4 O wee chịrị ọlaedo ahụ ha chịtara ma jiri ihe e ji akpụ ihe kpụọ ya+ wee mee ka ọ ghọọ ihe oyiyi nwa ehi a wụrụ awụ.+ Ha wee malite ịsị: “Izrel, ihe a bụ Chi gị, nke dupụtara gị n’ala Ijipt.”+
9 E si ọbụna Tashish bute ọlaọcha a kụrụ ka ha dị mbadamba,+ sikwa na Yufaz bute ọlaedo,+ bụ́ ndị omenkà na onye na-eji ígwè akpụ ihe kpụrụ; e ji eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo mee ákwà ha. Ha niile bụ ọrụ aka nke ndị nwere nkà.+
18 Olee uru ihe oyiyi a pịrị apị+ na ihe oyiyi a wụrụ awụ na onye na-ezi ozizi ụgha+ bara nke mere onye rụrụ ya ji rụọ ya, nke mere o ji tụkwasị ya obi,+ o wee mee chi na-abaghị uru, bụ́ ndị na-adịghị ekwu okwu?+