7 “Mgbe Jehova bụ́ Chineke gị ga-emesị kpọbata gị n’ala ahụ ị na-abanye inweta,+ ọ ga-ekpochapụ mba ndị nwere ụba mmadụ n’ihu gị,+ bụ́ ndị Het+ na ndị Gegash+ na ndị Amọraịt+ na ndị Kenan+ na ndị Perizaịt+ na ndị Haịvaịt+ na ndị Jibọs,+ mba asaa ndị nwere ụba mmadụ ma dị ike karịa gị.+