Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp22 nke 1 p. 12-13
  • 4 | Chineke Ga-enyere Gị Aka Ịkwụsị Ịkpọ Ndị Mmadụ Asị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 4 | Chineke Ga-enyere Gị Aka Ịkwụsị Ịkpọ Ndị Mmadụ Asị
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl Kwuru:
  • Ihe Ọ Pụtara:
  • Ihe I Nwere Ike Ime:
  • Baịbụl Na-Agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ihe Ị Ga-eme Ka Ị Kwụsị Ịkpọ Ndị Ọzọ Asị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
  • Anyị Ga-akwụsịli Ịkpọ Ndị Ọzọ Asị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
  • Gịnị Mere Ọtụtụ Ndị Ji Akpọ Ibe Ha Asị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
wp22 nke 1 p. 12-13
Ebe ndị mmadụ na-aga n’ebe e dosara Baịbụl. Baịbụl ahụ na-enye ha ìhè. Onyinyo ha na-egosi na ha na-akpọbu ndị mmadụ asị.

IHE Ị GA-EME KA Ị KWỤSỊ ỊKPỌ NDỊ ỌZỌ ASỊ

4 | Chineke Ga-enyere Gị Aka Ịkwụsị Ịkpọ Ndị Mmadụ Asị

Ihe Baịbụl Kwuru:

“Mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ndidi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, mmadụ ijide onwe ya.”​—NDỊ GALESHIA 5:22, 23.

Ihe Ọ Pụtara:

Chineke ga-enyeliri mmadụ aka ịkwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị. Mmụọ nsọ ya ga-enyere anyị aka ịmụta àgwà ndị anyị na-agaghị enwe ike ịkpa n’onwe anyị. N’ihi ya, kama ịgbalịwa ka anyị kwụsị ịkpọ ndị mmadụ asị n’onwe anyị, anyị kwesịrị ịtụkwasị Chineke obi ka o nyere anyị aka ịkwụsị ya. Anyị mee ya, anyị ga-adị ka Pọl onyeozi, onye sịrị: “N’ihe niile, onye ahụ nke na-eme ka m dị ike na-enye m ike.” (Ndị Filipaị 4:13) N’eziokwu, anyị ga-enwe ike ịsị: “Ọ bụ Jehova . . . ga-enyere m aka.”​—Abụ Ọma 121:2.

Ihe I Nwere Ike Ime:

“Jehova enyerela m aka, mụ akwụsị ime ihe ike ma ghọọ onye na-eme udo.”​—WALDO

Jiri obi gị niile rịọ Jehova n’ekpere ka o nye gị mmụọ nsọ ya. (Luk 11:13) Rịọ ya ka o nyere gị aka ịna-akpa àgwà ndị na-amasị ya. Mụọ ihe Baịbụl kwuru gbasara àgwà ndị na-eme ka mmadụ kwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị, àgwà ndị dị ka, ịhụnanya, udo, ndidi, na mmadụ ijide onwe ya. Gbalịakwa ka ị na-akpa àgwà ndị ahụ. Gị na ndị na-agbalị ịkpa àgwà ndị a na-akpakwa. Ha nwere ike inyere gị aka ‘ịna-ahụ ndị ọzọ n’anya ma na-arụ ezigbo ọrụ.’​—Ndị Hibru 10:24.

Akụkọ Mere Eme​—WALDO

Ọ Kwụsịrị Ime Tigbuo Zọgbuo na Ịkpọ Ndị Mmadụ Asị

Waldo.

Ihe ndị mere ná ndụ Waldo mgbe ọ na-etolite na ụdị ebe ọ nọ too mere ka ọ na-akpọ ndị mmadụ asị. Ọ sịrị: “Mụ na ndị na-ere ọgwụ ọjọọ na-alụkarị ọgụ n’okporo ámá. . . . O nwere mgbe ndị òtù ọjọọ, bụ́ ndị anyị na ha na-adịghị ná mma, kwụrụ otu onye akpụ obi a ma ama ụgwọ ka o gbuo m. Mgbe ọ bịara igbu m, ọ mara m mma, mụ erie mbọ mbọ.”

Obi adịghị Waldo mma mgbe Ndịàmà Jehova bidoro ịmụrụ nwunye ya Baịbụl. Ọ sịrị: “Anaghị m achọ iji anya ahụ Ndịàmà Jehova. Ọtụtụ mgbe, m na-akpọ ha iyi. Ma, ebe ọ bụ na ha abụghị ndị okwu na ụka, ha na-eji olu ọma agwa m okwu.”

Waldo mechara bido ịmụ Baịbụl. Ọ sịrị: “Ọ dịrịghị m mfe ime ihe m na-amụta. M chekwara na mụ emekataghị kwụsị iwe iwe ọkụ.” Ma, ihe ọ mụtara na Baịbụl nyeere ya aka ịgbanwe.

Waldo sịrị: “Otu ụbọchị, Alejandro, bụ́ onye na-​akụziri m Baịbụl, gwara m ka m gụọ Ndị Galeshia 5:​22, 23. . . . Alejandro gwara m na ihe ga-eme ka m mụta àgwà ndị ahụ bụ mmụọ nsọ Chineke, ọ bụghị ike nke onwe m. Ihe a ọ gwara m mere ka m gbanwee otú m si ele ihe anya.”

Waldo kwụsịrị ịkpọ ndị ọzọ asị n’ihi na ọ tụkwasịrị Chineke obi na ọ ga-enyere ya aka. Ọ sịrị: “O juru ndị mụ na ha na-akpabu na ndị ikwu m anya na ndụ m agbanweela.” Ọ sịkwara: “Jehova enyerela m aka, mụ akwụsị ime ihe ike ma ghọọ onye na-eme udo.”

Gụkwuo gbasara Waldo n’Ụlọ Nche nke Ọktoba 1, 2013, peeji nke 12 na nke 13.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya