26 O wee gwa nzukọ ahụ, sị: “Biko, sinụ n’ihu ụlọikwuu ndị ajọ omume a pụọ, unu emetụkwala ihe ọ bụla bụ́ nke ha aka,+ ka e wee ghara ikpochapụ unu n’ihi mmehie ha niile.”
6 Ka nke a na-eme, Sọl sịrị ndị Kenaịt:+ “Lawanụ,+ pụọnụ, sinụ n’etiti ndị Amalek pụọ, ka m wee ghara ikpochapụ unu na ha. Unu gosiri ụmụ Izrel niile obiọma*+ mgbe ha si n’Ijipt na-apụta.”+ Ndị Kenaịt wee si n’etiti ndị Amalek pụọ.
6 “Sinụ n’ime Babịlọn gbapụ,+ onye ọ bụla n’ime unu meere mkpụrụ obi ya ụzọ mgbapụ.+ Ka njehie ya ghara igbu unu.+ N’ihi na ọ bụ oge ịbọ ọbọ Jehova.+ Ọ ga-akwụ ya ụgwọ dị ka ọrụ ya si dị.+