3 Unu ga-akwatukwa ebe ịchụàjà+ ha ma kụrisịa ogidi nsọ ha,+ unu ga-akpọkwa ogwe osisi ha dị nsọ ọkụ+ ma kwatusịa ihe oyiyi a pịrị apị+ nke chi ha, unu ga-ekpochapụkwa aha ha n’ebe ahụ.+
7 site n’ịghara iso mba ndị a na-akpakọrịta,+ bụ́ ndị a fọdụrụ n’etiti unu. Unu akpọtụkwala chi ha aha,+ unu ejikwala ha ṅụọ iyi,+ unu efekwala ha ofufe, unu akpọkwarala ha isiala.+