IHE NDỊ E JI ONYINYE I NYERE EME
Obere Igbe E Ji Enweta Akwụkwọ na Vidio Ndị E Ji Akụzi Baịbụl
SEPTEMBA 1, 2020
Ndịàmà Jehova na-esi n’Ịntanet enwetakwu vidio ndị e ji akụzi Baịbụl na akwụkwọ ugbu a karịa na mbụ. Ma, n’ọtụtụ mba, ụmụnna anyị enweghị ego ha ga-eji aga n’Ịntanet. E nwekwara ndị nke bi n’ebe netwọk na-enye nsogbu na n’ebe ndị a na-enweghị netwọk chaa chaa.
Ma ugbu a, ọtụtụ ụmụnna anyị na-adanlodu akwụkwọ na vidio anyị na-agaghịdị n’Ịntanet. Olee otú o si kwe omume?
Ọ bụ obere igbe a na-akpọ JW Box mere ka o kwe omume. E zigaara ya ọgbakọ dị iche iche dị n’ebe netwọk na-anachaghị adị. Igbe a nwere ihe a na-akpọ waịfaị a zụrụ n’aka otu ụlọ ọrụ, nwee ihe ngalaba dị na Betel na-ahụ maka kọmputa rụnyere na ya, nweekwa akwụkwọ anyị na vidio anyị ndị dị na jw.org. Otu igbe a na-ada ihe dị ka ₦28,600.
Ụmụnna anyị bịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ha ejiri ekwentị ha nweta waịfaị ahụ e tinyere na JW Box ma jiri ya danloduo akwụkwọ anyị na vidio anyị. Ndị na-enweghịdị ekwentị ndị ọgbara ọhụrụ ma ọ bụ ndị na-adịghị oké ọnụ na-ejikwa nke ha nwere enweta ya. Ma, oleekwanụ ihe a na-eme ka ọgbakọ ndị dị n’ebe a na-enweghị Ịntanet nwee ike ịna-enweta akwụkwọ na vidio ndị ọhụrụ na JW Box? Ọ na-abụ alaka ụlọ ọrụ gụrụ gụrụ, ha etinye ihe ọhụrụ ndị gbara na jw.org n’obere ihe a na-akpọ flash ma zigara ya ọgbakọ ndị ahụ. Otu flash na-ada ihe dị ka ₦1,500. Ha na-akwụnyezi ya na JW Box ka ihe ọhụrụ ndị e tinyere na ya bata na JW Box.
Olee uru JW Box baarala ụmụnna anyị? Otu nwoke Kongo Kinshasa aha ya bụ Nathan Adruandra sịrị: “O teela m gbalịwara ka m danloduo vidio aha ya bụ ‘Jehova, . . . Ọ Bụ Gị Ka M Tụkwasịrị Obi’ na nke aha ya bụ Cheta Nwunye Lọt. Ma, o kwebeghị m. O mekwara ka obi na-ajọ m njọ. Ma, JW Box enyerela m aka ịdanlodu ha n’ekwentị m. Mụ na nwunye m na-ejizi ha akụzikwuru ụmụ anyị ihe.”
Otu nwanna nwoke nke na-enyere ọgbakọ ndị dị na Naịjirịa aka ime ka JW Box ha rụwa ọrụ sịrị: “Ụmụnna anyị weere JW Box ka onyinye pụrụ iche Jehova nyere ha. Obi na-atọgbu ha atọgbu na ha nweziri ike ịga n’ebe e tinyere ihe ndị anyị ji akụziri ndị mmadụ ihe danloduo akwụkwọ anyị na vidio anyị.”
E zigarala ụmụnna ndị nọ n’Afrịka, na Saụt Amerịka, nakwa ná Mba Ndị Dị n’Oké Osimiri Pasifik ihe karịrị otu puku JW Box na narị asaa. A na-ahazikwa izigara ya ọtụtụ ọgbakọ ndị ọzọ. Olee ebe e si enweta ego e ji eme ihe a niile? Ọ bụ n’onyinye e ji akwado ọrụ anyị na-arụ n’ụwa niile. Ọtụtụ ndị na-esikwa na donate.jw.org enye ya. I meela maka onyinye ị na-enye.