26“‘Unu emerela onwe unu chi na-abaghị uru,+ unu eguzobekwarala onwe unu ihe oyiyi a pịrị apị+ ma ọ bụ ogidi nsọ, unu edebela nkume a tụrụ ihe oyiyi na ya+ n’ala unu ka unu na-akpọ isiala n’ihu ya;+ n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.
14 Mmadụ niile emewo ihe n’echeghị echiche nke na amaghị ihe ha apụtawo ìhè.+ Ihere ihe oyiyi a pịrị apị ga-eme onye ọ bụla nke na-eji ígwè akpụ ihe;+ n’ihi na ihe oyiyi ya a wụrụ awụ bụ ihe ụgha,+ mmụọ adịghịkwa n’ime ya.+