Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 64 p. 152-p. 153 para. 2
  • Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ịgbaghara Mmejọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ịgbaghara Mmejọ
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mmụta Banyere Ịgbaghara Mmehie
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ihe Mere Anyị Kwesịrị Iji Na-agbaghara
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • “Ònye n’Ezie Bụ Ohu ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi, Onye Nwekwara Uche?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ha “Na-eso Nwa Atụrụ Ahụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 64 p. 152-p. 153 para. 2
Ebe otu ohu jidere ohu ibe ya ma tọgide ya n’akpịrị

ISI NKE 64

Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ịgbaghara Mmejọ

MATIU 18:21-35

  • Ọ̀ BỤ UGBORO ASAA KA ANYỊ GA-AGBAGHARA ONYE MEJỌRỌ ANYỊ?

  • IHE ATỤ AJỌ OHU

Pita nụrụ mgbe Jizọs kwuru na onye ya na ibe ya nwere nsogbu kwesịrị ibu ụzọ gakwuru onye ahụ ka ya na ya mezie. Ma, Pita chọrọ ịma ugboro ole mmadụ kwesịrị ịgbaghara mmadụ ibe ya.

Pita jụrụ Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, ugboro ole ka nwanna m ga-emehie m, mụ agbaghara ya? Ọ̀ bụ ruo ugboro asaa?” Ụfọdụ ndị isi okpukpe na-akụzi na ọ bụ ruo ugboro atọ. Ọ ga-abụ ya mere ka Pita chee na ya bụ ezigbote onye obiọma ma ya gbaghara nwanna ya “ruo ugboro asaa.”—Matiu 18:21.

Ma, mmadụ ịna-agụkọrọ mmadụ ibe ya ugboro ole o mejọrọ ya adabaghị n’ihe Jizọs na-akụzi. Ọ bụ ya mere o ji gwa Pita, sị: “Ana m asị gị, ọ bụghị, Ruo ugboro asaa, kama, Ruo ugboro iri asaa na asaa.” (Matiu 18:22) Ihe Jizọs na-ekwu bụ na anyị ekwesịghị ịkwụsị ịgbaghara ndị na-emejọ anyị. O nweghị mgbe Pita kwesịrị ịkwụsị ịgbaghara nwanna ya.

Ebe otu eze na-akagbu ụgwọ otu ohu ya ji ya

Jizọs meere Pita na ndịozi ndị ọzọ otu ihe atụ ga-eme ka ha ghọta na ha kwesịrị ịna-agbaghara mmadụ ibe ha. Ihe atụ ahụ bụ gbasara otu ohu jụrụ imere onye ọzọ ebere otú nna ya ukwu meere ya. Nna ya ukwu a bụ eze. Otu ụbọchị, eze a chọrọ ka ya na ndị ohu ya mee mpịazi. A kpọtaara ya otu ohu ya ji ya puku talent iri, ya bụ, nde dinarịọs iri isii. Ma, ohu ya a agaghị akwụli ya ụgwọ a o ji ya. Eze ahụ nyeziri iwu ka e ree ya na nwunye ya na ụmụ ya ka ya si ebe ahụ nweta ego ya. Ohu ahụ dara n’ụkwụ nna ya ukwu ozugbo rịọwa ya, sị: “Nweere m ndidi, m ga-akwụ gị ụgwọ niile m ji gị.”—Matiu 18:26.

Ebe ohu na-enye iwu ka a tụba ohu ibe ya n’ụlọ mkpọrọ

Eze ahụ meere ya ebere ma kagbuo ụgwọ ahụ o ji ya. Ozugbo eze ahụ gbaghaara ya, ọ gakwuuru ohu ọzọ ji ya otu narị dinarịọs, nwụchie ya, tọgide ya aka n’akpịrị sị ya: “Kwụọ m ihe niile i ji m n’ụgwọ.” Ma, ohu ahụ dara n’ala n’ụkwụ ya na-arịọ ya, sị: “Nweere m ndidi, m ga-akwụ gị ya.” (Matiu 18:28, 29) Ohu ahụ nna ya ukwu gbaghaara ego o ji ya emeghị ka nna ya ukwu. Ọ tụbara ohu a ji ya obere ụgwọ n’ụlọ mkpọrọ, ka ọ nọrọ ebe ahụ ruo mgbe ọ ga-akwụ ya.

Ebe eze na-enye iwu ka a tụba ohu ahụ na-ekweghị emere ohu ibe ya ebere n’ụlọ mkpọrọ

Jizọs gwara ha na ndị ohu ndị ọzọ hụrụ ihe a merenụ ma gaa kọọrọ ya nna ha ukwu. Ezigbo iwe bịara nna ha ukwu ahụ, ya ezie ozi ka a gaa kpọọ ajọ ohu ahụ. Mgbe ohu ahụ rutere, nna ha ukwu sịrị ya: “Ajọ ohu, m kagbuuru gị ụgwọ niile i ji, mgbe ị rịọsiri m arịrịọ ike. Ọ̀ bụ na gị onwe gị ekwesịghị imere ohu ibe gị ebere, dị ka m mekwaara gị ebere?” Nna ya ukwu ahụ were iwe ma gwa ndị na-elekọta ụlọ mkpọrọ ka ha tụọ ya mkpọrọ ruo mgbe ọ ga-akwụghachi ya ego niile o ji ya. Jizọs gwaziri ha, sị: “Otú ahụ ka Nna m nke eluigwe ga-emesokwa unu ma ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu adịghị agbaghara nwanna ya site n’obi ya.”—Matiu 18:32-35.

O doro anya na ihe atụ a kụziiri anyị ezigbo ihe gbasara ịgbaghara ndị mejọrọ anyị. Chineke agbagharala anyị ọtụtụ mmehie anyị. E nweghị ihe ọjọọ nwanna anyị mere anyị nke ga-aharu ka mmehie Chineke gbaghaara anyị. Jehova anaghịkwa agbaghara anyị mmehie otu ugbo, kama, ọ na-agbaghara anyị ọtụtụ puku ugboro. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịgbaghara nwanna anyị ugboro ole na ole o mejọrọ anyị, ọ sọgodị ya ya bụrụ na e nwere ihe mere anyị ga-eji mee mkpesa? Anyị kwesịrị icheta na mgbe Jizọs na-akụzi ihe n’elu ugwu, ọ sịrị na Chineke ‘ga-gbaghara anyị ụgwọ anyị ji, dị ka anyị gbaghakwaara ndị ji anyị ụgwọ.’—Matiu 6:12.

  • Gịnị mere Pita ji jụọ gbasara mmadụ ịgbaghara nwanna ya, gịnịkwa mere o ji chee na onye gbaghaara nwanna ya ruo ugboro asaa bụ ezigbote onye obiọma?

  • Olee ihe eze ahụ mere mgbe ohu ya rịọrọ ya ka o meere ya ebere, ma, olee ihe ohu ahụ mere ohu ọzọ ji ya obere ụgwọ?

  • Gịnị ka ihe atụ a Jizọs mere na-akụziri anyị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya