Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w10 4/1 p. 3
  • Nwoke nke Gbanwere Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nwoke nke Gbanwere Ụwa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ịga nke Ọma na Ọdịda Ndị E Nwere n’Ịlụso Ọrịa Ọgụ
    Teta!—2004
  • Michael Faraday—Ọkà Mmụta Sayensị na Nwoke Okwukwe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Akwụkwọ A Kasị Ekesa n’Ụwa
    Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile
  • Jehova Na-eduzi Ozi Ọma Anyị Na-ekwusa n’Ụwa Niile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
w10 4/1 p. 3

Nwoke nke Gbanwere Ụwa

Ọtụtụ ijeri mmadụ ebiela ndụ n’ụwa a ma nwụọ. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha emeghị ihe ọ bụla a ga-eji na-echeta ha. Ma, ole na ole n’ime ha mere ihe metụtara ndụ ndị mmadụ—ikekwe, ihe na-emetụta ndụ gị kwa ụbọchị.

KA E were ya na i biliri n’ụtụtụ, na-akwadebe ije ọrụ. Gị agbanye ọkụ ka ị na-ejikere. Gị ewere akwụkwọ ma ọ bụ magazin ị ga-agụ n’ime bọs. Gị echeta ọgwụ dọkịta deere gị ka ị na-aṅụ maka ọrịa gị. Ihe a ka bụ ụtụtụ, ma i ritela uru n’ihe mmadụ ole na ole a ma ama mepụtara.

Maịkel Faradee Ọ bụ onye Ingland a a mụrụ n’afọ 1791, bụ́ ọkà n’ihe ọmụmụ fiziks, mepụtara ígwè ndị na-enye ọkụ eletrik. Ihe ndị o mepụtara so mee ka ndị mmadụ na-enwetakwu ọkụ eletrik.

Saị Lun E kwuru na ọ bụ Saị Lun, bụ́ onye rụrụ ọrụ n’obí eze ndị Chaịna, chepụtara otú e si emepụta akwụkwọ n’ihe dị ka afọ 105 O.A. (Oge Anyị), bụ́ nke mere ka e mepụtawa akwụkwọ n’ebe o buru ibu.

Yohanis Gutinbag N’ihe dị ka afọ 1450, onye Jamanị a mepụtara ígwè obibi akwụkwọ mbụ a na-edogharị mkpụrụ akwụkwọ ya edogharị. Ígwè obibi akwụkwọ ahụ mere ka ibi akwụkwọ dị ọnụ ala, bụ́ nke mere ka e bipụtawa ọtụtụ akwụkwọ n’isiokwu dị iche iche.

Alegzanda Flemịn N’afọ 1928, onye Skọtland a na-eme nnyocha mepụtara ọgwụ nje a na-akpọ penisilin. A na-ejizi ọgwụ nje a na ndị ọzọ agwọ ọrịa n’ebe niile.

O doro anya na ihe mmadụ ole na ole chọpụtara ma ọ bụ mepụta abaarala ọtụtụ ijeri mmadụ uru ma ọ bụ mee ka ahụ́ gbasikwuo ha ike.

Ma, e nwere otu nwoke mere ihe karịrị ihe ha niile mere. Ihe e ji mara ya abụghị ihe ọ chọpụtara na nkà mmụta sayensị ma ọ bụ ọgwụ o mepụtara. Kama nke ahụ, nwoke a nke si n’ezinụlọ dara ogbenye, bụ́ onye nwụrụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga, kwusara ozi a ka na-ekwusa taa—ozi na-akpa ike nke na-enye olileanya ma na-akasi obi. Ọ bụrụ na a tụlee otú ozi ya sirila metụta ndụ ndị mmadụ gburugburu ụwa, ọtụtụ ndị ga-ekweta na nwoke a gbanwere ụwa n’ezie.

Nwoke ahụ bụ Jizọs Kraịst. Olee ozi o kwusara? Oleekwa otú ozi ahụ nwere ike isi metụta ndụ gị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya