19 Ma ha sịrị ya: “Mechie ọnụ. Kpuchie aka n’ọnụ gị, soro anyị gaa ka ị ghọọrọ anyị nna+ na onye nchụàjà.+ Olee nke kaara gị mma, ịbụ onye nchụàjà nke ụlọ otu+ onye ka ọ̀ bụ ịbụ onye nchụàjà nke otu ebo na otu ezinụlọ n’Izrel?”+
27 Ma ha buuru ihe ahụ Maịka mere, kpọrọkwa onye nchụàjà+ ahụ nke bụ́ onye nchụàjà ya, ha wee na-aga Leyish,+ ka ha gaa buso ndị nọ jụụ ma tụsara ahụ́ agha.+ Ha wee jiri ihu mma agha+ gbuo ha, gbaakwa obodo ha ọkụ.+