25 Tụfịakwa! Ị gaghị eme otú a, igbukọta onye ezi omume na onye ajọ omume, nke na ihe ga-eme onye ajọ omume ga-emekwa onye ezi omume.+ Tụfịakwa! Ị gaghị eme ya.+ Ọ̀ bụ na Onyeikpe nke ụwa dum agaghị eme ihe ziri ezi?”+
26 O wee gwa nzukọ ahụ, sị: “Biko, sinụ n’ihu ụlọikwuu ndị ajọ omume a pụọ, unu emetụkwala ihe ọ bụla bụ́ nke ha aka,+ ka e wee ghara ikpochapụ unu n’ihi mmehie ha niile.”