Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp16 nke 4 p. 4
  • Otú Baịbụl Si Ghara Irekasị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Baịbụl Si Ghara Irekasị
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ̀ Dị Anyị Mkpa n’Ezie Inweta Ndị Mbụ Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Olee Otú Akwụkwọ Ahụ Si Lanarị?
    Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile
  • Baịbụl—Akụkọ Dị Ịtụnanya nke Otú O Si Dịruo n’Oge Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Mbọ A Gbara Ịgbanwe Ihe Dị na Baịbụl Kụrụ Afọ n’Ala
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
wp16 nke 4 p. 4

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE OTÚ BAỊBỤL SI DỊGIDE?

Otú Baịbụl Si Ghara Irekasị

NSOGBU E NWERE: Ndị mbụ dere Baịbụl na ndị ji aka depụtaghachi ya n’oge ochie ji papaịrọs na akpụkpọ anụ e ji ede ihe dee ha.a (2 Timoti 4:13) Olee otú ihe ndị a ha ji dee Baịbụl si mee ka o sie ike ichekwa Baịbụl?

Papaịrọs anaghị ara ahụ́ adọwa. Ọ na-achagharị ma na-emebi ngwa ngwa. Richard Parkinson na Stephen Quirke, bụ́ ndị ọkachamara na-amụ gbasara Ijipt oge ochie, kwuru na “papaịrọs nwere ike iji nwayọọ nwayọọ gbarie ma ghọọ ntụ. A pịakọtachaakwa ha, dowe ha n’ebe jụrụ oyi, ha na-ebido mawa ebu ma ọ bụ rekasịwa.” Ha sịkwara na “òké ma ọ bụ ahụhụ ndị ọzọ nwere ike ịta ha ma e lie ha n’ala.” Mgbe a chọtara ụfọdụ papaịrọs, e dowere ha n’ebe anwụ ma ọ bụ mmiri mere ka ha mebie ngwa ngwa.

Akpụkpọ anụ e ji ede ihe na-anọte aka karịa papaịrọs. Ma ọ na-emebikwa ma ọ bụrụ na e jizighị ya ejizi ma ọ bụ dowe ya n’ebe dị́ mmiri mmiri ma ọ bụ n’anwụ.b Ụmụ ahụhụ na-atakwa ya. Ọ bụ ya mere na ọtụtụ akwụkwọ ndị e nwere n’oge ochie adịghịzi taa. Á sị na Baịbụl rekasịrị, anyị agaraghị amata ihe e dere na ya.

OTÚ BAỊBỤL SI DỊGIDE: N’oge ochie, Chineke nyere ndị Juu iwu na onye ọ bụla e chiri eze “ga-edepụtara onwe ya” akwụkwọ ise mbụ dị́ na Baịbụl. (Diuterọnọmi 17:18) Ka ọ na-erukwala n’oge ndịozi Jizọs, ndị ọkachamara n’idepụta ihe ejirila ọtụtụ akwụkwọ mpịakọta depụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ, nke mere e ji nwee Akwụkwọ Nsọ n’ụlọ nzukọ dị iche iche n’Izrel nakwa n’obodo Masedonia dị́ anya ma e si Izrel gawa ya. (Luk 4:16, 17; Ọrụ Ndịozi 17:11) Olee otú e si chekwaa ụfọdụ akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ ha adịrị ruo taa?

1. Ite ụrọ; 2. Otu n’ime iberibe Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ

Ọtụtụ Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ dịgidere ruo ọtụtụ narị afọ n’ihi na e tinyere ha n’ite ụrọ ma dowe ha n’ime ọgba n’ọzara

Otu ọgba a hụrụ ụfọdụ akwụkwọ mpịakọta Baịbụl n’ime ya

Otu ọkachamara aha ya bụ Philip W. Comfort, onye na-amụ gbasara Agba Ọhụrụ, kwuru na “ndị Juu na-etinyekarị akwụkwọ mpịakọta n’ime ite ụrọ ka ọ ghara imebi.” Ọ ga-abụ na Ndị Kraịst nọ́ n’oge ahụ mewekwara otu ihe ahụ. Ọ bụ ya mere e ji hụ ụfọdụ akwụkwọ mpịakọta Baịbụl n’ime ite ụrọ dị iche iche, nakwa n’ebe gbara itiri a na-edowe ákwà, n’ọgba nakwa n’ọzara.

URU Ọ BARA: E nwere ọtụtụ puku akwụkwọ mpịakọta Baịbụl ka dịnụ taa. Ụfọdụ n’ime ha adịwala kemgbe ihe karịrị puku afọ abụọ. O nweghị akwụkwọ mpịakọta ọzọ dịrurula afọ ole a a ka nwere ọtụtụ n’ime ha otú a.

a Papaịrọs bụ ụdị akwụkwọ e ji ahịhịa papaịrọs na-eto n’akụkụ mmiri mee.

b Dị ka ihe atụ, e ji akpụkpọ anụ e ji ede ihe dee ihe ndị Amerịka kwekọrịtara mgbe ha ghọrọ mba kwụụrụ onwe ya. O rubeghị narị afọ abụọ na iri ise kemgbe e dere ya, ma o mebiela nke na ọ na-esizi ike ịhụ ihe e dere na ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya