Ndị Ikpe
17 E nwere otu nwoke nke si n’ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu,+ onye aha ya bụ Maịka. 2 Ka oge na-aga, ọ sịrị nne ya: “Otu puku na otu narị mkpụrụ ego ọlaọcha ahụ e zunaara gị, nke m nụrụ mgbe ị na-abụ onye zuru ya ọnụ+—lee! ọ bụ m ji ọlaọcha ahụ. Ọ bụ m weere ya.”+ Nne ya wee sị: “Ka nwa m bụrụ onye Jehova gọziri agọzi.”+ 3 O wee nyeghachi nne ya otu puku na otu narị mkpụrụ ego ọlaọcha ahụ;+ nne ya wee sị: “M ga-eme ka ọlaọcha a bụrụ ihe e doro nsọ nye Jehova maka nwa m, ka e wee jiri ya mee ihe oyiyi a pịrị apị+ nakwa ihe oyiyi a wụrụ awụ;+ m ga-enyeghachikwa gị ya.”
4 O wee nyeghachi nne ya ọlaọcha ahụ, nne ya wee were narị mkpụrụ ego ọlaọcha abụọ nye onye na-eji ọlaọcha akpụ ihe.+ O wee mee ihe oyiyi a pịrị apị+ na ihe oyiyi a wụrụ awụ;+ o wee dịrị n’ụlọ Maịka. 5 Ma nwoke ahụ bụ́ Maịka nwere ụlọ ebe chi ya dị iche iche dị,+ o wee mee efọd+ na terafim+ ma nye otu n’ime ụmụ ya ikike+ ka ọ ghọọrọ ya onye nchụàjà.+ 6 N’oge ahụ, e nweghị eze ọ bụla n’Izrel.+ Onye ọ bụla na-eme ihe dị ya mma.+
7 Ma e nwere otu nwa okorobịa bụ́ onye Betlehem+ nke dị na Juda, onye ezinụlọ Juda, ọ bụkwa onye Livaị.+ O bi n’ebe ahụ nwa mgbe. 8 Nwoke ahụ wee si n’obodo Betlehem nke dị na Juda pụọ ịga biri dị ka ọbịa n’ebe ọ bụla ọ hụrụ ohere. E mesịa, mgbe ọ na-aga, o rutere n’ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu, wee rute n’ụlọ Maịka.+ 9 Maịka wee sị ya: “Olee ebe i si?” O wee sị ya: “Abụ m onye Livaị nke si na Betlehem dị na Juda, m na-aga ka m biri dị ka ọbịa n’ebe ọ bụla m hụrụ ohere.” 10 Maịka wee sị ya: “Ka mụ na gị biri, ghọọkwara m nna+ na onye nchụàjà,+ mụ onwe m ga na-akwụ gị mkpụrụ ego ọlaọcha iri n’otu afọ, na-enyekwa gị uwe na ihe oriri.” Onye Livaị ahụ wee banye n’ụlọ ya. 11 Onye Livaị ahụ wee kpebie ka ya na nwoke ahụ biri, o wee were nwa okorobịa ahụ dị ka otu n’ime ụmụ ya ndị ikom. 12 Maịka nyekwara onye Livaị ahụ ikike,+ ka nwa okorobịa ahụ wee ghọọrọ ya onye nchụàjà+ ma biri n’ụlọ Maịka. 13 Maịka wee sị: “Ugbu a ka m maara na Jehova ga-emere m ihe ọma, n’ihi na onye Livaị a aghọworo m onye nchụàjà.”+