18 Ugwu Saịnaị dum wee na-akwụ anwụrụ ọkụ,+ n’ihi na Jehova ji ọkụ gbadata na ya;+ anwụrụ ọkụ si na ya wee na-akwụgo dị ka anwụrụ ọkụ si n’ekwú ọkụ,+ ugwu ahụ dum nọkwa na-ama jijiji nke ukwuu.+
18 Mmadụ niile nọ na-anụ ụda égbè eluigwe na ụda opi ahụ, na-ahụkwa àmụ̀mà na-egbunụ nakwa ka ugwu ahụ na-akwụ anwụrụ. Mgbe ha hụrụ ya, ha mara jijiji ma guzoro n’ebe dịtụ anya.+