Abụ nke 6
Ekpere nke Ohu Chineke
Nke E Biri Ebi
1. Nna bi n’elu, Onyenw’anyị,
K’a sọpụr’aha gị ebigh’ebi.
Ebere gị n’adị ebigh’ebi,
Ọ g’adịgide, n’adagh’ada.
Ọ dịghị mgbe ọ g’ada,
Ebere gị ga n’adị.
2. Mee k’anyị hụ eziokwu n’anya.
Nyer’anyị aka ime uche gị.
A’yị chọr’idebe iwu gị dum,
N’achọ atụrụ gị ma n’azụ ha,
Ịchọta ha, n’azụ ha,
A’yị chọr’ideb’iwu gị.
3. Anyị chọrọ amamihe gị.
Biko, mee k’anyị nwee ịhụnanya.
Nyer’anyị aka im’ebere
Ma mee ka ’madụ dum mara gị,
Ka ’madụ dum mara gị.
A’yị g’egos’ịhụnanya.
(Gụọkwa Ọma 143:10; Jọn 21:15-17; Jems 1:5.)