34 Unu ga-asị, ‘Ndị ohu gị anọwo na-akpa anụ malite n’oge anyị bụ ụmụaka ruo ugbu a, ma anyị onwe anyị ma nna nna anyị hà,’+ ka unu wee biri n’ala Goshen,+ n’ihi na onye ọ bụla na-azụ atụrụ bụụrụ Ijipt ihe arụ.+
26 Ma Mozis sịrị: “Ọ dịghị mma ime otú ahụ, n’ihi na ihe anyị ga-achụrụ Jehova bụ́ Chineke anyị n’àjà bụ ihe arụ n’anya ndị Ijipt.+ Ọ bụrụkwanụ na ihe anyị ga-achụ n’àjà bụ ihe arụ n’anya ndị Ijipt; ọ̀ bụ na ha agaghị atụ anyị nkume?