Abụ Ọma 114 Mgbe Izrel si n’Ijipt pụọ,+Mgbe ụlọ Jekọb sikwa n’etiti ndị na-ekwu ihe a na-adịghị aghọta aghọta pụọ,+ 2 Juda ghọrọ ebe nsọ ya,+Izrel ghọkwara ọmarịcha ala ọ na-achị.+ 3 Oké osimiri hụrụ ya gbaa ọsọ;+Jọdan malitere ịgbaghachi azụ.+ 4 Ugwu ukwu wụliri elu dị ka ebule,+Ugwu nta wụlikwara elu dị ka ụmụ atụrụ. 5 Oké osimiri, gịnị mere gị, i ji gbaa ọsọ,+Jọdan, gịnị mere gị, i ji malite ịgbaghachi azụ?+ 6 Ugwu ukwu, gịnị mere unu, unu ji wụlie elu dị ka ebule;+Ugwu nta, gịnị mere unu, unu ji wụlie elu dị ka ụmụ atụrụ?+ 7 Ụwa, nọrọ n’oké ihe mgbu n’ihi Onyenwe anyị,+N’ihi Chineke Jekọb, 8 Bụ́ onye na-eme ka oké nkume ghọọ ọdọ mmiri nke ahịhịa amị jupụtara,+Na-emekwa ka oké nkume siri ike ghọọ isi mmiri.+