7 Ma ugbu a, kpọghachi nwunye nwoke ahụ, n’ihi na nwoke ahụ bụ onye amụma,+ ọ ga-arịọsikwara gị arịrịọ ike.+ Dịrịkwa ndụ. Ma ọ bụrụ na ị kpọghachighị ya, mara na ị ga-anwụrịrị, gị na ndị gị niile.”+
17 Ugbu a, biko, gbagharanụ+ m mmehie m naanị otu ugboro a ma rịọsierenụ+ m Jehova bụ́ Chineke unu arịrịọ ike ka o wepụrụ m ihe otiti a na-akpata ọnwụ.”
6 Eze wee zaa onye nke ezi Chineke, sị: “Biko, mee ka obi Jehova bụ́ Chineke gị jụrụ, kpeekwara m ekpere ka e mee ka aka m dịghachi mma.”+ Onye nke ezi Chineke wee mee ka obi Jehova jụrụ,+ e wee mee ka aka eze dị mma, o wee dịrị otú ọ dị na mbụ.+