Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na n’Ọktoba 29
IZU NA-AMALITE N’ỌKTOBA 29
Abụ nke 13 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 28 ¶16-22 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Hosia 8-14 (Nkeji 10)
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (Nkeji 20)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 15: “Otú Ị Ga-esi Erite Uru n’Ìgwè Ozi Ubi Ị Nọ.” Ajụjụ na azịza. Mgbe unu na-atụle ihe e kwuru n’igbe dị na peeji nke 6, jiri nkeji ole na ole gbaa nwanna a na-anọ n’ụlọ ya enwe nzukọ ozi ubi ajụjụ ọnụ. Jụọ ya ihe ọ na-eme iji hụ na ụlọ ya dị mma ka a nọrọ ya nwee nzukọ ozi ubi n’izu ọ bụla. Jụọkwa ya ihe mere obi ji atọ ya ụtọ na a na-anọ n’ụlọ ya enwe nzukọ ozi ubi.
Nkeji 15: “Ihe Ise Ga-enyere Anyị Aka Inweta Ndị Anyị na Ha Ga Na-amụ Baịbụl.” Ajụjụ na azịza. Unu tụlechaa paragraf nke 6, jụọ ndị nwere ndị ha na-amụrụ Baịbụl ihe ndị na-eme ha obi ụtọ.
Abụ nke 122 na Ekpere