Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp22 nke 1 p. 10-11
  • 3 | Wepụ Ịkpọasị n’Obi Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 3 | Wepụ Ịkpọasị n’Obi Gị
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl Kwuru:
  • Ihe Ọ Pụtara:
  • Ihe I Nwere Ike Ime:
  • “Chineke Meere Stivin Amara, Nyekwa Ya Ike”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • A Tụọ Stivin Nkume
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ihe Ị Ga-eme Ka Ị Kwụsị Ịkpọ Ndị Ọzọ Asị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
  • Anyị Ga-akwụsịli Ịkpọ Ndị Ọzọ Asị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
wp22 nke 1 p. 10-11
Ebe otu nwoke na-eche otú ọ ga-adị ma ya na onye agbụrụ ọzọ kwe n’aka. Onyinyo ha na-egosi ebe ha ji ihe ndị ha ji eme ngagharị iwe na-esesa ibe ha okwu.

IHE Ị GA-EME KA Ị KWỤSỊ ỊKPỌ NDỊ ỌZỌ ASỊ

3 | Wepụ Ịkpọasị n’Obi Gị

Ihe Baịbụl Kwuru:

“Gbanweenụ ụdị mmadụ unu bụ. Otú unu ga-esi eme ya bụ ịgbanwe otú unu si eche echiche, ka unu wee chọpụta ihe bụ́ uche Chineke, nke dị mma, nke zuru okè, nke na-emekwa ya obi ụtọ.”​—NDỊ ROM 12:2.

Ihe Ọ Pụtara:

Ihe ndị anyị na-eche n’echiche gbasara Chineke. (Jeremaya 17:10) O doro anya na anyị ekwesịghị ikwu ma ọ bụ ime ihe gosiri na anyị kpọrọ ndị ọzọ asị. Ma, e nwere ihe ọzọ anyị kwesịrị ime. Ebe ọ bụ ihe dị mmadụ n’obi na ihe ndị ọ na-eche n’echiche na-eme ka ọ kpọọ ndị ọzọ asị, ọ dị mkpa ka anyị wepụ ihe ọ bụla nwere ike ime ka anyị kpọọ ndị ọzọ asị n’obi anyị, kwụsịkwa iche banyere ya. Ọ bụ mgbe anyị mere ya ka à ga-asị na anyị ‘agbanweela ụdị mmadụ anyị bụ’ ma kwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị.

Ihe I Nwere Ike Ime:

Chebara onwe gị ezigbo echiche ka ị mata otú i si ele ndị ọzọ anya, karịchaa, ndị gị na ha na-esighị n’otu obodo. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú m si were ha? Ihe mere m ji were ha otú ahụ ọ̀ bụ maka ihe doro m anya m ma gbasara ha? Ka ọ̀ bụ maka na ihe ha anaghị amasị m?’ Elekwala ma ọ bụ gụọ ihe ndị nwere ike ime ka ị kpọọ ndị mmadụ asị ma ọ bụkwanụ mee ka ị kwado tigbuo zọgbuo. Zerekwa ịga n’ebe ndị mmadụ na-ekwurịta ihe ndị nwere ike ime ka ị kpọọ ndị ọzọ asị n’Ịntanet.

Okwu Chineke nwere ike inyere anyị aka ịkwụsị ịkpọ ndị mmadụ asị n’obi anyị.

Ọ naghị adịchara anyị mfe ịgwa onwe anyị eziokwu ma anyị leruwe ihe ndị anyị na-eche n’echiche anya. Ma, Okwu Chineke ga-enyeliri anyị aka ‘ịchọpụta ihe anyị na-eche na ihe anyị bu n’obi.’ (Ndị Hibru 4:12) N’ihi ya, na-amụ Baịbụl. Jiri ihe ndị ị na-amụta na ya na-eleru otú i si eche echiche anya. Gbalịakwa ka ị gbanwee otú i si eche echiche ka ọ daba n’ihe Baịbụl kwuru. Ọ bụrụ na ịkpọasị “gbanyesiri mgbọrọgwụ ike” n’obi anyị, Okwu Chineke nwere ike inyere anyị aka ịkwụsị ya.​—2 Ndị Kọrịnt 10:​4, 5.

Akụkọ Mere Eme​—STEPHEN

Ọ Gbanwere Otú O Si Eche Echiche

Stephen.

Stephen na ndị ezinụlọ ya tara ahụhụ n’ihi na ndị ọcha kpọrọ ndị isi ojii asị n’obodo ha. E nwere òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-agba mbọ ka ndị mmadụ nweta ihe ruuru ha. Ihe ha na-eme bidoro masịwa Stephen. E nwedịrị oge ndị yanwa so mesie ndị mmadụ ike n’ihi na ọ kpọrọ ha asị. Stephen sịrị: “E nwere otu ụbọchị mụ na ndị enyi m gara ebe a na-ele fim, e tinye fim gosiri otú e si taa ndị Afrịka ahụhụ mgbe ha gbara ohu n’Amerịka, iwe eju anyị obi, anyị ebido kụwa ụmụ ndị ọcha sokwa na-ele fim ahụ ihe. Mgbe anyị si ebe ahụ pụọ, anyị gawara ebe ndị ọcha bi, na-achọ ndị ọzọ anyị ga-akụ ihe.”

Stephen gbanwere otú o si eche echiche kpamkpam mgbe ya na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. Ọ sịrị: “Ebe ọ bụ na m kpọrọ agbụrụ ọzọ asị, na-ahụkwa ọtụtụ ndị ọzọ dị ka m, ihe m hụrụ n’ebe Ndịàmà Jehova nọ tụrụ m n’anya. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe otu nwoke onye ọcha bụ́ Onyeàmà Jehova chọrọ ịga ihe ná mba ọzọ, ya agwa otu ezinụlọ Ndịàmà Jehova ibe ya bụ́ ndị isi ojii ka ha lekọtara ya ụmụ ya. E nwekwara mgbe otu nwa okorobịa onye isi ojii na-achọ ebe ọ ga-ebi, otu ezinụlọ bụ́ ndị ọcha agwa ya ka ọ bịa ka ha na ya biri.” Ọ bịara doo Stephen anya na ọ bụ Ndịàmà Jehova bụ ndị hụrụ ibe ha n’anya ka ụmụnne otú ahụ Jizọs kwuru na ezigbo Ndị Kraịst ga na-eme.​—Jọn 13:35.

Gịnị mere Stephen ji kwụsị ime tigbuo zọgbuo na ịkpọ ndị ọzọ asị? Ihe e dere ná Ndị Rom 12:2 nyeere ya aka. Stephen sịrị: “M mụtara na Baịbụl na m kwesịrị ịgbanwe otú m si ele ndị agbụrụ ọzọ anya. M chọpụtara na m kwesịrị ịgbalị ka mụ na ndị ọzọ na-adị n’udo nakwa na ọ bụ ihe bara uru m kwesịrị iji ndụ m na-eme.” Kemgbe ihe karịrị afọ iri anọ ugbu a, ndụ Stephen na-atọ ya ụtọ n’ihi na ọ kwụsịla ịkpọ ndị ọzọ asị.

Gụkwuo gbasara Stephen n’Ụlọ Nche nke Julaị 1, 2015, peeji nke 10 na nke 11.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya