97 Jehova aghọwo eze!+ Ka ụwa ṅụrịa ọṅụ.+
Ka agwaetiti niile ṅụrịa ọṅụ.+
2 Ígwé ojii na oké ọchịchịrị gbara ya gburugburu;+
Ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala nke ocheeze ya.+
3 Ọkụ na-aga n’ihu ya,+
Ọ na-erepịakwa ndị niile na-emegide ya, bụ́ ndị gbara ya gburugburu.+
4 Àmụ̀mà ya mere ka ìhè dị n’elu ala;+
Ụwa hụrụ ya wee nọrọ n’oké ihe mgbu.+
5 Ugwu dị iche iche gbazekwara dị ka mgbá aṅụ n’ihi Jehova,+
N’ihi Onyenwe ụwa dum.+
6 Eluigwe ekwupụtawo ezi omume ya,+
Ndị niile dị iche iche ahụwokwa ebube ya.+
7 Ka ihere mee ndị niile na-efe ihe oyiyi ọ bụla a pịrị apị ofufe,+
Ndị ji chi na-abaghị uru na-anya isi.+
Kpọọrọnụ ya isiala, unu chi niile.+
8 Jehova, Zayọn nụrụ mmeri i nwere wee malite ịṅụrị ọṅụ,+
Obodo nta ndị dị na Juda malitekwara inwe obi ụtọ,+
N’ihi mkpebi ikpe gị.+
9 N’ihi na gị onwe gị, Jehova, bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile;+
Ị rịgowo n’ebe dị nnọọ elu wee karịa chi niile ọzọ.+
10 Unu ndị hụrụ Jehova n’anya,+ kpọọnụ ihe ọjọọ asị.+
Ọ na-eche mkpụrụ obi nke ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ nche;+
Ọ na-anapụta ha n’aka ndị ajọ omume.+
11 Ìhè enwuworo onye ezi omume,+
Ịṅụrị ọṅụ abịawokwara ndị obi ha ziri ezi.+
12 Ṅụrịanụ ọṅụ n’ime Jehova, unu ndị ezi omume,+
Nyenụ aha nsọ ya ekele.+