10 Erọn ga-achụkwa àjà mkpuchi mmehie n’elu mpi ya otu ugboro kwa afọ.+ Ọ ga-eji ọbara anụ àjà mmehie+ nke e ji ekpuchi mmehie kpuchie mmehie maka ya otu ugboro kwa afọ, a ga na-eme ya n’ọgbọ unu niile. Ọ bụ ihe kasị nsọ nye Jehova.”
14 “Ọ ga-eweretụ ọbara oké ehi+ ahụ ma jiri mkpịsị aka ya fesa ya n’ihu ihe mkpuchi ahụ n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ, ọ ga-ejikwa mkpịsị aka ya fesa+ ọbara ahụ ugboro asaa n’ihu ihe mkpuchi ahụ.+