Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp22 nke 1 p. 6-7
  • 1 | Elela Mmadụ Anya n’Ihu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 1 | Elela Mmadụ Anya n’Ihu
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl Kwuru:
  • Ihe Ọ Pụtara:
  • Ihe I Nwere Ike Ime:
  • Taịtọs—“Onye Mụ na Ya Na-arụkọrọ Unu Ọrụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • 3 | Wepụ Ịkpọasị n’Obi Gị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ihe Ị Ga-eme Ka Ị Kwụsị Ịkpọ Ndị Ọzọ Asị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
wp22 nke 1 p. 6-7
Ebe otu nwoke onye isi ojii na-ele foto onye ọcha na-amụmụ ọnụ ọchị, nakwa ebe otu nwoke onye ọcha na-ele foto onye isi ojii na-amụmụ ọnụ ọchị. Foto ndị dị n’azụ ha bụ foto ndị iwe ji.

IHE Ị GA-EME KA Ị KWỤSỊ ỊKPỌ NDỊ ỌZỌ ASỊ

1 | Elela Mmadụ Anya N’ihu

Ihe Baịbụl Kwuru:

“Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Kama ná mba ọ bụla, ọ na-anabata onye na-atụ egwu ya, nke na-emekwa ihe dị mma.”​—ỌRỤ NDỊOZI 10:​34, 35.

Ihe Ọ Pụtara:

Jehovaa Chineke anaghị eji obodo anyị, agbụrụ anyị, otú anyị na-acha ma ọ bụkwanụ omenala anyị ekpebi ụdị mmadụ anyị bụ. Kama, ihe ka ya mkpa bụ otú anyị si eche echiche na ihe ndị na-agụ anyị agụụ. N’eziokwu, “mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ, ma Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.”​—1 Samuel 16:7.

Ihe I Nwere Ike Ime:

Anyị enweghị ike ịmata ihe dị mmadụ n’obi. Ma, anyị nwere ike ịgbalị na-eme ka Jehova ma ghara ịna-ele ndị mmadụ anya n’ihu. Gbalịa ka ị mata mmadụ nke ọma kama iwere ya otú ndị ọzọ si ewere ndị obodo ha. Ị chọpụta na ị na-ele ndị mmadụ anya ọjọọ, ma eleghị anya, n’ihi na ha si n’agbụrụ ọzọ ma ọ bụkwanụ n’obodo ọzọ, rịọ Chineke ka o nyere gị aka ịkwụsị ya. (Abụ Ọma 139:​23, 24) I jiri obi gị niile rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka ị ghara ile mmadụ anya n’ihu, obi kwesịrị isi gị ike na ọ ga-anụ ekpere gị ma nyere gị aka.​—1 Pita 3:12.

a Jehova bụ ezigbo aha Chineke.​—Abụ Ọma 83:18.

“Mụ na onye ọcha anọtụbeghị ọdụ kwurịta okwu n’udo . . . Ugbu a, eso m n’ezigbo ụmụnna nọ n’ụwa dum.”​—TITUS

Akụkọ Mere Eme​—TITUS

Ọ Kwụsịrị Ịkpọ Ndị Ọzọ Asị

Titus.

N’ebe Titus bi, e tiri iwu ụfọdụ na-akwado ịkpa ókè. Iwu ndị ahụ na-ewe ya ezigbo iwe nke na ọ banyere n’òtù tigbuo zọgbuo iwu ndị ahụ na-ewekwa iwe. Ọ sịrị: “Anyị na-aga n’ebe a na-anaghị ekwe ka ndị isi ojii bata n’obodo ahụ, dị ka n’ụlọ oriri na n’ụlọ mmanya, naanị iji kpasuo ọgụ.” Titus sịrị na ihe mere ya ji soro ha na-eme ya bụ n’ihi na ọ kpọrọ ndị ọcha asị. Ọ sịkwara: “Mgbe ọ bụla mụ na mmadụ sewere okwu, ma ọ̀ bụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ọ bụ m na-ebu ụzọ akụ ihe.”

Titus malitere ịgbanwe mgbe ya na Ndịàmà Jehova mụwara Baịbụl. Mgbe ọ gụrụ Baịbụl, ihe ọ gụtara mere ka ọ gbanwee otú o si eche echiche. Ihe kacha metụ ya n’obi bụ nkwa e kwere na Baịbụl na n’ime ụwa ọhụrụ Chineke, “ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị.”​—Mkpughe 21:​3, 4.

Na mbụ, o siiri Titus ike iwepụ ịkpọasị n’obi ya. Ọ sịrị: “O siiri m ezigbo ike ịgbanwe otú m si eche echiche na otú m si eme omume.” Ma, ihe ọ mụtara n’Ọrụ Ndịozi 10:​34, 35 nyeere ya aka. Ebe ahụ kwuru na Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu.

Olee uru ihe ọ mụtara baara ya? Ọ sịrị: “Ọ bịara doo m anya na okpukpe Ndịàmà Jehova bụ ezi okpukpe mgbe m hụrụ otú ha si ahụrịta ibe ha n’anya, n’agbanyeghị agbụrụ ha na ụcha akpụkpọ ahụ́ ha. Tupu mụ aghọọdị Onyeàmà Jehova e mere baptizim, otu onye ọcha anyị na ya nọ n’ọgbakọ kpọrọ m ka m bịa n’ụlọ ya rie ihe. Ọ dị m ka ọ̀ bụ ná nrọ. Mụ na onye ọcha anọtụbeghị ọdụ kwurịta okwu n’udo, ka ọ fọkwa ịga n’ụlọ ya rie ihe. Ugbu a, eso m n’ezigbo ụmụnna nọ n’ụwa dum.”

Gụkwuo gbasara Titus n’Ụlọ Nche nke Ọgọst 1, 2009, peeji nke 28 na nke 29.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya