Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị, Olee Otú M Ga-esi Emete Ezigbo Ndị Enyi?
Jehova kere ụmụ mmadụ otú ha na ibe ha ga-abụ enyi ma na-emekọrịta ihe. (Ilu 18:1, 24) Ọ bụrụ na anyị chọrọ imete ezigbo ndị enyi, ọ bụghị onye ọ bụla anyị hụrụ, anyị na ya abụrụ enyi. (Ilu 13:20) Ọ bụrụ na mmadụ abụọ bụ́ enyi ahụ Chineke n’anya, ha ga-adị n’ezigbo mma. Ilu 17:17 kwuru, sị: “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.” Ọ bụrụ na mmadụ abụọ bụ́ ezigbo enyi enwee nghọtahie, ha anaghị eche echiche ime ibe ha ihe ọjọọ. Olee otú anyị ga-esi emete ezigbo ndị enyi?
Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị anyị na ha na-akpachi anya nwere ike ịkụziri anyị ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ilezi anya ka anyị ghara imete ndị ọjọọ enyi. Ọ bụrụ na anyị na ndị enyi Jehova bụ enyi, ọ bụrụkwa na ọ bụ ndị Jehova hụrụ n’anya ka anyị hụrụ n’anya, ndị anyị na ha ga na-akpa agaghị akụziri anyị ihe ọjọọ. Ihe anyị mụtara n’aka ha ga-enyere anyị aka ịna-eme ihe Jehova chọrọ. N’ihi ya, ka ndị ga-abụ ndị enyi anyị bụrụ ndị ga-enyere anyị aka ịbụ enyi Chineke.—Ọma 15:1, 4; Aịza. 41:8.