Ilu
3 Ọ bụ nzuzu mmadụ na-ezuzu na-eme ka ọ na-eme ihe na-adịghị mma,
Ya ewesawazie Jehova oké iwe.
4 Akụnụba na-eme ka mmadụ nwee ọtụtụ ndị enyi,
Ma ndị mmadụ ga-agbara ogbenye ọsọ, enyi ya ga-agbadịrị ya ọsọ.+
6 Ọtụtụ ndị na-achọ ka ha na onye a ma ama* dịrị ná mma,
Mmadụ niile na-emetakwa onye na-enye onyinye enyi.
7 Ndị niile bụ́ ụmụnne onye dara ogbenye kpọrọ ya asị.+
Ndị enyi ya na-agbadịrị ya ọsọ.+
Ọ na-arịọ ha arịrịọ, ma e nweghị onye na-atụpụrụ ya ọnụ.
8 Onye na-agbalị ka ọ mara ihe* ji ndụ ya kpọrọ ihe.+
Ihe ga-agaziri onye ọ bụla na-agbalị ka ọ ghọta ihe.+
11 Ọ bụrụ na mmadụ aghọta ihe, ọ gaghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+
A ga-ajakwa ya mma ma o leghara ihe ọjọọ e mere ya anya.+
12 Eze wee iwe, iwe ya na-adị ka ebe ọdụm na-agbọ ụja,+
Ma amara ya na-adị ka igirigi nke dara n’elu ahịhịa.
13 Nwa nzuzu na-akpatara nna ya nsogbu.+
Nwaanyị nke na-esekarị okwu yiri elu ụlọ nke na-ehi mmiri mgbe niile.+
16 Onye na-edebe iwu ga-adị ndụ.+
Onye na-anaghị echebara otú o si ebi ndụ echiche ga-anwụ.+
17 Onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe ọma na-agbazinye Jehova ihe,+
Ọ ga-akwụkwa onye ahụ ụgwọ ihe ọ na-eme.+
19 Onye na-ewe iwe ọkụ ga-ata ahụhụ iwe ọkụ ya.
Ọ bụrụ na ị gbalịa napụta ya, ị ka ga-eme ya ugboro ugboro.+
22 Ọ bụ ịhụ ndị ọzọ n’anya na-eme ka mmadụ bụrụ ezigbo mmadụ.+
Ọ ka mma na mmadụ bụ ogbenye karịa na mmadụ bụ onye ụgha.
23 Ịtụ egwu Jehova na-eme ka mmadụ dị ndụ.+
Obi ga-eru onye na-atụ egwu ya ala, e nweghịkwa ihe ọ bụla ga-eme ya.+
25 Tie onye na-akwa emo ihe+ ka onye na-amaghị ihe mara ihe,+
Baakwara onye na-aghọta ihe mba ka ọ mụtakwuo ihe.+
26 Nwa nke na-emesi nna ya ike, nke na-achụpụkwa nne ya,
Na-emenye mmadụ ihere, na-emechukwa mmadụ ihu.+
27 Nwa m, ọ bụrụ na ị kwụsị ịnabata aka ná ntị a na-adọ gị,
Ọ ga-eme ka ị kwụsị ime ihe ndị dị mma ị mụtara.