, 7) Ihe nke atọ bụ na, ọ bụrụ na anyị anọsie ike n’ụkpụrụ Baịbụl, o nwere ike ịbara onye ahụ a chụpụrụ n’ọgbakọ uru. Ọ bụrụ na anyị akwado ihe òtù ikpe kpere onye ahụ ikpe kpebiri, anyị nwere ike ime ka onye ahụ mere ihe ọjọọ chegharịa, n’agbanyeghị na, ọ nabatabeghị mgbalị ndị okenye mere inyere ya aka. Ọ bụrụ na onye ahụ na ndị ọ hụrụ n’anya anaghị emekọkwa ihe, o nwere ike ime ka ‘anya doo ya,’ ya aghọta otú ihe ahụ o mere jọruru ná njọ, meekwa ihe o kwesịrị ime ka ya na Jehova dịghachi ná mma.—Luk 15:17.

Ọ́ bụrụkwanụ na a chụpụrụ onye ikwu anyị? Ya bụrụ otú ahụ, ezigbo mmekọrịta a na-enwe n’ezinụlọ nwere ike ime ka o siere anyị ike n’ezie irube isi n’iwu Chineke. Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso onye ikwu anyị a chụpụrụ n’ọgbakọ ihe? N’akwụkwọ a, anyị enweghị ike ilebacha anya n’ọnọdụ niile e nwere ike inwe, ma ka anyị leba anya n’ọnọdụ abụọ dị mkpa.

Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịbụ na anyị na onye ezinụlọ anyị a chụpụrụ n’ọgbakọ ka bi n’otu ụlọ. Ebe ọ bụ na nchụpụ a chụpụrụ ya apụtaghị na a chụpụla ya n’ezinụlọ anyị, anyị na ya ka nwere ike ịna-eme ihe ndị a na-eme n’ezinụlọ kwa ụbọchị. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ahụ o mere gosiri na o kpebiela na ya achọghịzi iso ndị ezinụlọ ya kwere ekwe na-efe Chineke. N’ihi ya, ndị ezinụlọ ya na-erubere Chineke isi agaghịzi ekwe ka o soro ha mee ihe ọ bụla metụtara ofufe Chineke. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye ahụ a chụpụrụ n’ọgbakọ nọ n’ụlọ, ọ gaghị ekwu okwu mgbe ndị ezinụlọ ya na-amụ Baịbụl. Otú ọ dị, ọ bụrụ na onye ahụ ka bụ nwatakịrị, ọ ka bụ ọrụ dịịrị ndị mụrụ ya ịkụziri ya ihe na ịdọ ya aka ná ntị. N’ihi ya, ndị nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya nwere ike ịmụrụ nwatakịrị ahụ Baịbụl.b—Ilu 6:20-22; 29:17.

Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịbụ na anyị na onye ezinụlọ anyị a chụpụrụ n’ọgbakọ ebighị n’otu ụlọ. Ọ bụ ezie na e nwere ike inwe mkpa ezinụlọ ndị ga-eme ka anyị na ya nọkọọ mgbe ụfọdụ, anyị ekwesịghị ịna-enwe nnọkọ dị otú ahụ mgbe niile. Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị ikwu onye a chụpụrụ n’ọgbakọ, ekwesịghị ịchọwa ihe ha ga-ekogide aka ga-eme ka ha na onye ahụ na-emekọ ihe ma ọ bụrụ na ha na ya ebighị n’otu ụlọ. Kama nke ahụ, irubere Jehova na nzukọ ya isi ga-eme ka ha kwado ihe a Akwụkwọ Nsọ kwuru ka a na-achụpụ mmadụ n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na ha eguzosie ike n’ebe Jehova nọ, ọ ga-abara onye ahụ mere ihe ọjọọ uru. O nwekwara ike inyere ya aka irite uru n’aka ná ntị ahụ a dọrọ ya.c—Ndị Hibru 12:11.

a Ụkpụrụ Baịbụl ndị metụtara ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ gbasakwara ndị kewapụrụ onwe ha n’ọgbakọ.

b Ị chọọ ịmatakwu otú anyị ga-esi na-emeso ụmụaka a chụpụrụ n’ọgbakọ bụ́ ndị ha na ndị mụrụ ha bi, gụọ Ụlọ Nche October 1, 2001, peeji nke 16-17, na nke November 15, 1988, peeji nke 20.

c Ị chọọ ịmatakwu otú anyị ga-esi na-emeso ndị ikwu anyị a chụpụrụ n’ọgbakọ, gụọ ndụmọdụ si n’Akwụkwọ Nsọ e dere n’Ụlọ Nche April 15, 1988, peeji nke 21-26, na nke December 15, 1981, peeji nke 26-31.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya