Ndị Ikpe 17:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Maịka wee sị ya: “Ka mụ na gị biri, ghọọkwara m nna+ na onye nchụàjà,+ mụ onwe m ga na-akwụ gị mkpụrụ ego ọlaọcha iri n’otu afọ, na-enyekwa gị uwe na ihe oriri.” Onye Livaị ahụ wee banye n’ụlọ ya. Job 29:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 Abụụrụ m ndị ogbenye ezigbo nna;+Okwu ikpe nke onye m na-amaghị—m na-eleba ya anya.+ Abụ Ọma 105:21 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 21 O mere ya nna ukwu nke ezinụlọ ya,+Na onye na-achị ihe niile o nwere,+
10 Maịka wee sị ya: “Ka mụ na gị biri, ghọọkwara m nna+ na onye nchụàjà,+ mụ onwe m ga na-akwụ gị mkpụrụ ego ọlaọcha iri n’otu afọ, na-enyekwa gị uwe na ihe oriri.” Onye Livaị ahụ wee banye n’ụlọ ya.