19 Jehova bụ́ Chineke jikwa ájá kpụọ anụ ọhịa ọ bụla na anụ ufe ọ bụla nke eluigwe, o wee malite ime ka ha na-abịakwute mmadụ ahụ ka ọ mara ihe ọ ga-agụ nke ọ bụla; ihe ọ bụla mmadụ ahụ gụrụ mkpụrụ obi ọ bụla dị ndụ,+ ya abụrụ aha ya.+
7 Jehova wee sị: “M gaje ikpochapụ ndị mmadụ n’elu ala, bụ́ ndị m kere,+ malite na mmadụ ruo n’anụ ụlọ, ruo n’anụ ndị ọzọ na-agagharị agagharị, ruokwa n’anụ ufe nke eluigwe,+ n’ihi na ọ na-ewute m na m kere ha.”+
17 “Ma mụ onwe m, lee, m ga-eweta iju mmiri+ n’elu ụwa iji bibie anụ ahụ́ niile ike ndụ+ na-arụ ọrụ n’ime ha n’okpuru eluigwe. Ihe ọ bụla dị n’ụwa ga-ekubi ume.+