22 ka m wee site n’aka ha lee Izrel ule,+ ịmata ma hà ga-abụ ndị na-edebe ụzọ Jehova site n’ije ije na ya dị ka ndị nna ha debere ya, ma ọ̀ bụ na ha agaghị abụ.”
8 Gị mmadụ, ọ gwawo gị ihe dị mma.+ Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị ma ọ́ bụghị ime ihe n’ikpe ziri ezi+ na ịhụ obiọma+ n’anya nakwa iji obi umeala+ soro Chineke gị na-eje ije?+
10 ka unu wee na-eje ije n’ụzọ kwesịrị+ Jehova+ iji na-eme ihe na-amasị ya n’ụzọ zuru ezu, ka unu na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ+ ọ bụla ma na-enwekwu ezi ihe ọmụma+ nke Chineke,