Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 2 p. 10-p. 11 para. 1
  • Chineke Kere Nwoke Mbụ na Nwaanyị Mbụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Kere Nwoke Mbụ na Nwaanyị Mbụ
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nwoke Mbụ na Nwaanyị Mbụ
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Gịnị Mere Anyị Ji Na-aka Nká Ma Na-anwụ Anwụ?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
  • A Ga-eme Ka Ọnwụ, Bụ́ Onye Iro Ikpeazụ, Ghara Ịdị Irè
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Olee Uru Ọnwụ Jizọs na Mbilite n’Ọnwụ Ya Ga-abara Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 2 p. 10-p. 11 para. 1
Ebe Adam na Iv nọ n’ogige Iden

ISI NKE 2

Chineke Kere Nwoke Mbụ na Nwaanyị Mbụ

Jehova kụrụ ubi n’ebe a na-akpọ Iden. E nwere ọtụtụ okooko osisi, osisi, na ọtụtụ ụmụ anụmanụ na ya. Mgbe Chineke kechara ihe ndị a, o ji ájá kpụọ nwoke mbụ bụ́ Adam ma kunye ume ndụ n’imi ya. Ị̀ ma ihe merenụ mgbe o kunyechara ya ume a? Nwoke ahụ ghọrọ mmadụ. Jehova gwara Adam ka ọ na-elekọta ubi ahụ. Ọ gwakwara ya ka ọ gụọ ụmụ anụmanụ niile aha.

Jehova nyere Adam iwu dị mkpa. Ọ gwara ya, sị: ‘I nwere ike iri mkpụrụ nke osisi ọ bụla dị n’ubi a, e wezụga otu nke pụrụ iche. I rie mkpụrụ si na ya, ị ga-anwụ.’

Jehova mechara kwuo, sị: ‘M ga-enye Adam onye inyeaka.’ O mere ka Adam hie oké ụra. Ka Adam na-ehi ụra, Chineke wepụtara otu n’ime ọgịrịga ya ma were ya kee nwunye ya. Aha ya bụ Iv. Adam na Iv ghọrọ ezinụlọ mbụ. Olee otú obi dị Adam mgbe ọ hụrụ nwunye ya? Obi tọrọ ya ezigbo ụtọ, ya ekwuo, sị: ‘Lee onye Jehova si n’ọgịrịga m kee. N’ikpeazụ, e nweela onye dị ka m.’

Jehova gwara Adam na Iv ka ha mụọ ụmụ ma ju ụwa. Ọ chọrọ ka ha na-arụkọ ọrụ ma mee ka ụwa niile bụrụ paradaịs ma ọ bụ ogige mara mma otú ahụ ogige Iden dị. Ma, ụwa abụghị paradaịs ugbu a otú Jehova chọrọ ka ọ bụrụ. Gịnị mere na ọ bụghị paradaịs? Isi nke 3 ga-akọrọ anyị ihe kpatara ya.

“Onye kere ha ná mmalite kere ha nwoke na nwaanyị.”​—Matiu 19:4

Ajụjụ: Olee ọrụ Jehova nyere Adam? Gịnị ga-eme Adam na Iv ma ha rie mkpụrụ si n’osisi Chineke sịrị ha erila?

Jenesis 1:27-31; 2:7-9, 15-23; Abụ Ọma 115:16; Matiu 19:4-6

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya