18 “Ọ ga-apụta gaa n’ebe ịchụàjà ahụ,+ bụ́ nke dị n’ihu Jehova wee kpuchie mmehie ya, ọ ga-eweretụ ọbara oké ehi ahụ na ọbara mkpi ahụ tee ya na mpi ebe ịchụàjà ahụ gburugburu.+
27 “Otú ọ dị, abalị iri n’ọnwa nke asaa nke a ga-abụ ụbọchị mkpuchi mmehie.+ Unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ, unu ga-emekpa mkpụrụ obi unu ahụ́,+ chụọkwara Jehova àjà+ a na-esure n’ọkụ.
7 ma ọ bụ naanị nnukwu onye nchụàjà na-abanye n’ime nkebi nke abụọ ahụ otu ugboro n’afọ,+ ọ naghị abanye ebe ahụ n’ejighị ọbara,+ bụ́ nke ọ na-eji achụ àjà maka onwe ya+ nakwa maka mmehie ndị Izrel mere n’amaghị ama.+