Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 14
Ndị Kraịst oge mbụ ziri ozi ọma Alaeze Chineke ruo n’ebe kacha anya n’ụwa. Jizọs gwara ha ebe ndị ha ga-ekwusa ozi ọma. Ọ rụkwara ọrụ ebube mee ka ha zie ndị mmadụ ozi ọma n’asụsụ ha. Jehova mere ka ha kwusaa ozi ọma n’atụghị ụjọ, nyekwa ha ike ha ji die nsogbu karịrị akarị ndị mmadụ nọ na-enye ha.
Jizọs gosiri Jọn onyeozi ebube Jehova n’ọhụụ. N’ọhụụ ọzọ, Jọn hụrụ ka Alaeze eluigwe meriri Setan ma bibie ọchịchị ya ruo mgbe ebighị ebi. Jọn hụrụ ka Jizọs na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000) na-achị. Ọ hụkwara ka e mere ka ụwa niile bụrụ paradaịs, ndị niile bi na ya ana-efe Jehova, birikwa n’udo.