1 Ihe E Mere
25 Devid na ndị isi+ nke ìgwè dị iche iche ndị na-eje ozi+ wepụtakwara ụfọdụ n’ime ụmụ Esaf, ụmụ Himan+ na ụmụ Jedutọn,+ iche maka ije ozi, bụ́ ndị na-eji une+ na ụbọ akwara+ na ájà ebu amụma.+ E sikwa n’ime ha nweta ndị e nyere ọrụ ije ozi ha. 2 N’ụmụ Esaf, e wepụtara Zakọ na Josef+ na Netanaya na Asharila,+ bụ́ ụmụ Esaf+ ndị nọ n’okpuru Esaf bụ́ onye na-ebu amụma site ná ntụziaka eze. 3 N’ụmụ Jedutọn:+ e wepụtara ụmụ Jedutọn, bụ́ Gedalaya+ na Ziraị+ na Jesheya,+ nakwa Shimiaị, na Hashabaya na Matitaya,+ mmadụ isii, bụ́ ndị nọ n’okpuru nna ha bụ́ Jedutọn, onye na-eji ụbọ akwara ebu amụma maka ikele Jehova ekele na inye ya otuto.+ 4 N’ụmụ Himan:+ e wepụtara ụmụ Himan, bụ́ Bọkaya,+ Matanaya,+ Ọziel,+ Shebuel na Jerimọt, Hananaya,+ Hanenaị, Elayata,+ Gidaltaị+ na Romamtaị-iza,+ Jọshbekasha,+ Malotaị,+ Hotia,+ Maheziọt. 5 Ndị a niile bụ ụmụ Himan, onye na-ahụrụ eze ọhụụ+ n’ihe metụtara ezi Chineke, onye na-eweli mpi ya iji too Chineke; ezi Chineke wee nye Himan ụmụ nwoke iri na anọ na ụmụ nwaanyị atọ.+ 6 Ndị a niile nọ n’okpuru nna ha n’iji ájà+ na ụbọ akwara+ na une+ na-abụ abụ n’ụlọ Jehova maka ozi a na-eje n’ụlọ ezi Chineke.
Esaf na Jedutọn na Himan+ na-enweta ntụziaka site n’aka eze.
7 Ọnụ ọgụgụ ha na ụmụnne ha bụ́ ndị a zụrụ azụ ịbụrụ Jehova abụ+ dị narị mmadụ abụọ na iri asatọ na asatọ, ha niile bụ ndị ọkà.+ 8 Ha wee fee nza+ banyere ihe ndị ha ga na-arụ, ma onye ukwu ma onye nta,+ ma onye bụ́ ọkà+ ma onye ka na-amụ amụ.
9 Nza ahụ wee ma ha: nke mbụ, bụ́ nke Esaf, mara Josef,+ nke abụọ mara Gedalaya+ (ya na ụmụnne ya na ụmụ ya dị mmadụ iri na abụọ); 10 nke atọ mara Zakọ,+ ụmụ ya na ụmụnne ya dị mmadụ iri na abụọ; 11 nke anọ mara Izraị,+ ụmụ ya na ụmụnne ya dị mmadụ iri na abụọ; 12 nke ise mara Netanaya,+ ụmụ ya na ụmụnne ya dị mmadụ iri na abụọ; 13 nke isii mara Bọkaya, ụmụ ya na ụmụnne ya dị mmadụ iri na abụọ; 14 nke asaa mara Jesharila,+ ụmụ ya na ụmụnne ya dị mmadụ iri na abụọ; 15 nke asatọ mara Jesheya, ụmụ ya na ụmụnne ya dị mmadụ iri na abụọ; 16 nke itoolu mara Matanaya, ụmụ ya na ụmụnne ya dị mmadụ iri na abụọ; 17 nke iri mara Shimiaị, ụmụ ya na ụmụnne ya dị mmadụ iri na abụọ; 18 nke iri na otu mara Azarel,+ ụmụ ya na ụmụnne ya dị mmadụ iri na abụọ; 19 nke iri na abụọ mara Hashabaya, ụmụ ya na ụmụnne ya dị mmadụ iri na abụọ; 20 nke iri na atọ mara Shubael,+ ụmụ ya na ụmụnne ya dị mmadụ iri na abụọ; 21 nke iri na anọ mara Matitaya, ụmụ ya na ụmụnne ya dị mmadụ iri na abụọ; 22 nke iri na ise mara Jeremọt, ụmụ ya na ụmụnne ya dị mmadụ iri na abụọ; 23 nke iri na isii mara Hananaya, ụmụ ya na ụmụnne ya dị mmadụ iri na abụọ; 24 nke iri na asaa mara Jọshbekasha, ụmụ ya na ụmụnne ya dị mmadụ iri na abụọ; 25 nke iri na asatọ mara Hanenaị, ụmụ ya na ụmụnne ya dị mmadụ iri na abụọ; 26 nke iri na itoolu mara Malotaị, ụmụ ya na ụmụnne ya dị mmadụ iri na abụọ; 27 nke iri abụọ mara Elayata, ụmụ ya na ụmụnne ya dị mmadụ iri na abụọ; 28 nke iri abụọ na otu mara Hotia, ụmụ ya na ụmụnne ya dị mmadụ iri na abụọ; 29 nke iri abụọ na abụọ mara Gidaltaị, ụmụ ya na ụmụnne ya dị mmadụ iri na abụọ; 30 nke iri abụọ na atọ mara Maheziọt,+ ụmụ ya na ụmụnne ya dị mmadụ iri na abụọ; 31 nke iri abụọ na anọ mara Romamtaị-iza,+ ụmụ ya na ụmụnne ya dị mmadụ iri na abụọ.