27“Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ ebe ịchụàjà nke ga-adị kubit ise n’ogologo nakwa kubit ise n’obosara. Ebe ịchụàjà+ ahụ ga-enwe akụkụ anọ há nhata, ọ ga-adịkwa kubit atọ n’ịdị elu.
7 Onye nchụàjà ga-etesa ọbara ahụ na mpi+ ebe ịchụàjà nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ihu Jehova, bụ́ nke dị n’ụlọikwuu nzute, ọ ga-awụsakwa nke fọdụrụ n’ọbara ehi ahụ n’ala+ ebe ịchụàjà nke àjà nsure ọkụ, bụ́ nke dị n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.