Abụ Ọma Abụ Nrịgo. 123 Gị ka m weliri anya m lekwasị,+Gị onye bi n’eluigwe.+ 2 Lee! Dị ka ndị na-eje ozi na-ele nna ha ukwu anya n’aka,+Dị ka nwaanyị na-eje ozi na-ele nne ya ukwu anya n’aka,+Otú ahụ ka anya anyị dị n’ebe Jehova Chineke anyị nọ+Ruo mgbe o meere anyị amara.+ 3 Meere anyị amara, Jehova, biko, meere anyị amara;+N’ihi na nlelị ezuwo anyị ahụ́.+ 4 Ịkwa emo nke ndị tụsaara ahụ́ ezuwo mkpụrụ obi anyị ahụ́,+Tinyere nlelị nke ndị mpako.+