Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp22 nke 1 p. 8-9
  • 2 | Emegwarala Ihe E Mere Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 2 | Emegwarala Ihe E Mere Gị
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl Kwuru:
  • Ihe Ọ Pụtara:
  • Ihe I Nwere Ike Ime:
  • Gịnị Ka I Kwesịrị Ime Mgbe E Mejọrọ Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • M Na-ewebu Iwe Ọkụ, Na-alụkwa Ọgụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Ịbọ Ọ́bọ̀ Ọ̀ Dị Njọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Anyị Ga-akwụsịli Ịkpọ Ndị Ọzọ Asị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
wp22 nke 1 p. 8-9
Ebe ụmụ nwoke abụọ iwe ji nọ n’alaka osisi chere ibe ha ihu. Onye nke ọ bụla n’ime ha na-akwọbi alaka osisi ọ nọ ọdụ na ya.

IHE Ị GA-EME KA Ị KWỤSỊ ỊKPỌ NDỊ ỌZỌ ASỊ

2 | Emegwarala Ihe E mere Gị

Ihe Baịbụl Kwuru:

“Unu ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ. . . . Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụkwa unu ka ọ dị n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo. . . . Unu abọrọla onwe unu ọbọ, . . . n’ihi na e dere, sị: ‘“Ọ bụ m ga-abọ ọbọ. M ga-akwụ ụgwọ.” Ọ bụ ihe Jehova kwuru.’”​—NDỊ ROM 12:​17-19.

Ihe Ọ Pụtara:

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ na-ewute anyị ma mmadụ mejọọ anyị. Ma, Chineke achọghị ka anyị na-emegwara ndị ọzọ ihe ha mere anyị. Kama, ọ chọrọ ka anyị nwee ndidi n’ihi na o kwere anyị nkwa na ọ ga-eme ka ihe niile dị mma n’oge na-adịghị anya.​—Abụ Ọma 37:​7, 10.

Ihe I Nwere Ike Ime:

Ọ bụrụ na ndị mmadụ emegwara ihe ọjọọ e mere ha, ọ na-eme ka ha kpọkwuo ibe ha asị. N’ihi ya, mmadụ mee gị ihe ọjọọ ma ọ bụ kpasuo gị iwe, emegwarala ya. Gbalịa jide onwe gị ma jiri nwayọọ meso ya. Mgbe ụfọdụ, ihe nwere ike ịkacha mma ime bụ ichefu ihe ahụ merenụ. (Ilu 19:11) Ma, o nwere ike ịka mma mgbe ụfọdụ ka i wega okwu ahụ n’aka ndị ga-elebara ya anya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na e mere gị ihe ọjọọ ndị uwe ojii ma ọ bụkwanụ ndị ọzọ na-ahụ maka iwu nwere ike ilebara anya, i nwere ike ikpebi ịkọrọ ha ya.

Ihe na-aka njọ ma mmadụ megwara ihe e mere ya

Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na o yie ka o nweghị otú a ga-esi edozi nsogbu ahụ n’udo, ma ọ bụkwanụ na i meela ihe niile i nwere ike ime ka e dozie okwu ahụ n’udo? Emegwarala. Ọ bụrụ na i megwara, o nwere ike ime ka ihe ka njọ. Ma, ọ bụrụ na i megwaraghị, o nwere ike ime ka unu ghara ịkpọ ibe unu asị. Gbalịa ka ị tụkwasị Jehova obi na ihe o kwuru gbasara otú e si edozi esemokwu kacha mma. Baịbụl sịrị: “Tụkwasị ya obi. Ọ ga-enyere gị aka.”​—Abụ Ọma 37:​3-5.

Akụkọ Mere Eme​—ADRIÁN

Ọ Kwụsịrị Ịna-achọ Ka O Megwara

Adrián.

Mgbe Adrián dị ihe dị ka afọ iri na atọ, ọ na-akpọ ndị mmadụ asị, na-emegwakwara ihe ọ bụla e mere ya. Ọ sịrị: “M na-ejikarị égbè alụ ọgụ. O nwekwara mgbe ụfọdụ a na-akụ m ọ̀ dị ndụ ọnwụ ka mma, ahụ́ m niile abụrụ ọbara ọbara, a hapụ m n’okporo ámá.”

Adrián malitere ịmụ Baịbụl mgbe ọ dị afọ iri na isii. Ọ sịrị: “Ka m nọ na-amụ Baịbụl, achọpụtara m na o nwere àgwà m ụfọdụ m kwesịrị ịgbanwe.” Ọ chọpụtara na o kwesịrị ịkwụsị ịkpọ ndị mmadụ asị, kwụsịkwa ịlụ ọgụ. Ihe Baịbụl kwuru ná Ndị Rom 12:​17-19 ka anyị ghara imegwara ndị ọzọ baara ya ezigbo uru. Ọ sịrị: “M bịara ghọta na Jehova ga-eme ka ihe ọjọọ kwụsị n’oge ọ chọrọ nakwa otú o si chọọ ya. M jizi nwayọọ nwayọọ, kwụsị ịlụ ọgụ.”

Otu mgbede, ụfọdụ ụmụ okorobịa bịara chọwa Adrián okwu. Ha na ndị òtù Adrián nọbu na-ese okwu. Onyeisi ha bịara kụọ Adrián ihe sị ya, “Ngwa, kụgwara m!” Adrián sịrị: “Ọ nọ na-enu m enu ka m kụgwara ya.” Ma, kama ịkụgwara ya, o kpere ekpere n’obi ya ozugbo sizie ebe ahụ pụọ.

Adrián sịkwara: “N’echi ya, m hụrụ onyeisi ha ahụ ka naanị ya so. Iwe eju m obi, mụ achọwa imegwara ya. Ma, m kpeere Jehova ekpere ọzọ ka o nyere m aka ijide onwe m. Ihe m na-atụghị anya ya meziri. Onyeisi ha ahụ bịakwutere m, sị m: ‘Biko ewela iwe maka ihe ahụ m mere gị ná mgbede ụnyaahụ. Ị̀ ma na m na-achọ otú m ga-esi adị ka gị? M chọrọ ịmụ Baịbụl.’ Obi tọrọ m ezigbo ụtọ na m gbalịrị jide onwe m. E bidoziri mụwara ya Baịbụl.”

Gụkwuo gbasara Adrián n’Ụlọ Nche nke 5 nke afọ 2016, peeji nke 14 na nke 15.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya