6 E nwere ndị na-awụfusị ọlaedo dị n’akpa, ndị na-eji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ atụ ọlaọcha. Ha na-ego onye na-eji ígwè akpụ ihe, o wee jiri ya kpụọ chi.+ Ha na-adara ya n’ala, ee, ha na-akpọrọ ya isiala.+
9 E si ọbụna Tashish bute ọlaọcha a kụrụ ka ha dị mbadamba,+ sikwa na Yufaz bute ọlaedo,+ bụ́ ndị omenkà na onye na-eji ígwè akpụ ihe kpụrụ; e ji eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo mee ákwà ha. Ha niile bụ ọrụ aka nke ndị nwere nkà.+