19 Jọshụa wee gwa mmadụ niile, sị: “Unu enweghị ike ife Jehova, n’ihi na ọ bụ Chineke dị nsọ;+ ọ bụ Chineke nke chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa.+ Ọ gaghị agbaghara nnupụisi unu na mmehie unu.+
5 Ma dị ka ekweghị ekwe+ gị na obi gị nke na-enweghị nchegharị+ si dị, ị na-akpakọtara onwe gị ọnụma+ nke ga-abịakwasị gị n’ụbọchị ọnụma+ nakwa n’ụbọchị a ga-ekpughe+ ikpe ezi omume nke Chineke.+
4 N’ezie, Chineke ahapụghị inye ndị mmụọ ozi+ ahụ mehiere emehie ahụhụ, kama, site n’ịtụba ha n’ime Tatarọs,+ ọ tụbara ha n’olulu nke oké ọchịchịrị ka e debe ha maka ikpe.+
15 ime ha niile ihe e kpere n’ikpe,+ na ịma ndị niile na-adịghị asọpụrụ Chineke ikpe banyere omume ha niile nke asọpụrụghị Chineke, bụ́ ndị ha mere n’ụzọ asọpụrụghị Chineke, nakwa banyere ihe niile na-awụ akpata oyi nke ndị mmehie na-adịghị asọpụrụ Chineke kwuru megide ya.”+