Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • “Ihe Ọ Bụla nke Dị n’Ebe Iyi ahụ Sọrutere Ga-adị Ndụ”
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
    • Ebe Ezikiel ji ụkwụ na-agafe osimiri na-asọ asọ. Nwoke ahụ yiri ọla kọpa nọ n’akụkụ osimiri ahụ na-ele ya.

      ISI NKE 19

      “Ihe Ọ Bụla nke Dị n’Ebe Iyi ahụ Sọrutere Ga-adị Ndụ”

      EZIKIEL 47:9

      IHE ISIOKWU A NA-EKWU: Otú ọhụụ osimiri si n’ụlọ nsọ na-asọpụta si mezuo n’oge ochie, otú o si emezu taa, nakwa otú ọ ga-esi emezu n’odịnihu

      1, 2. Gịnị ka Ezikiel 47:1-12 gwara anyị na Ezikiel hụrụ? Gịnịkwa ka ọ chọpụtara? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

      EZIKIEL hụrụ ihe ọzọ tụrụ ya n’anya n’ọhụụ ụlọ nsọ ọ hụrụ. Ọ hụrụ mmiri si n’ụlọ nsọ ahụ na-asọpụta. Weregodị ya na ị na-ahụ ka Ezikiel sooro mmiri ahụ na-egbuke egbuke ka ọ hụ ebe ọ na-asọga. (Gụọ Ezikiel 47:1-12.) Mmiri ahụ si n’okpuru ọnụ ụzọ ụlọ nsọ na-agbapụta, sizie n’ọnụ ụzọ àmà dị n’ebe ọwụwa anyanwụ n’ụlọ nsọ na-asọpụta. Mmụọ ozi duuru Ezikiel pụọ n’ụlọ nsọ. Ka ha na-aga, mmụọ ozi ahụ nọ na-atụ mmiri ahụ atụ̀. Ọ gwara Ezikiel ugboro ugboro ka ọ gafee mmiri ahụ, Ezikiel chọpụtakwara na mmiri ahụ nọ na-eto n’ike n’ike. Obere oge, mmiri ahụ toro bụrụzie iyi nke Ezikiel na-enweghị ike iji ụkwụ gafee, naanị ogwugwu ka ọ ga-egwu ya.

      2 A gwara Ezikiel na mmiri ahụ na-asọba n’Oké Osimiri Nnu. N’ebe ọ bụla ọ sọrutere n’osimiri ahụ, ọ na-agwọ ya, mee ka azụ̀ ju ya. Ezikiel hụrụ na ụdị osisi dị iche iche na-eto n’akụkụ abụọ nke osimiri ahụ. Ha na-amị mkpụrụ ọhụrụ a na-eri eri kwa ọnwa, akwụkwọ ha na-agwọkwa ọrịa. O doro anya na ihe niile a Ezikiel hụrụ mere ka o nwee olileanya, obi eruokwa ya ala. Ma, olee otú Ezikiel na ndị ibe ya a dọọrọ n’agha si ghọta ọhụụ a? Oleekwa otú anyị kwesịrị isi ghọta ya n’oge a?

      Olee Otú Ndị Izrel A Dọọrọ n’Agha Si Ghọta Osimiri Ezikiel Hụrụ n’Ọhụụ?

      3. Gịnị mere na ndị Juu oge ochie echeghị na osimiri Ezikiel hụrụ n’ọhụụ bụ osimiri nkịtị?

      3 O doro anya na ndị Juu oge ochie echeghị na osimiri Ezikiel hụrụ n’ọhụụ bụ osimiri nkịtị. Kama, ọ ga-abụ na amaokwu ndị ahụ chetaara ha amụma ọzọ Joel onye amụma buru na a ga-amaliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe. Ọ ga-abụ na e dere amụma a ihe karịrị narị afọ abụọ (200) tupu oge Ezikiel. (Gụọ Joel 3:18.) Mgbe ndị Juu a dọọrọ n’agha gụrụ ihe a Joel si n’ike mmụọ nsọ dee, ha atụghị anya ka ‘mmanya dị ụtọ si n’ugwu na-atapụsị’ ma ọ bụ ka ‘mmiri ara ehi na-eru’ n’ugwu nta. Ha atụghịkwa anya na iyi nkịtị “ga-esi n’ụlọ Jehova na-asọpụta.” Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị Juu ha na Ezikiel nọ. Ha echeghị na osimiri Ezikiel hụrụ n’ọhụụ bụ osimiri nkịtị.a Gịnịzi ka Jehova na-agwa ndị ya? Baịbụl na-enyere anyị aka ịghọta ihe ụfọdụ e kwuru n’ọhụụ ahụ. Ma, anyị ga-eleba anya n’ihe atọ doro anya, na-agbakwa ume anyị na-amụta n’ọhụụ a.

      Osimiri.

      IGBE 19A: Mmiri nke Nọchiri Anya Ngọzi Si n’Aka Jehova

      4. (a) Olee ụdị ngọzi si n’aka Jehova ọ ga-abụ na osimiri Ezikiel hụrụ n’ọhụụ mere ka ndị Juu na-atụ anya ya? (b) Gịnị mere ihe “osimiri” na “mmiri” na-anọchịkarị anya ya na Baịbụl ga-eji mesie anyị obi ike na Jehova ga-agọzi anyị? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Mmiri nke Nọchiri Anya Ngọzi Si n’Aka Jehova.”)

      4 Osimiri nke nọchiri anya ngọzi. Na Baịbụl, osimiri na mmiri na-anọchikarị anya ngọzi si n’aka Jehova. N’ọhụụ ahụ, Ezkiel hụrụ ka mmiri si n’ụlọ nsọ na-asọpụta. N’ihi ya, ndị Chineke ga-aghọta na ọ bụrụ na ha ana-efe Chineke ezigbo ofufe, ọ ga na-agọzi ha n’ụba. Olee ụdị ngọzi ọ bụ? Ndị nchụàjà ga-amalitekwa ịkụziri ha iwu Chineke. Ebe ọ bụ na a ga-amalitekwa ịchụ àjà n’ụlọ nsọ, obi ga-esi ha ike na a ga na-ekpuchiri ha mmehie. (Ezik. 44:15, 23; 45:17) N’ihi ya, ha ga-abụzi ndị dị ọcha, ka à ga-asị na e ji mmiri si n’ụlọ nsọ sachaa ha.

      5. Olee otú osimiri Ezikiel hụrụ n’ọhụụ si mee ka obi sie ndị Chineke ike na a ga-enwe ngọzi ga-ezuru ha niile?

      5 Ngọzi a Jehova ga-agọzi ndị ya ọ̀ ga-ebu ibu nke na ọ ga-ezuru ha niile? Ọ bụrụ na Ezikiel nọ na-eche ihe a, obi ruru ya ala mgbe ọ hụrụ ka mmiri nke na-agbapụta obere obere ghọziri iyi naanị n’ihe dị ka kilomita abụọ malite n’ebe o si na-agbapụta. (Ezik. 47:3-5) Ndị Juu ahụ ndị lọtara n’ala ha nwere ike ịmụba, ma ngọzi Jehova ga-amụbakwa zuoro ha niile. Osimiri ahụ gosiri na ngọzi ndị ahụ ga-eju eju bara abara.

      6. (a) Olee nkwa na-akasi obi e kwere n’ọhụụ ahụ? (b) Oleekwa ihe ọzọ e kwuru n’ọhụụ ahụ? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.)

      6 Mmiri na-enye ndụ. N’ọhụụ Ezikiel hụrụ, osimiri ahụ sọọrọ banye n’Oké Osimiri Nnu, mee ka ọtụtụ ihe dị n’osimiri ahụ dị ndụ. Mmiri ahụ mere ka ụdị azụ̀ dị iche iche dị na mmiri ahụ dị ndụ nke na e jizi ha tụnyere azụ̀ ndị na-adị n’Oké Osimiri Mediterenian. E nwedịrị ebe a na-akụ azụ̀ n’Oké Osimiri Nnu, n’agbata obodo abụọ dịtụ anya n’ibe ya. Mmụọ ozi ahụ sịrị: “Ihe ọ bụla nke dị n’ebe iyi ahụ sọrutere ga-adị ndụ.” Ma, ihe a ọ̀ pụtara na mmiri si n’ụlọ Jehova ruru ebe niile n’Oké Osimiri Nnu? Mba. Mmụọ ozi ahụ kọwara na e nwere ebe ụfọdụ bụ́ apịtị apịtị mmiri ahụ na-enye ndụ na-erughị. Ebe ndị ahụ “ga-abụ nnu nnu.”b (Ezik. 47:8-11) Ọhụụ a na-egosi na Chineke na-ekwe ndị ya nkwa na mgbe ha ga-amaliteghachi ife ya ezigbo ofufe, ndụ ha ga-aka mma, ihe adịkwara ha ná mma. Ma, e kwukwara na ọ bụghị mmadụ niile ga-anabata ngọzi si n’aka Jehova. A gaghịkwa agwọ mmadụ niile.

      7. Olee otú osisi ndị ahụ Ezikiel hụrụ n’akụkụ osimiri si mee ka obi sie ndị Juu si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta ike?

      7 Osisi na-amị mkpụrụ a na-eri eri, ndị akwụkwọ ha na-agwọkwa ọrịa. Olee uru osisi ndị dị n’akụkụ osimiri ahụ bara? Ọ̀ bụ na ha emeghị ka ọhụụ Ezikiel hụrụ makwuo mma? Ha mekwara ka ọ bakwuo uru. O doro anya na obi tọrọ Ezikiel na ndị Juu ibe ya ụtọ iche banyere mkpụrụ na-atọ ụtọ osisi ndị ahụ ga na-amị. Ha ga na-amị mkpụrụ ọhụrụ kwa ọnwa. Ọmarịcha ihe a Ezikiel hụrụ mekwuru ka obi sie ha ike na ha ga na-eriju nri si n’Okwu Chineke afọ. Gịnị ọzọ ka ọ ga-emere ha? Ọ̀ kwa i chetara na akwụkwọ osisi ahụ “na-agwọ ọrịa”? (Ezek. 47:12) Jehova ma na ihe kacha mkpa bụ ime ka ya na ndị ahụ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta dị n’ezigbo mma. O kwekwara nkwa ime ya. N’Isi nke 9 n’akwụkwọ a, a kọwara otú o si mee ya n’amụma ndị ọzọ e buru gbasara ime ka a maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe.

      8. Gịnị gosiri na ihe Ezikiel hụrụ n’ọhụụ ka ga-emezu karịa otú o mezuburu?

      8 Ma, anyị kwukwara n’Isi nke 9 na amụma ahụ mezuru naanị obere n’isi ndị ahụ si ebe a dọọrọ ha n’agha lọta. Ọ bụ ha mere ka ọ ghara imezucha. Olee otú Jehova ga-esi na-agọzi ha mgbe ha laghachiri n’omume ọjọọ ha, na-enupụ isi ma leghara ezigbo ofufe anya? Àgwà ọjọọ ụfọdụ ndị Juu nọ na-akpa wutere ndị nke na-erubere Jehova isi, gbawaakwa ha obi. Ma, ndị ji obi ha niile na-efe Jehova ma na nkwa ya na-emezurịrị. Ha niile na-emezu. (Gụọ Joshụa 23:14.) N’ihi ya, otu ụbọchị, ihe Ezikiel hụrụ n’ọhụụ ka ga-emezu karịa otú o mezuburu. Ma, olee mgbe ọ ga-abụ?

      Osimiri ahụ Na-asọ Taa

      9. Olee mgbe ihe Ezikiel hụrụ n’ọhụụ ụlọ nsọ ga-emezu karịa otú o mezuburu?

      9 N’Isi nke 14 n’akwụkwọ a, anyị mụtara na ọhụụ ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ ga-emezu “n’oge ikpeazụ” karịa otú o mezuburu. N’oge ahụ, a ga-ewere ezigbo ofufe ka ihe dị ezigbo mkpa. (Aịza. 2:2) Olee otú ihe ahụ Ezikiel hụrụ si emezu ugbu a?

      10, 11. (a) Olee ngọzi ndị anyị na-enweta taa? (b) Olee otú ngọzi a si n’aka Jehova si na-agbasa ka o ruo ọtụtụ ndị aka n’oge ikpeazụ a?

      10 Osimiri nke nọchiri anya ngọzi. Olee ngọzi mmiri ahụ si n’ụlọ Jehova na-asọpụta na-echetara anyị taa? N’eziokwu, ọ na-echetara anyị ihe niile Jehova na-enye anyị, ndị na-abara anyị uru. Nke kacha n’ime ha bụ àjà mgbapụta Jizọs. Àjà a na-asachapụ anyị ma na-eme ka Jehova na-agbaghara mmehie anyị. Eziokwu ndị dị n’Okwu Chineke yikwara mmiri na-enye ndụ nke na-eme ka anyị dị ọcha. (Efe. 5:25-27) Olee otú ngọzi ndị ahụ si asọ ka mmiri n’oge anyị a?

      11 N’afọ 1919, ọ bụ naanị ihe dị ka puku mmadụ ise (5,000) na-efe Jehova. Obi dịkwa ha ụtọ maka eziokwu ndị dị na Baịbụl a kọwaara ha n’oge ahụ. Ka oge na-aga, ha nọ na-adịkwu ọtụtụ. Taa, ndị na-efe Jehova akarịala nnọọ nde asatọ (8,000,000). Eziokwu ndị dị na Baịbụl ọ̀ na-eru ha niile aka? Eenụ! Eziokwu Baịbụl ndị a kọwaarala anyị juru eju bara abara. Kemgbe otu narị (100) afọ, ndị Chineke enwetala nde kwuru nde Baịbụl, akwụkwọ, magazin, broshọ, na traktị dị iche iche. Otú ahụ osimiri Ezikiel hụrụ si na-eto n’ike n’ike ka eziokwu Baịbụl si na-agbasa n’ike n’ike ka o ruo ndị chọrọ ịmata banyere Chineke n’ụwa niile aka. O teela a malitere ibipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Ugbu a, ha dịzi na jw.org, e nwekwara ha n’ihe karịrị otu puku (1,000) asụsụ. Olee uru eziokwu ndị a na-abara ndị hụrụ Chineke n’anya?

      12. (a) Olee otú anyị sirila hụ ka eziokwu ndị dị na Baịbụl si ruo ndị mmadụ n’obi ma mee ka ha nwee okwukwe na Jehova? (b) Olee ihe ọzọ dị ezigbo mkpa anyị mụtara n’ọhụụ ahụ? (I nwere ike ịgụ ihe e dere n’ala ala peeji.)

      12 Mmiri na-enye ndụ. A gwara Ezikiel, sị: “Ihe ọ bụla nke dị n’ebe iyi ahụ sọrutere ga-adị ndụ.” Chegodị otú eziokwu ndị dị na Baịbụl si abara ndị niile na-efe Chineke ezigbo ofufe n’oge a uru. Eziokwu ndị ahụ eruola ọtụtụ nde mmadụ n’obi ma mee ka ha nwee okwukwe na Jehova. Ma, ihe ọzọ dị ezigbo mkpa anyị na-amụta n’ọhụụ ahụ bụ na ọ bụghị onye ọ bụla ga-anabata eziokwu ndị ahụ. E nwere ndị obi ha dị ka ebe ndị mmiri na-adọ nakwa ebe ndị dị apịtị apịtị n’Oké Osimiri Nnu Ezikiel hụrụ n’ọhụụ. Ha anaghị anabata eziokwu, ha anaghịkwa eme ihe ha na-amụta.c Ka a ghara inwe mgbe anyị ga-eme otú ahụ.—Gụọ Diuterọnọmi 10:16-18.

      13. Gịnị na gịnị ka osisi ndị Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na-akụziri anyị taa?

      13 Osisi na-amị mkpụrụ a na-eri eri, ndị akwụkwọ ha na-agwọkwa ọrịa. È nwere ihe na-agba ume osisi ndị Ezikiel hụrụ n’akụkụ osimiri ahụ na-akụziri anyị taa? Ee. Ọ̀ kwa i chetara na ha na-amị mkpụrụ ọhụrụ kwa ọnwa nakwa na akwụkwọ ha na-agwọ ọrịa? (Ezik. 47:12) Ha na-echetara anyị na Chineke anyị na-efe ji Okwu ya bụ́ Baịbụl na-enyeju anyị afọ ma na-agwọ anyị, ya bụ, na-eme ka anyị na ya dịrị ná mma. Taa, e nwere ike ikwu na ọrịa ji ndị mmadụ, agụụ na-agụgbukwa ha, n’ihi na ha anaghị aghọta eziokwu ndị dị na Baịbụl. Ma, chegodị ọtụtụ ihe Jehova na-enye anyị. È nweela mgbe ị gụchara otu isiokwu n’akwụkwọ anyị ma ọ bụ bụchaa abụ ná ngwụcha mgbakọ ma ọ bụkwanụ lechaa vidio ma ọ bụ ihe omume tiivi anyị, obi adị gị ezigbo ụtọ na Jehova ji ya gọzie gị? N’eziokwu, a na-enyeju anyị afọ. (Aịza. 65:13, 14) Eziokwu ndị anyị na-aghọta na Baịbụl hà na-eme ka ndụ anyị ka mma, anyị ana-emekwa ihe dị Jehova mma? Ezigbo ndụmọdụ ndị si n’Okwu Chineke na-enyere anyị aka izere mmehie ndị dị ka ịkwa iko, anyaukwu, na enweghị okwukwe. Jehova hazikwara otú a ga-esi na-enyere Ndị Kraịst mere mmehie dị oké njọ aka. (Gụọ Jems 5:14.) N’eziokwu, a gọziela anyị otú osisi ndị Ezikiel hụrụ n’ọhụụ gosiri.

      14, 15. (a) Gịnị ka ebe ndị bụ́ apịtị apịtị Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na-akụziri anyị? (b) Olee uru osimiri ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ baara anyị taa?

      14 E nwekwara ihe ebe ndị ahụ bụ́ apịtị apịtị na-akụziri anyị. Ọ na-akụziri anyị na anyị ekwesịghị ịjụ ngọzi si n’aka Jehova. Ọ ga-ajọgbu onwe ya ma ọ bụrụ na anyị ekweghị ka a gwọọ anyị otú ọtụtụ ndị n’ụwa a na-eme. (Mat. 13:15) Kama ime ka ha, obi dị anyị ezigbo ụtọ na mmiri nke nọchiri anya ngọzi na-abara anyị uru. Mgbe ọ bụla a na-akụziri anyị eziokwu si n’Okwu Chineke, mgbe anyị na-akụziri ya ndị ọzọ, mgbe ndị okenye ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi zụrụ na-enye anyị ndụmọdụ, na-akasi anyị obi ma ọ bụ na-enyere anyị aka, anyị nwere ike icheta osimiri ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ. Ihe ndị dị n’ebe ọ bụla ọ sọrutere na-adị ndụ, na-emekwa nke ọma.

      15 Ma, ọhụụ osimiri Ezikiel hụrụ ọ̀ ka ga-emezu n’ọdịnihu? Anyị ga-achọpụta na osimiri ahụ ga na-asọsi ike na paradaịs karịa otú ọ sọtụrụla.

      Otú Ọhụụ ahụ Ga-esi Emezu na Paradaịs

      16, 17. (a) Olee otú o si bụrụ na mmiri nke ndụ ga na-eto n’ike n’ike na paradaịs? (b) Olee otú osimiri ahụ nke nọchiri anya ngọzi ga-esi baara anyị uru na paradaịs?

      16 Ị̀ na-ahụ onwe gị na paradaịs ka gị na ndị enyi gị na ndị ezinụlọ gị na-ekpori ndụ? Ịmụ gbasara osimiri Ezikiel hụrụ n’ọhụụ nwere ike inyere gị aka ka obi sikwuo gị ike na ihe ndị ị na-ahụ ga-eme. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ka anyị leba anya ọzọ n’ihe atọ e kwuru n’ọhụụ a ndị gosiri na Jehova hụrụ anyị n’anya.

      17 Osimiri nke nọchiri anya ngọzi. E nwere ike ikwu na mmiri ahụ Ezikiel hụrụ ga-etokwu n’ike n’ike na paradaịs n’ihi na ọ ga-eme ka ndị mmadụ na Chineke dịrị ná mma, gwọọkwa ha. Mgbe Jizọs ga-achịwa otu puku afọ, Alaeze Chineke ga-eme ka àjà mgbapụta ya baara ndị na-erubere Chineke isi uru karịa otú ọ bara ugbu a. Ha ga-eji nwayọọ nwayọọ zuo okè. Ọrịa agaghịzi adị. A gaghịzi enwe ndị dọkịta, ndị nọọsụ, na ụlọ ọgwụ. Ndị mmadụ agaghịzi na-emefusị ego iji gwọọ ọrịa. A ga-enwe ọtụtụ nde mmadụ ndị agha Amagedọn na-agaghị egbu. Ọ bụ ha bụ “oké ìgwè mmadụ” ndị ga-esi ‘n’oké mkpagbu pụta.’ Ha ga-enweta mmiri nke ndụ. (Mkpu. 7:9, 14) Ma n’agbanyeghị ọtụtụ ngọzi ha ga-enweta ozugbo Alaeze Chineke malitere ịchị, ngọzi ndị ahụ ga-adị ka mmiri na-agbapụta obere obere ma e jiri ha tụnyere ndị ha ka ga-enweta. Mmiri ahụ ga-eto n’ike n’ike ma gbooro ndị mmadụ mkpa ha niile, otú Ezikiel hụrụ n’ọhụụ.

      Ebe ndị mmadụ ahụ́ siri ike na-arụ ọrụ ma na-enwe obi ụtọ na paradaịs. Osimiri na-asọ n’azụ ebe ha nọ.

      Na paradaịs, osimiri ahụ nke nọchiri anya ngọzi si n’aka Jehova ga-eme ka ahụ́ sie onye ọ bụla ike, mmadụ niile abụrụ okoro na agbọghọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

      18. Olee otú o si bụrụ na “osimiri nke mmiri nke ndụ” ga-abụzi nnukwu mmiri na-asọsi ike n’ọchịchị otu puku afọ Kraịst?

      18 Mmiri na-enye ndụ. N’ọchịchị otu puku afọ Kraịst, “osimiri nke mmiri nke ndụ” ga-abụzi nnukwu mmiri na-asọsi ike. (Mkpu. 22:1) A ga-akpọlite ijeri kwuru ijeri mmadụ n’ọnwụ ma mee ka ha dị ndụ ebighị ebi na paradaịs. Ihe ọma Jehova ga-eji Alaeze ya meere ndị mmadụ bụ ime ka ọtụtụ ndị nwụrụ kemgbe dịrị ndụ. (Aịza. 26:19) Ma, ndị niile a ga-akpọlite n’ọnwụ hà ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?

      19. (a) Olee ihe gosiri na a ga-enwe eziokwu ọhụrụ si n’aka Chineke na paradaịs? (b) Olee otú o si bụrụ na ụfọdụ ndị “ga-abụ nnu nnu” n’ọdịnihu?

      19 Onye ọ bụla n’ime ha ga-eji aka ya họrọ. N’oge ahụ, a ga-emeghe akwụkwọ mpịakọta ndị ọhụrụ. N’ihi ya, ihe so na mmiri nke ndụ Jehova ga-enye anyị bụ eziokwu ọhụrụ, ma ọ bụ ntụziaka ọhụrụ. Ọ̀ bụ na ihe ọma a ga-eme anaghị eme gị obi ụtọ? Ma, ụfọdụ ndị agaghị anabata ngọzi a, kama ha ga-ahọrọ inupụrụ Jehova isi. N’ọchịchị otu puku afọ Kraịst, ụfọdụ ndị ga-enupụ isi. Ma, a gaghị ekwe ka ha kpata ọgba aghara na paradaịs. (Aịza. 65:20) Ihe a na-echetara anyị ebe ndị dị apịtị apịtị Ezikiel hụrụ n’ọhụụ. A gaghị eme ka ebe ndị ahụ dị mma. Ha “ga-abụ nnu nnu.” Ndị niile kpọchiri ntị jụ ịṅụ ezigbo mmiri nke ndụ mere ezigbo iberiibe. Kraịst chịchaa otu puku afọ, a ga-enwe ndị nnupụisi ga-akwado Setan. Ndị niile na-anabataghị ezigbo ọchịchị Jehova ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi otú Setan ga-anwụ.—Mkpu. 20:7-12.

      20. Olee ndokwa ga-abara anyị uru a ga-eme n’ọchịchị otu puku afọ Kraịst nke na-echetara anyị osisi ndị Ezikiel hụrụ n’ọhụụ?

      20 Osisi na-amị mkpụrụ a na-eri eri, ndị akwụkwọ ha na-agwọkwa ọrịa. Jehova achọghị ka onye ọ bụla n’ime anyị ghara inweta ndụ ebighị ebi. Iji nyere anyị aka inweta ya, ọ ga-emekwa ka e nwee ndokwa yiri osisi ndị Ezikiel hụrụ n’ọhụụ. Ma na paradaịs, ihe ọma ndị Jehova ga-emere anyị ga-eme ka anyị na ya dịrị ná mma, meekwa ka ahụ́ dị anyị mma. Jizọs Kraịst na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000) ya na ha ga-abụ eze ga-anọ n’eluigwe na-achị ruo otu puku afọ. Ebe ọ bụ na Jizọs na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ bụ ndị nchụàjà, ha ga-eme ka àjà mgbapụta Kraịst baara ndị mmadụ uru, meekwa ka ha zuo okè. (Mkpu. 20:6) Ndokwa a nke ga-eme ka anyị na Jehova dịrị ná mma, meekwa ka ahụ́ dị anyị mma na-echetara anyị osisi ndị Ezikiel hụrụ n’akụkụ osimiri, ndị na-amị mkpụrụ a na-eri eri, ndị akwụkwọ ha na-agwọkwa ọrịa. Ọhụụ a Ezikiel hụrụ yiri amụma ọzọ mara ezigbo mma Jọn onyeozi dere. (Gụọ Mkpughe 22:1, 2.) Akwụkwọ nke osisi ndị Jọn hụrụ “bụ maka ịgwọ mba niile.” Ọrụ Jizọs na ndị nchụàjà dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-arụ ga-abara ọtụtụ nde mmadụ na-erubere Chineke isi uru.

      Mmiri Ezikiel hụrụ, nke na-agbapụta obere obere, ghọrọ iyi.

      IGBE 19B: Mmiri Na-agbapụta Obere Obere Ghọziri Iyi

      21. Olee otú ihe ndị anyị mụtara gbasara osimiri Ezkiel hụrụ n’ọhụụ dị gị n’obi? Olee ihe ọzọ anyị ga-eleba anya na ya? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Mmiri Na-agbapụta Obere Obere Ghọziri Iyi.”)

      21 Ọ̀ kwa ihe ndị anyị mụtara gbasara osimiri Ezkiel hụrụ n’ọhụụ emeela ka obi dị gị ụtọ, meekwa ka i nwee olileanya? N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ihe ọma ndị ga-emere anyị n’ọdịnihu. Ị̀ hụrụ na ọ bụ kemgbe ọtụtụ puku afọ gara aga ka Jehova buru ọtụtụ amụma ndị na-enyere anyị aka ịhụ otú paradaịs ga-adị? O nweela ndidi kemgbe ahụ, na-akpọ anyị ka anyị soro ná ndị ga-anọ mgbe nkwa ndị ahụ ga-emezu. Ajụjụ bụzi, Ị̀ ga-adị ndụ mgbe ahụ? I nwere ike ịna-eche ma ị̀ ga-esokwa ná ndị ga-adị ndụ na paradaịs. Ka anyị hụzie otú ihe ndị e kwuru n’amụma ndị ikpeazụ Ezikiel buru si eme ka obi sie anyị ike.

      a Ihe ọzọ bụ na ọ ga-abụ na ndị Juu a dọọrọ n’agha, ndị chetara otú obodo ha dị, ma na osimiri a abụghị osimiri nkịtị n’ihi na o si n’ụlọ nsọ dị n’ugwu dị ezigbo elu na-asọpụta. E nweghị ụlọ nsọ dị otú ahụ dị n’ugwu dị ezigbo elu n’ala ha. Ọhụụ ahụ gosikwara na osimiri ahụ na-asọrọ sọba n’Oké Osimiri Nnu n’enweghị ihe nọchiiri ya ụzọ. E nweghị ebe mmiri si otú ahụ asọ.

      b Ụfọdụ ndị na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl chere na ihe a Baịbụl kwuru bụ ihe ọma n’ihi na o teela ndị mmadụ si ná nnu e ji echekwa nri, nke a na-egwute n’Oké Osimiri Nnu, na-akpata ezigbo ego. Ma, amaokwu ahụ kwuru hoo haa na “a gaghị eme ka ebe ndị ahụ” dị apịtị apịtị “dị mma.” Ihe ndị dị na ha agaghị adị ndụ n’ihi na mmiri na-enye ndụ, nke si n’ụlọ Jehova, anaghị erute n’ebe ndị ahụ. N’ihi ya, ọ ga-abụ na ebe ndị ahụ ịbụ nnu nnu pụtara na ha agaghị adị mma.—Ọma 107:33, 34; Jere. 17:6.

      c Ihe atụ Jizọs mere gbasara ụgbụ yiri ihe e kwuru n’ọhụụ a. Ọtụtụ azụ̀ banyere n’ụgbụ ahụ, ma ọ bụghị ha niile “dị mma.” E tufuru ndị na-adịghị mma. Jizọs kwuziri na ọtụtụ n’ime ndị na-abata ná nzukọ Jehova nwere ike imecha kwụsị ife Jehova.—Mat. 13:47-50; 2 Tim. 2:20, 21.

      GỊNỊ KA Ị MỤTARA GBASARA IFE CHINEKE EZIGBO OFUFE?

      1. Olee otú ọhụụ osimiri Ezikiel hụrụ si mezuo n’oge ochie?

      2. Olee otú ọhụụ ahụ si emezu taa?

      3. Olee otú osimiri Ezikiel hụrụ n’ọhụụ ga-esi na-asọ n’ike n’ike otú ọ na-asọbeghị mbụ mgbe Kraịst ga-achị otu puku afọ?

  • ‘Kee Ala ahụ Ka Onye Ọ Bụla Nweta nke Ya’
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
    • Ebe mmiri sọọrọ na-asọba n’osimiri. Ala a ga-ekere ndị Chineke gbara ya gburugburu.

      ISI NKE 20

      ‘Kee Ala ahụ Ka Onye Ọ Bụla Nweta nke Ya’

      EZIKIEL 45:1

      IHE ISIOKWU A NA-EKWU: Ihe ike ala ahụ pụtara

      1, 2. (a) Gịnị ka Jehova gwara Ezikiel? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

      EZIKIEL ka hụchara ọhụụ nke mere ka o cheta ihe mere n’oge Mosis na Joshụa, ya bụ, ihe dị ka narị afọ itoolu (900) tupu mgbe ahụ. N’oge ahụ, Jehova gwara Mosis ebe ndị ga-abụ ókè Ala Nkwa ahụ, mechaakwa gwa Joshụa otú a ga-esi keere ebo ndị e nwere n’Izrel ala ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 34:1-15; Josh. 13:7; 22:4, 9) Ma ugbu a, ya bụ, n’afọ 593 T.O.N.K., Jehova gwaziri Ezikiel na ndị ibe ya a dọọrọ n’agha ka ha keere ebo ndị e nwere n’Izrel Ala Nkwa ahụ ọzọ.—Ezik. 45:1; 47:14; 48:29.

      2 Gịnị ka Jehova si n’ọhụụ ahụ gwa Ezikiel na ndị ibe ya a dọọrọ n’agha? Gịnị mere o ji bụrụ na ọhụụ a na-agba ndị na-efe Chineke taa ume? Ọhụụ a ọ̀ ga-emezu n’ọdịnihu karịa otú o mezuburu?

      Ọhụụ nke Kwuru Ihe Anọ Mere Ka Obi Sie Ndị Chineke Ike

      3, 4. (a) Olee ihe anọ na-emesi obi ike e kwuru n’ọhụụ ikpeazụ Ezikiel hụrụ? (b) Olee ihe na-emesi obi ike anyị ga-eleba anya n’isiokwu a?

      3 E dere ọhụụ ikpeazụ Ezikiel hụrụ n’akwụkwọ Ezikiel isi 40 ruo n’isi 48. (Ezik. 40:1–48:35) E nwere ihe anọ e kwuru na ya mere ka obi sie ndị Izrel ike na ha ga-alaghachi n’obodo ha. Gịnị ka ha bụ? Nke mbụ bụ na a ga-amaliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe n’ụlọ nsọ ya. Nke abụọ bụ na ndị nchụàjà na ndị ọzụzụ atụrụ, bụ́ ndị ji obi ha niile na-efe Chineke, ga na-edu ndị Izrel. Nke atọ bụ na ndị niile ga-alọghachi n’Izrel ga-eketa ala. Nke anọ abụrụ na Jehova ga-anọnyere ha, ya na ha ebiri.

      4 Isi nke 13 na 14 n’akwụkwọ a kwuru otú ihe nke mbụ na nke abụọ ahụ na-emesi obi ike ga-esi emezu, ya bụ, na a ga-amaliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe nakwa na ndị ọzụzụ atụrụ ndị ji obi ha niile na-efe Chineke ga na-edu ndị ya. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe nke atọ, ya bụ, nkwa e kwere na ndị Chineke ga-eketa ala. N’Isi nke 22, anyị ga-ekwuzi gbasara nkwa Jehova kwere na ya na ndị ya ga-ebi.—Ezik. 47:13-21; 48:1-7, 23-29.

      ‘A Na-ekere Unu Ala A Ka Ọ Bụrụ Ala Unu Ketara’

      5, 6. (a) N’ọhụụ Ezikiel hụrụ, olee ebe bụ́ ala e keere ndị Izrel? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị mere e ji mee ka Ezikiel hụ ala a ga-ekere ndị Izrel n’ọhụụ?

      5 Gụọ Ezikiel 47:14. Jehova si n’ọhụụ gosi Ezikiel ala nke ga-adị “ka ogige Iden” n’oge na-adịghị anya. (Ezik. 36:35) Jehova kwuziri: “Ala a ka unu ga-ekere onwe unu ka ọ bụrụ ihe ebo iri na abụọ nke Izrel ketara.” (Ezik. 47:13) “Ala a” a ga-ekere ha bụ ala ndị Izrel a dọọrọ n’anya ga-alaghachi na ya. N’Ezikiel 47:15-21, Jehova kwuziri kpọmkwem ebe ókè ala ahụ ga-amalite nakwa ebe ọ ga-ejedebe.

      6 Gịnị mere e ji mee ka Ezikiel hụ ala a ga-ekere ndị Izrel n’ọhụụ? A gwara Ezikiel na ndị ibe ya a dọọrọ n’agha kpọmkwem ebe ndị ga-abụ ókè ala ha. Ihe a mere ka obi sie ha ike na ha ga-alaghachi n’obodo ha. Chegodị otú obi ga-esi atọ ha ezigbo ụtọ mgbe ha nụrụ ihe a na-emesi obi ike Jehova gwara ha ma kọwaara ha nke ọma. Ma, ndị Chineke n’oge ochie hà nwetara ala ahụ e keere ha ka ọ bụrụ ihe ha ketara? Ee, ha nwetara ya.

      Ebe mmiri sọọrọ na-asọba n’osimiri. Ala a ga-ekere ndị Chineke gbara ya gburugburu.

      7. (a) Gịnị malitere ime n’afọ 537 T.O.N.K., gịnịkwa ka ọ na-echetara anyị? (b) Olee ajụjụ anyị ga-ebu ụzọ zaa?

      7 N’afọ 537 T.O.N.K., ya bụ, ihe dị ka afọ iri ise na isii Ezikiel hụchara ọhụụ ahụ, ọtụtụ puku ndị Izrel a dọọrọ n’agha malitere ịlaghachi n’ala ha n’Izrel ma biri na ya. Ihe a dị ịtụnanya nke mere n’oge ochie na-echetara anyị otú ụdị ihe a si na-emere ndị Chineke n’oge anyị a. E nwere ike ikwu na ha eketakwala ala. Olee otú ha si keta ya? Jehova mere ka ndị na-efe ya nweta ala, ya bụ, ka ha nwee ike ife ya ezigbo ofufe, ya na ha adịrị ná mma. N’ihi ya, nlaghachi ndị Izrel laghachiri n’Ala Nkwa ahụ nwere ike ịkụziri anyị ọtụtụ ihe gbasara nlaghachi ndị Chineke laghachiri n’ala ha, ya bụ, otú ha si maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe n’oge a. Ma ka anyị buru ụzọ zaa ajụjụ bụ́, “Gịnị mere anyị ga-eji ekwu na e nwere ala ndị Chineke laghachiri na ya n’oge anyị a?”

      8. (a) Olee mba Jehova ji dochie anya mba Izrel oge ochie? (b) Gịnị bụ ala ahụ dị iche? (ch) Olee mgbe ọ malitere ịdị, oleekwa ndị bi na ya?

      8 N’ọhụụ Ezikiel hụburu, Jehova mere ka ọ mata na amụma ndị kwuru na ndị Izrel ga-amaliteghachi ife ya ezigbo ofufe ga-emezu karịa otú o mezuburu ma ‘Devid ohu ya,’ bụ́ Jizọs Kraịst, malite ịchị. (Ezik. 37:24) Ihe a mezuru n’afọ 1914. Tupu mgbe ahụ, Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ mba dị nsọ, anọchiela mba Izrel oge ochie. (Gụọ Matiu 21:43; 1 Pita 2:9.) Ma, ihe Jehova mere abụghị naanị iji mba ahụ dị nsọ dochie anya mba Izrel oge ochie, kama o jikwa ala dị iche dochie anya ala ndị Izrel oge ochie. (Aịza. 66:8) Anyị mụtara n’Isi nke 17 n’akwụkwọ a na kemgbe afọ 1919, ndị fọrọ ná ndị e tere mmanụ bi n’ala ahụ, ya bụ, na ha na-efe Jehova ezigbo ofufe, ha na ya adịrịkwa n’ezigbo mma. (Gụọ igbe 9B, nke isiokwu ya bụ, “Ihe Mere n’Afọ 1919.”) Ka oge na-aga, ndị nwere olileanya ibi n’ụwa, ya bụ, “atụrụ ọzọ,” malitekwara ịbanye n’ala ahụ. (Jọn 10:16) Ọ bụ eziokwu na ala ahụ na-asakwu mbara taa, ọ bụ mgbe agha Amagedọn gachara ka ngọzi si na ya ga-ezu ezu.

      E Kere Ala Otú E Kwuru, Ha Niile Há Nhata

      9. Gịnị ka Jehova kwuru gbasara otú a ga-esi eke ala ahụ?

      9 Gụọ Ezikiel 48:1, 28. Mgbe Jehova kwuchara ebe ala ahụ ga-ebido na ebe ọ ga-akwụsị, o kwuziri otú a ga-esi ekere ya ndị Izrel. O kwukwara na ala ebo nke ọ bụla n’ebo iri na abụọ e nwere n’Izrel ga-eketa ga-aha. E nweghị nke ga-aka ibe ya malite n’ebe ugwu ruo n’ebe ndịda. Ebo Dan ga-adị n’elu elu ebe ugwu, ebo Gad adịrị ná ngwụcha ngwụcha ebe ndịda. Ala nke ọ bụla n’ime ala iri na abụọ ndị ahụ ga-amalite n’ebe ọwụwa anyanwụ gara ùhiè ùhiè ruo n’ebe ọdịda anyanwụ n’Oké Osimiri Mediterenian.—Ezik. 47:20; i nwere ike ile map dị n’igbe isiokwu ya bụ “Otú E Si Kee Ala Ahụ.”

      10. Olee otú ọhụụ a si mesie ndị ahụ a dọọrọ n’agha obi ike?

      10 Olee otú ọhụụ a si mesie ndị ahụ a dọọrọ n’agha obi ike? Ọ ga-abụ na otú Ezikiel si kọwaa ihe niile gbasara ala ahụ a ga-eke mere ka obi sie ha ike na a ga-asa anya ná mmiri kee ala ahụ. Ala há nhata ebo iri na abụọ ahụ ga-eketa na-egosikwa na onye ọ bụla n’ime ndị ahụ ga-esi n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta n’Izrel ga-enwetarịrị ala nke ya. E nweghị onye ga-alọta a hapụ ikenye ya ala ma ọ bụ ya aghara inwe ebe ọ ga-ebi.

      Ebe nwoke yiri ọla kọpa na-egosi Ezikiel ala a ga-ekere ndị Chineke.

      IGBE 20A: Otú E Si Kee Ala Ahụ

      11. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’ọhụụ Ezikiel hụrụ gbasara ike ala? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Otú E Si Kee Ala Ahụ.”)

      11 Olee ihe ndị na-agba ume anyị nwere ike ịmụta n’ọhụụ ahụ taa? Ọ bụghị naanị ndị nchụàjà, ndị Livaị, na ndị isi nwetara ebe ha ga-ebi n’Ala Nkwa ahụ, ndị niile ọzọ si n’ebo iri na abụọ n’Izrel nwetakwara. (Ezik. 45:4, 5, 7, 8) Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Ọ bụghị naanị ndị fọrọ ná ndị e tere mmanụ na ndị okenye ndị ọzọ, bụ́ ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ,’ nwetara ala, ndị ọzọ niile so n’oké ìgwè mmadụ sokwa nweta ala.a (Mkpu. 7:9) Onye ọ bụla n’ime anyị, ma onye ukwu ma onye nta, nwere ebe bụ́ nke ya n’ala a, nweekwa ọrụ ọ ga na-arụ na ya. N’eziokwu, ihe a na-eme obi ụtọ.

      Foto dị iche iche: Ndị Chineke n’oge a. 1. Ebe nwanna nwaanyị na-akọwara mama ya otú ọ ga-esi aṅụ ọgwụ ya. 2. Ebe nwanna nwaanyị na-ekwusa ozi ọma ná mba ọzọ na-akụziri onye nkwusa ọhụrụ otú e si ezi ozi ọma. Ha na-ekwusa ozi ọma n’akụkụ osimiri. 3. Ebe nwaanyị naanị ya na-azụ ụmụ ya abụọ na-amụrụ ha Baịbụl. 4. Ebe Nwanna Gerrit Lösch na-eduziri ezinụlọ Betel ihe mmụta dịịrị ụbọchị. 5. Ebe otu agadi nwaanyị na-ekpe ekpere. O dewere Baịbụl na akwụkwọ e dere aha ụmụnna ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ n’ụkwụ ya. 6. Ebe nwanna nwoke na-ehicha ebe a na-aga mposi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. 7. Ebe nwanna nwoke na-egosi ndị na-abata n’Ụlọ Mgbakọ ebe ha ga-adọsa ụgbọala ha. 8. Ebe ụmụnna ndị na-arụ ọrụ n’ọfis ndị nsụgharị nọ na-etinye okwu n’ígwè.

      N’agbanyeghị ụdị ọrụ anyị na-arụ ná nzukọ Jehova, Jehova ji mbọ anyị na-agba kpọrọ ihe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

      Gịnị Ka Ihe Abụọ E Kwuru Gbasara Ike Ala Na-akụziri Anyị?

      12, 13. Gịnị ka Jehova kwuru hoo haa gbasara otú a ga-esi ekere ebo dị iche iche ala ahụ?

      12 Ọ ga-abụ na ihe ụfọdụ Jehova kwuru gbasara otú a ga-esi kee ala ahụ juru Ezikiel anya n’ihi na ha dị iche n’ihe Chineke gwara Mosis. Ka anyị hụ ihe abụọ dị iche na ha. Nke mbụ bụ otú a ga-esi eke ala ahụ, nke abụọ abụrụ ndị ga-eketa ala ahụ.

      13 Nke mbụ bụ otú a ga-esi eke ala ahụ. A gwara Mosis ka o kenye ebo ndị dị ọtụtụ ala buru ibu, kenye ndị na-adịghị ọtụtụ ala na-ebughị ibu. (Ọnụ Ọgụ. 26:52-54) Ma n’ọhụụ Ezikiel hụrụ, Jehova kwuru hoo haa ka e kenye ebo nke ọ bụla ihe “ibe ya ga-eketa.” (Ezik. 47:14) N’ihi ya, malite n’ókè ebe ùgwù ruo n’ókè ebe ndịda, ala ebo nke ọ bụla n’ebo iri na abụọ ahụ ga-eketa ga-aha nhata. Ndị Izrel niile, n’agbanyeghị ebo ha si, ga na-enweta akụ̀ ndị Ala Nkwa ahụ, nke mmiri na-ede nke ọma, ga na-emepụta. Ebo nke ọ bụla ga-enweta ihe ibe ya nwetara.

      14. Olee otú ihe Jehova kwuru banyere ndị mbịarambịa si dị iche n’ihe Iwu Mosis kwuru?

      14 Nke abụọ bụ ndị ga-eketa ala ahụ. Ihe e kwuru n’Iwu Mosis mere ka a na-akwanyere ndị mbịarambịa n’Izrel ùgwù, meekwa ka ha soro na-efe Jehova. Ma, a naghị ekenye ha ala. (Lev. 19:33, 34) Ma, ihe Jehova gwara Ezikiel ugbu a dị iche n’ihe o kwuburu n’Iwu Mosis. Ọ gwara Ezikiel, sị: “N’ebo ọ bụla onye mbịarambịa bi ka unu ga-enye ya ala.” Jehova ji ihe a ọ gwara ya gosi na e nweghịzi ihe dị iche ‘n’ụmụ amaala Izrel’ na ndị mbịarambịa bi n’ala ahụ. (Ezik. 47:22, 23) N’ala ahụ Ezikiel hụrụ, ọ chọpụtara na e nweghị onye ka ibe ya, ha niile na-efekọkwa Jehova ọnụ.—Lev. 25:23.

      15. Olee eziokwu na-anaghị agbanwe agbanwe e ji mara Jehova nke anyị chọpụtara n’ihe o kwuru gbasara ike ala ahụ nakwa gbasara ndị ga-ebi na ya?

      15 O doro anya na ihe abụọ a gbara ọkpụrụkpụ Jehova gwara Ezikiel gbasara otú a ga-esi kee ala ahụ na ndị ga-ebi na ya mere ka obi sie ndị ahụ a dọọrọ n’agha ike. Ha ma na Jehova ga-ekenye ha niile ala há nhata, ma hà bụ ụmụ afọ Izrel ma hà bụ ndị mbịarambịa na-efe Jehova. (Ezra 8:20; Nehe. 3:26; 7:6, 25; Aịza. 56:3, 8) Ihe ahụ Jehova kwuru gosikwara na o ji ndị niile na-efe ya kpọrọ ezigbo ihe. E nweghị onye ka ibe ya n’anya ya. Ihe a na-agba anyị ume. Ọ bụkwa eziokwu na-anaghị agbanwe agbanwe. (Gụọ Hagaị 2:7.) Taa, ma ànyị nwere olileanya ibi n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, anyị ji eziokwu a kpọrọ ihe.

      16, 17. (a) Olee uru ịmụ ihe ndị a e kwuru gbasara ala ahụ na ndị ga-ebi na ya baara anyị? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’Isi nke 21?

      16 Olee uru ịmụ ihe ndị a e kwuru gbasara ala ahụ na ndị ga-ebi na ya baara anyị? Ọ na-echetara anyị na ihe e kwesịrị iji mara anyị n’ụwa niile taa bụ na anyị na ụmụnna anyị dị n’otu, e nweghịkwa onye n’ime anyị ka ibe ya. Jehova anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Àna m eme ka Jehova, ghara ịna-ele mmadụ anya n’ihu? M̀ na-eji obi m niile akwanyere ndị mụ na ha na-efekọ Jehova ùgwù n’agbanyeghị agbụrụ ha si ma ọ bụ otú ihe si dịrị ha?’ (Rom 12:10) Obi dị anyị ụtọ na Jehova, Nna anyị nke eluigwe, kwere ka anyị niile bata n’ala o nyere ndị ya, ya bụ, ka anyị na ya dịrị n’ezigbo mma, anyị ejiri obi anyị niile na-efe ya ezigbo ofufe, ya ana-agọzikwa anyị.—Gal. 3:26-29; Mkpu. 7:9.

      Ebe ụmụnna nwaanyị ndị si n’agbụrụ dị iche iche na-eme ihe mmụta dịịrị ụbọchị n’ụlọ otu nwanna nwaanyị nwere nkwarụ.

      Ànyị na-eme ka Jehova, ghara ịna-ele ndị mmadụ anya n’ihu ma jiri obi anyị niile na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15, 16)

      17 Ugbu a, ka anyị leba anya n’ihe nke anọ na-emesi obi ike e kwuru ná ngwụcha ọhụụ Ezikiel hụrụ, ya bụ, na Jehova ga-anọnyere ndị ahụ a dọọrọ n’agha. Gịnị na gịnị ka nkwa a na-akụziri anyị? A ga-aza ajụjụ a n’Isi nke 21.

      a Biko, gụọ Isi nke 14 n’akwụkwọ a ka ị hụ ihe e kwuru gbasara ọrụ pụrụ iche Jehova nyere ndị na-arụ ọrụ ka ndị nchụàjà na ndị isi n’ala ndị Chineke, ya bụ, n’ezigbo ofufe anyị na-efe Jehova.

      GỊNỊ KA Ị MỤTARA GBASARA IFE CHINEKE EZIGBO OFUFE?

      1. Gịnị mere i ji kweta na e nwere ala Chineke nyere ndị ya n’oge a?

      2. Gịnị mere obi kwesịrị iji sie gị ike na i nwere ebe bụ́ nke gị n’ala ndị Chineke, nweekwa ọrụ ị ga na-arụ ka ị na-efe ya ezigbo ofufe?

      3. Gịnị ka ọhụụ Ezikiel hụrụ gbasara ala e keere ndị Jehova na-akụziri gị gbasara Jehova?

  • “Aha Obodo Ahụ . . . Ga-abụ Jehova Nọ Ebe Ahụ”
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
    • Otú obodo aha ya bụ ‘Jehova Nọ Ebe Ahụ’ dị ma e si n’elu na-ele ya.

      ISI NKE 21

      “Aha Obodo Ahụ . . . Ga-abụ Jehova Nọ Ebe Ahụ”

      EZIKIEL 48:35

      IHE ISIOKWU A NA-EKWU: Ihe obodo na ala a ga-ewepụta iche pụtara

      1, 2. (a) Olee ala a ga-ewepụta iche? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị ka ọhụụ ahụ mere ka obi sie ndị ahụ a dọọrọ n’agha ike na ọ ga-eme?

      N’ỌHỤỤ ikpeazụ Ezikiel hụrụ, a gwara ya na e nwere ala a ga-ewepụta ka e jiri ya mee ihe pụrụ iche. A ga-ewepụta ala a iche ka ọ bụrụ ala a ga-enye Jehova, ọ bụghị ka e kenye ya otu ebo n’Izrel. A gwakwara Ezikiel banyere otu obodo pụrụ iche a kpọrọ ọmarịcha aha. Ọhụụ a mere ka obi sie ndị Izrel a dọọrọ n’agha ezigbo ike na Jehova ga-anọnyere ha mgbe ha ga-alaghachi n’obodo ha.

      2 Ezikiel gwara anyị ọtụtụ ihe gbasara ala ahụ e wepụtara iche. Ka anyị mụọ gbasara ya n’ihi na e nwere ọtụtụ ihe anyịnwa bụ́ ndị na-efe Jehova ezigbo ofufe ga-amụta na ya.

      Otú ala a kpọrọ ‘ala niile e nyere Chineke’ na obodo aha ya bụ ‘Jehova Nọ Ebe Ahụ’ dị ma e si n’elu na-ele ya. Ebube Jehova mere ka ụlọ nsọ a nke dị n’elu nnukwu ugwu na-egbuke egbuke, mmiri sikwa n’ugwu ahụ na-asọdata.

      “Ala Dị Nsọ” na Obodo Ahụ

      Map ala Jehova wepụtara iche, nke a kpọrọ ‘ala a ga-ewepụta iche,’ na igbe gosiri ala a kpọrọ ‘ala niile e nyere Chineke.’

      IGBE 21A: “Ala Unu Ga-ewepụta Iche”

      3. Olee mpaghara ise e kebiri ala ahụ e wepụtara iche maka Jehova, gịnịkwa ka e ji ebe ndị ahụ eme? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ala Unu Ga-ewepụta Iche.”)

      3 Ala ahụ pụrụ iche dị puku kubit iri abụọ na puku ise (25,000), ya bụ, kilomita iri na atọ, malite n’ebe ugwu ruo n’ebe ndịda, dịrịkwa puku kubit iri abụọ na puku ise (25,000) malite n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo n’ebe ọdịda anyanwụ. Akụkụ ya anọ há nhata. A kpọrọ ala a ‘ala niile e nyere Chineke.’ E kere ya ụzọ atọ. Ebe dị n’elu bụ maka ndị Livaị, nke dị n’etiti abụrụ maka ụlọ nsọ na ndị nchụàjà. A na-akpọ ha abụọ “ala ahụ dị nsọ.” Ala nke obere dị n’ala ala, ma ọ bụ “ala nke fọrọnụ,” bụ “nke ndị obodo.”—Ezik. 48:15, 20.

      4. Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe e kwuru gbasara ala e wepụtara iche maka Jehova?

      4 Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe e kwuru gbasara ala e wepụtara iche maka Jehova? Ebe e bu ụzọ wepụta ala bụ́ maka Jehova tupu e wepụta nke ebo dị iche iche, Jehova na-eme ka a mata na e kwesịrị iji ebe a a na-anọ efe ya kpọrọ ihe karịa ihe ọ bụla ọzọ. (Ezik. 45:1) O doro anya na ndị ahụ a dọọrọ n’agha mụtara ọtụtụ ihe n’otú e si gosi ebe kacha mkpa n’ala e keere ndị Izrel. Ọ bụ ofufe Jehova kwesịrị ịkacha ha mkpa. Taa, anyị weere ihe ndị gbasara ofufe Jehova, dị ka ịmụ Baịbụl, ịga ọmụmụ ihe, na ikwusa ozi ọma, ka ihe ndị kacha mkpa. Ọ bụrụ na ife Jehova abụrụ ihe kacha anyị mkpa n’ihe niile anyị na-eme kwa ụbọchị, anyị na-egosi na anyị na-eme ka Jehova.

      ‘Obodo ahụ Ga-adị n’Etiti Ya’

      5, 6. (a) Ole ndị nwe obodo ahụ? (b) Gịnị ka obodo ahụ na-abụghị? Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

      5 Gụọ Ezikiel 48:15. Gịnị ka “obodo ahụ” na ala ndị gbara ya gburugburu nọchiri anya ya? (Ezik. 48:16-18) N’ọhụụ ahụ, Jehova gwara Ezikiel, sị: “Obodo unu . . . ga-abụ nke ndị Izrel niile.” (Ezik. 45:6, 7) N’ihi ya, obodo ndị Izrel na ala ndị gbara ya gburugburu esoghị ‘n’ala ahụ dị nsọ’ a “ga-enye Jehova.” (Ezik. 48:9, 20) Ka anyị buru ihe a n’obi leba anya n’ihe obodo a na-akụziri anyị taa.

      6 Ka anyị buru ụzọ mata ihe obodo a na-abụghị. Ọ ga-enyere anyị aka ịmata ihe obodo a na-akụziri anyị. Obodo a enweghị ike ịbụ Jeruselem a rụzigharịrị arụzi na ụlọ nsọ dị na ya. Maka gịnị? Ọ bụ maka na obodo Ezikiel hụrụ n’ọhụụ agaghị enwe ụlọ nsọ. Ihe ọzọ bụ na obodo a abụghị obodo ọ bụla n’ime obodo ndị ahụ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta gara biri n’Izrel. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na e nweghị obodo ndị ahụ ma ọ bụ ụmụ ụmụ ha rụrụ nke yiri obodo Ezikiel hụrụ n’ọhụụ. Ihe ọzọ bụkwa na obodo ahụ enweghị ike ịbụ obodo dị n’eluigwe. Maka gịnị? Ọ bụ maka na a rụrụ ya n’ala a kpọrọ “ebe nkịtị” [ma ọ bụ, ebe na-adịghị nsọ]. Ala a kpọrọ “ebe nkịtị” na-adị iche n’ala a rụrụ ụlọ ndị e wepụtara maka ife Chineke.—Ezik. 42:20.

      7. Gịnị bụ obodo ahụ Ezkikel hụrụ n’ọhụụ, gịnịkwa ka ọ ga-abụ na ọ nọchiri anya ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

      7 Gịnịzi bụ obodo ahụ Ezikiel hụrụ? Cheta na ọ bụ n’otu ọhụụ ọ hụrụ ala ahụ ka ọ hụkwara obodo ahụ. (Ezik. 40:2; 45:1, 6) Baịbụl gosiri na ala ahụ abụghị ala nkịtị. N’ihi ya, obodo ahụ abụghịkwa obodo nkịtị. Gịnị ka ndị mmadụ na-aghọtakarị ma ha nụ okwu bụ́ “obodo”? Ihe ha na-aghọtakarị bụ ndị a haziri ahazi bikọrọ ọnụ. N’ihi ya, o yiri ka obodo ahụ a haziri nke ọma Ezikiel hụrụ n’ọhụụ, nke nwere akụkụ anọ há nhata, nọchiri anya “obodo” a haziri nke ọma ebe ndị nlekọta si na-enye ntụziaka.

      Otú obodo aha ya bụ ‘Jehova Nọ Ebe Ahụ’ dị ma e si n’elu na-ele ya.

      8. Ebee ka ọchịchị obobo a ma ọ bụ ntụziaka si na ya ga na-eru? Gịnị mere o ji bụrụ otú ahụ?

      8 Ebee ka ọchịchị obobo a ma ọ bụ ntụziaka si na ya ga na-eru? Ọhụụ Ezikiel hụrụ gosiri na ọ bụ n’ala ndị na-efe Chineke ezigbo ofufe ka e nwere obodo a. N’ihi ya, “obodo” a na-ahụ maka ihe dị iche iche ndị Chineke na-eme taa. Ọ̀ kwa i chetara na obodo a dị n’ebe nkịtị ma ọ bụ n’ebe na-adịghị nsọ? Gịnị ka ọ na-echetara anyị? Ọ na-echetara anyị na obodo a adịghị n’eluigwe, kama ọ dị n’ụwa. N’obodo a, a na-arụ ọrụ na-abara ndị niile na-efe Chineke ezigbo ofufe uru.

      9. (a) Olee ndị so ‘n’obodo’ a dị n’ụwa taa? (b) Gịnị ka Jizọs ga-eme mgbe ọ ga-achịwa otu puku afọ?

      9 Olee ndị so ‘n’obodo’ a dị n’ụwa? N’ọhụụ Ezikiel hụrụ, a kpọrọ onye na-ahụ maka ihe a na-eme n’obodo ahụ “onyeisi.” (Ezik. 45:7) Ọ bụ ya na-elekọta ndị obodo ya, ma ọ bụghị onye nchụàjà ma ọ bụ onye Livaị. Onyeisi a na-eme ka anyị cheta ndị okenye ọgbakọ ndị na-esoghị ná ndị e tere mmanụ. Ndị okenye a, bụ́ ndị na-azụ ndị Chineke, ndị sokwa n’atụrụ ọzọ, dị umeala n’obi. Ha na-ejekwara ọchịchị Kraịst nke si n’eluigwe na-achị ozi. (Jọn 10:16) Mgbe Jizọs ga-achịwa otu puku afọ, ọ ga-ahọpụta ndị okenye ruru eru ma ọ bụ “ndị isi” “n’ụwa niile.” (Ọma 45:16) Alaeze Chineke ga na-enye ha ntụziaka, ha ana-elekọta ndị Chineke mgbe Jizọs ga-achịwa otu puku afọ.

      “Jehova Nọ Ebe Ahụ”

      10. Gịnị bụ aha obodo ahụ? Oleekwa otú aha a si eme ka obi sie ndị Chineke ike?

      10 Gụọ Ezikiel 48:35. Aha obodo ahụ bụ “Jehova Nọ Ebe Ahụ.” Aha a na-eme ka obi sie ndị Chineke ike na Jehova ga-anọnyere ha n’obodo ahụ. Mgbe Jehova gosiri Ezikiel obodo a dị n’etiti ala ndị Chineke, ihe ọ na-agwa ndị ahụ a dọọrọ n’agha bụ na ọ ga-anọnyere ha ọzọ. Ihe a na-emesi obi ike.

      11. Gịnị na gịnị ka obodo ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na ezigbo ihe aha obodo ahụ pụtara na-akụziri anyị?

      11 Gịnị ka amụma Ezikiel a na-akụziri anyị? Aha obodo a na-eme ka obi sie ndị na-efe Jehova taa ike na ọ na-anọnyere ndị niile na-erubere ya isi n’ụwa ugbu a, ọ ga-anọnyekwara ha ruo mgbe ebighị ebi. E nwekwara ezigbo ihe ọzọ aha a na-akụziri anyị. Ọ na-akụziri anyị na ihe mere e ji nwee obodo a abụghị ka e mee ụfọdụ ndị ndị isi, kama ọ bụ ka a hụ na a na-eme ihe otú kwesịrị ekwesị, otú Jehova, Onye hụrụ anyị n’anya, chọrọ. Dị ka ihe atụ, Jehova enyeghị ndị nlekọta ahụ ikike ikere ndị ya ala otú dị mmadụ efu mma. Kama, Jehova na-atụ anya ka ha kwanyere otú yanwa si keere ndị mmadụ ala ùgwù, ya bụ, ọrụ o nyere onye ọ bụla na-efe ya, ma ndị “ọ na-enweghị ka ọ hà” ha.—Ilu 19:17; Ezik. 46:18; 48:29.

      12. (a) Olee ihe mere ka obodo a pụọ iche? Gịnị ka ọ na-egosi? (b) Gịnị bụ ihe dị mkpa ọhụụ a na-echetara ndị okenye ọgbakọ?

      12 Olee ihe ọzọ mere ka obodo a aha ya bụ “Jehova Nọ Ebe Ahụ” pụọ iche? N’oge ochie, obodo dị iche iche na-enwe mgbidi gburugburu ma nwee ọnụ ụzọ ámá ole na ole. Ma, obodo a nwere ọnụ ụzọ ámá iri na abụọ. (Ezik. 48:30-34) Otú ọnụ ụzọ ámá ya si dị ọtụtụ (atọ n’akụkụ ya nke ọ bụla) na-egosi na ndị na-elekọta obodo a ga-anọ ya mgbe ọ bụla ndị na-efe Chineke chọrọ ịhụ ha, ọ gaghịkwa esiri ndị Chineke ike ịbịakwute ha. Ihe ọzọ bụ na ọnụ ụzọ ámá iri na abụọ a na-egosi na onye ọ bụla, ma ọ bụ “ndị Izrel niile,” nwere ike isi na ha bata. (Ezik. 45:6) Otú o si adị mfe ịbata n’obodo a na-echetara ndị okenye ọgbakọ otu ihe dị mkpa. Ọ na-echetara ha na Jehova chọrọ ka ha mee ka ọ na-adịrị ndị niile bi n’ala ndị Chineke mfe ịbịakwute ha na ịgwa ha okwu nakwa ka ha dị njikere mgbe niile inyere ha aka.

      Ebe otu okenye na ụmụaka na-akparịta ụka n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ya ana-ele ihe ha sere n’akwụkwọ.

      Ọ na-adịrị ndị na-efe Jehova mfe ịbịakwute ndị okenye, ha na-adịkwa njikere inyere ụmụnna ha aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

      Ndị Chineke ‘Na-abata Ife’ Ya ma “Na-ejere Obodo Ozi”

      13. Gịnị ka Jehova kwuru gbasara ọrụ dị iche iche ndị ya ga na-arụ?

      13 Ka anyị gaghachi n’oge Ezikiel ma chọpụta ihe ndị ọzọ o dere gbasara ala ọ hụrụ n’ọhụụ a ga-ekere ndị Chineke. N’ọhụụ ahụ, Jehova kwuru gbasara ọrụ dị iche iche ndị ya ga na-arụ. Ndị nchụàjà na ndị Livaị ga “na-eje ozi n’ụlọ nsọ.” Ma, ndị nchụàjà ga na-achụ àjà, na-abịakwa n’ihu Jehova ijere ya ozi. Ndị Livaị ga na-ahụ “maka ozi niile a ga na-eje na ya nakwa ihe niile a ga na-eme na ya.” (Ezik. 44:14-16; 45:4, 5) A ga-enwekwa ndị ga na-arụ ọrụ n’ebe dị nso n’obodo ahụ. Ole ndị ka ha bụ?

      14. Olee ihe ndị ga na-arụ ọrụ n’ebe dị nso n’obodo ahụ na-echetara anyị?

      14 Ndị ga na-arụ ọrụ n’ebe dị nso n’obodo ahụ ga-esi “n’ebo niile n’Izrel.” Ha ga na-enyere ndị ọzọ na-arụ ọrụ aka. Ọrụ ha bụ ịkụ mkpụrụ ndị ga na-emepụta ihe “ndị na-ejere obodo ozi ga na-eri.” (Ezik. 48:18, 19) Ọ̀ bụ na ihe a anaghị echetara anyị ọrụ anyị na-arụ taa? Ee. Taa, ndị niile na-efe Chineke ezigbo ofufe nwere ike ịkwado ọrụ ụmụnna Kraịst, bụ́ ndị e tere mmanụ, na-arụ nakwa ọrụ ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ,’ ndị Jehova họpụtara ka ha na-edu ndị ya, na-arụ. (Mkpu. 7:9, 10) Otu ụzọ kachanụ anyị si akwado ha bụ iji obi anyị niile na-eso ntụziaka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-enye anyị.

      15, 16. (a) Olee ihe ndị ọzọ anyị na-amụta n’ọhụụ ahụ Ezikiel hụrụ? (b) Olee ọrụ ndị anyị nwere ike ịrụ yiri ndị nke a rụrụ n’ọhụụ Ezikiel hụrụ?

      15 E nwere ihe ọzọ e kwuru n’ọhụụ Ezikiel hụrụ nke anyị ga-amụta ihe na ya gbasara ozi anyị. Gịnị bụ ihe ahụ? Jehova kwuru na ndị si n’ebo iri na abụọ, bụ́ ndị na-esoghị n’ebo Livaị, ga na-arụ ọrụ n’ebe abụọ, ya bụ, n’ogige ụlọ nsọ nakwa n’ebe a na-akọ ihe n’obodo ahụ. Gịnị ka ha ga na-arụ n’ebe nke ọ bụla? Ebo niile ‘ga na-abata ife Chineke’ n’ogige ụlọ nsọ ahụ. Otú ha si eme ya bụ ịchụrụ Jehova àjà dị iche iche. (Ezik. 46:9, 24) Ndị sikwa n’ebo niile na-abịa akwado obodo ahụ. Otú ha si eme ya bụ ịkụ mkpụrụ n’ebe a na-akọ ihe n’obodo ahụ. Gịnị ka anyị na-amụta n’aka ndị ọrụ a?

      16 Taa, ndị so n’oké ìgwè mmadụ nwere ike ịrụ ọrụ ndị yiri ndị nke a rụrụ n’ọhụụ Ezikiel hụrụ. Ha na-efe Jehova “n’ụlọ nsọ ya.” Otú ha si eme ya bụ ịchụrụ ya “àjà otuto.” (Hib. 13:15; Mkpu. 7:9-15) Ha na-achụ àjà a mgbe ha na-ekwusa ozi ọma na mgbe ha na-aza ajụjụ ma na-abụ abụ n’ọmụmụ ihe, si otú a na-egosi na ha nwere okwukwe. Ha ghọtara na otú a ha si efe Jehova bụ ihe kacha mkpa ha kwesịrị ịna-eme. (1 Ihe 16:29) Ọtụtụ ndị na-efe Chineke nwekwara ụzọ ndị ọzọ ha si akwado nzukọ Chineke. Dị ka ihe atụ, ha na-eso arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na alaka ụlọ ọrụ ma na-arụzi ihe ndị mebiri emebi na ha. Ha na-esokwa arụ ọrụ ndị ọzọ nzukọ Jehova na-arụ. Ndị ọzọ na-eji ego ha na-enye n’onyinye akwado ọrụ ndị a. E nwere ike ịsị na ha niile na-akụ mkpụrụ n’ala “ka e too Chineke.” (1 Kọr. 10:31) Ha ji ọṅụ na-arụ ọrụ ha, ọ na-anụkwa ha ọkụ n’obi ịrụ ya, n’ihi na ha ma na “ụdị àjà ndị a na-adị Chineke ezigbo mma.” (Hib. 13:16) Ì ji obi gị niile na-akwado ọrụ a?

      Ebe ndị mmadụ bu ọka ma na-azụ ehi na atụrụ n’ebe dị nso n’obodo aha ya bụ ‘Jehova Nọ Ebe Ahụ.’

      Gịnị na gịnị ka anyị mụtara n’ihe dị iche iche Ezikiel kwuru a na-eme n’ọnụ ụzọ àmà nakwa n’ebe dị ha nso? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14-16)

      “E Nwere Eluigwe Ọhụrụ na Ụwa Ọhụrụ O Kwere ná Nkwa Anyị Na-atụ Anya Ha”

      17. (a) Olee otú ọhụụ Ezikiel hụrụ ga-esi emezu n’ọdịnihu karịa otú o mezuburu? (b) Mgbe Jizọs ga-achịwa otu puku afọ, ole ndị ka obodo ahụ ga-abara uru?

      17 Ọhụụ Ezikiel hụrụ ala a ga-ewepụta iche ọ̀ ga-emezu n’ọdịnihu karịa otú o mezuburu? Ee. Chebagodịrị ihe a echiche: Ezikiel hụrụ na ala a kpọrọ ‘ala dị nsọ’ dị n’etiti ala e keere ndị Chineke. (Ezik. 48:10) A lụchaa agha Amagedọn, Jehova ga-anọnyekwara anyị n’agbanyeghị ebe anyị ga-ebi n’ụwa. (Mkpu. 21:3) Mgbe Jizọs ga-achịwa otu puku afọ, obodo ahụ, ya bụ, ndị a ga-ahọpụta n’ụwa ka ha na-elekọta ndị Chineke, ga na-enyekwuru ndị Chineke aka n’ụwa niile. Otú ha ga-esi eme ya bụ na ha ga na-eduzi mmadụ niile so ‘n’ụwa ọhụrụ,’ ya bụ, ndị ezi omume, ma na-enye ha ntụziaka otú gosiri na ha hụrụ ha n’anya.—2 Pet. 3:13.

      18. (a) Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na ntụziaka si n’obodo ahụ ga na-adaba n’ihe ọchịchị Chineke chọrọ? (b) Olee otú aha obodo ahụ si eme ka obi sie anyị ike?

      18 Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na ntụziaka si n’obodo ahụ ga na-adaba n’ihe ọchịchị Chineke chọrọ? Ọ bụ n’ihi na Okwu Chineke mere ka o doo anya na obodo ahụ dị n’ụwa, nke nwere ọnụ ụzọ àmà iri na abụọ, yiri obodo dị n’eluigwe nke nwekwara ọnụ ụzọ àmà iri na abụọ. Aha obodo a bụ Jeruselem Ọhụru, ya bụ, otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000) ha na Kraịst ga-eso chịa. (Mkpu. 21:2, 12, 21-27) Ihe a na-egosi na mkpebi obodo ahụ dị n’ụwa ga na-eme ga-adaba n’ihe Alaeze Chineke nke si n’eluigwe na-achị kpebiri, ha ga-ahụkwa na e mere ihe ndị e kpebiri otú kwesịrị ekwesị. N’eziokwu, aha obodo ahụ, nke bụ́ “Jehova Nọ Ebe Ahụ,” na-eme ka obi sie onye ọ bụla n’ime anyị ike na a ga-anọgide na-efe Chineke ezigbo ofufe, na-efekwa ya ruo mgbe ebighị ebi na paradaịs. Ọ bụ ezigbote ihe ọma ga-emere anyị n’ọdịnihu.

      GỊNỊ KA Ị MỤTARA GBASARA IFE CHINEKE EZIGBO OFUFE?

      1. Gịnị ka ala a ga-ewepụta iche Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na-akụziri anyị gbasara ihe kwesịrị ịka anyị mkpa n’ihe niile anyị na-eme?

      2. Olee otú i nwere ike isi na-akwado ọrụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-arụ?

      3. Olee ihe ndị i weere ka ihe kacha mkpa i kwesịrị ịna-eme?

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya