Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp16 nke 5 p. 16
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị bụ Alaeze Chineke?
  • Olee mgbe Alaeze Chineke ga-abịa?
  • Alaeze Chineke
    Teta!—2013
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
  • È Nwere Ọchịchị Ga-akwụsi Ike Ga-achị Ụwa Anyị A?—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Eziokwu Banyere Alaeze Chineke
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
wp16 nke 5 p. 16
Ebe ìhè si n’ocheze dị n’eluigwe na-enwukwasị ụwa

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Gịnị bụ Alaeze Chineke?

ỤFỌDỤ NDỊ NA-EKWU na ọ bụ ihe dị mmadụ n’obi; ndị ọzọ ana-ekwu na ọ bụrụ na ụmụ mmadụ emee ka udo dịrị n’ụwa, mmadụ na ibe ya adịrịkwa ná mma, na alaeze abịala. Gịnị ka i chere?

IHE BAỊBỤL KWURU

“Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị. . . . Ọ ga-egwepịa alaeze ndị a niile [ụmụ mmadụ hiwere].” (Daniel 2:44) Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị.

IHE ỌZỌ ANYỊ GA-AMỤTA NA BAỊBỤL

  • Alaeze Chineke ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa.—Matiu 10:7; Luk 10:9.

  • Chineke ga-eji Alaeze ya mezuo uche ya n’eluigwe nakwa n’ụwa.—Matiu 6:10.

Olee mgbe Alaeze Chineke ga-abịa?

OLEE IHE Ị GA-AZA?

  • O nweghị onye ma

  • N’oge na-adịghị anya

  • Echeghị m na ọ ga-abịa

IHE BAỊBỤL KWURU

“A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) E kwusachahaala ozi ọma otú Chineke chọrọ, Alaeze Chineke ga-abịa bibie ụwa ọjọọ a.

IHE ỌZỌ ANYỊ GA-AMỤTA NA BAỊBỤL

  • O nweghị onye ma kpọmkwem mgbe Alaeze Chineke ga-abịa.—Matiu 24:36.

  • Amụma ndị dị na Baịbụl na-egosi na Alaeze Chineke ga-abịa n’oge na-adịghị anya.—Matiu 24:3, 7, 12.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ isi nke 8 n’akwụkwọ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya

I nwekwara ike inweta ya na www.jw.org/ig

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya