Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite n’Ọktoba 29, 2012. Ụbọchị e denyere n’akara ngebichi bụ izu a ga-eme ihe omume e si na ya nweta ajụjụ ahụ. E denyere ya ka i nwee ike mee nchọnchọ n’izu ahụ a ga-amụ ya.
1. Olee ihe ebe ịchụàjà ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ nọchiri anya ya? (Ezik. 43:13-20) [Sep. 10, w07 8/1 p. 10 para. 4]
2. Gịnị ka mmiri nke osimiri ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ nọchiri anya ya? (Ezik. 47:1-5) [Sep. 17, w07 8/1 p. 11 para. 2]
3. Na Daniel 1:8, e kwuru na Daniel “kpebisiri ike n’obi ya” na ya agaghị eri nri eze. Olee ihe okwu ahụ na-eme ka anyị mata banyere ihe a kụziiri ya mgbe ọ dị obere? [Sep. 24, dp p. 33 para. 7-9; p. 36 para. 16]
4. Gịnị ka osisi ahụ gbara agba Nebukadneza hụrụ ná nrọ ya nọchiri anya ya? (Dan. 4:10, 11, 20-22) [Ọkt. 1, w07 9/1 p. 18 para. 5]
5. A bịa n’ikpe ekpere, gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta na Daniel 9:17-19? [Ọkt. 8, w07 9/1 p. 20 para. 5-6]
6. Olee ọgbụgba ndụ e mere ka ọ “dịrị irè maka ọtụtụ ndị” ruo ngwụcha izu nke izu iri asaa ahụ ma ọ bụkwanụ afọ 36 O.A.? (Dan. 9:27) [Ọkt. 8, w07 9/1 p. 20 para. 4]
7. Na Daniel 10:13, mmụọ ozi gwara Daniel na “onyeisi alaeze Peshia” nọchiiri ya ụzọ. Gịnị ka ihe a o kwuru mere ka anyị mata? [Ọkt. 15, w11 9/1 p. 8 para. 1-2]
8. Olee amụma e buru gbasara Mesaya na Daniel 11:20 nke mechara mezuo? [Ọkt. 15, dp p. 232-233 para. 5-6]
9. Dị ka Hosia 4:11 si kwuo, olee ihe ụfọdụ mere na ọ dịghị mma ịṅụ oké mmanya? [Ọkt. 22, w10 1/1 p. 4-5]
10. Olee ihe dị mkpa anyị kwesịrị ịmụta na Hosia 6:6? [Ọkt. 22, w07 9/15 p. 16 para. 8; w05 11/15 p. 24 para. 11-12]