ISIOKWU NDỊ ỌZỌ
Idozi Esemokwu n’Okwu Ego
Pọl onyeozi kwuru banyere ụmụnna ndị kpọpụrụ ibe ha n’ụlọ ikpe ná 1 Ndị Kọrịnt 6:1-8. O wutere ya na ụfọdụ Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt ‘na-akpọ ụmụnna ha aga n’ụlọikpe n’ihu ndị ajọ omume.’ (Amaokwu nke 1) Pọl kwuru ezigbo ihe mere Ndị Kraịst na-ekwesịghị iji kpọpụ ibe ha n’ụlọikpe ndị ụwa kama dozie esemokwu ahụ n’ọgbakọ. Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ mere o ji nye ndụmọdụ ahụ si n’ike mmụọ nsọ. Anyị ga-elebakwa anya n’ọnọdụ ụfọdụ ndị ndụmọdụ ahụ na-agbasachaghị.
Ọ bụrụ na anyị na Onye Kraịst ibe anyị esee okwu n’ihi ego, ihe mbụ anyị ga-agbalị ime bụ iji ntụziaka Jehova nyere dozie ya, ọ bụghị ime ihe anyị chere. (Ilu 14:12) Dị ka Jizọs kwuru, ọ kacha mma idozi esemokwu ngwa ngwa tupu okwu arịwa ibe ya elu. (Matiu 5:23-26) Ma, ọ dị mwute na ụfọdụ Ndị Kraịst na-esegide okwu, buru ya gawa ụlọikpe ndị ụwa. Pọl kwuru, sị: “Ọ pụtara na e meriwo unu ebe ọ bụ na unu na-akpụpụ ibe unu n’ụlọikpe.” N’ihi gịnị? Otu n’ime ihe kpatara ya bụ na o nwere ike iwetara ọgbakọ na Chineke anyị na-efe aha ọjọọ. Ya mere, anyị kwesịrị icheta na Pọl jụrụ, sị: “Gịnị mere unu ekweghị ka e rigbuo unu?”—Amaokwu nke 7.
Pọl kwukwara na Chineke nyere ọgbakọ ntụziaka dị mma a ga-eji na-edozi ọtụtụ esemokwu. Eziokwu Akwụkwọ Nsọ ndị okenye maara mere ka ha bụrụ ndị maara ihe. Pọl kwukwara na ndị okenye ‘nwere ike ikpeziri nwanna na nwanna n’okwu ikpe metụtara ndụ a.’ (Amaokwu nke 3-5) Jizọs kwuru ụzọ atọ e kwesịrị isi edozi esemokwu ndị metụtara mmehie dị oké njọ, dị ka nkwutọ na igwu wayo: nke mbụ bụ mmadụ abụọ ahụ ịgbalị idozi ya naanị ha; nke abụọ bụ ịkpọrọ otu onye akaebe ma ọ bụ abụọ, ma ọ bụrụ na ha edozilighị ya n’onwe ha; nke atọ abụrụ ịkọrọ ya ndị okenye ọgbakọ ma ọ bụrụ na ụzọ nke abụọ ahụ adabaghị.—Matiu 18:15-17.
N’ezie, ndị okenye ọgbakọ abụghị ndị ọkàiwu ma ọ bụ ndị ọchụ nta ego. Ọrụ ha abụghịkwa inye ndụmọdụ ka à ga-asị na ha bụ ndị ọkàiwu na ndị ọchụ nta ego. Ha anaghị enye iwu otú a ga-esi edozi esemokwu ego n’etiti nwanna na nwanna. Kama nke ahụ, ha na-agbalị inyere ndị ahụ na-ese okwu aka ime ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru ma kpezie. Ọ bụrụ na okwu ahụ siri ike, ndị okenye nwere ike ịkọrọ ya onye nlekọta sekit ma ọ bụ alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova. Ma e nwere ọnọdụ ndị ndụmọdụ ahụ Pọl nyere na-agbasachaghị. Olee ụfọdụ n’ime ha?
Mgbe ụfọdụ, ịgba mmadụ akwụkwọ nwere ike ịbụ ime ihe iwu kwuru iji mee ka udo chịa n’ebughị ihe ọjọọ n’obi. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ịgba mmadụ akwụkwọ bụ naanị otú mmadụ ga-esi enweta ikike ịgba alụkwaghịm, ikike ịkpọrọ nwa, inweta ego e kwesịrị ịkwụ di ma ọ bụ nwunye a gbara alụkwaghịm, inweta ego ịnshọransị, ịbụ onye a gụnyere ná ndị a ga-akwụ ụgwọ ma ụlọ ọrụ daa, na inweta ihe e kere n’ékpé. O nwerekwa ike ịdị mkpa mgbe ụfọdụ ka nwanna a gbara akwụkwọ gbagwara onye ahụ akwụkwọ iji chebe onwe ya n’ụlọikpe.a
Ọ bụrụ na e jighị obi ọjọọ gbaa akwụkwọ ahụ, o nwere ike ịbụ na o mebighị ndụmọdụ Pọl nyere site n’ike mmụọ nsọ.b Otú o sina dị, mkpa Onye Kraịst kwesịrị ịbụ ido aha Jehova nsọ na ime ka udo na ịdị n’otu dịrị n’ọgbakọ. Ihe bụ́ isi e ji mara ndị na-eso ụzọ Kraịst bụ ịhụnanya ha, ‘ịhụnanya adịghịkwa achọ ọdịmma nke ya.’—1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5; Jọn 13:34, 35.
a Mgbe ụfọdụ, Onye Kraịst nwere ike ime ibe ya oké ihe ọjọọ, dị ka idina mmadụ n’ike, mwakpo, igbu ọchụ ma ọ bụ ịzụ ohi. Ọ bụrụ na ihe ndị dị otú ahụ emee, ọ bụghị ihe ọjọọ ma Onye Kraịst kọọrọ ya ndị ọchịchị, n’agbanyeghị na nke ahụ nwere ike ime ka a kpụpụ Onye Kraịst ibe ya ahụ n’ụlọikpe ma ọ bụ mee ka e kpee ya ikpe dị ka omempụ.
b Ị chọọ ịgụkwu banyere isiokwu a, biko gụọ Ụlọ Nche March 15, 1997, peeji nke 17-22, na nke October 15, 1991, peeji nke 25-28.