11 Ma n’afọ nke asaa, ị ga-ahapụ ya n’akọghị ya ihe,+ ị ga-ahapụkwa ya ka ọ tọgbọrọ nkịtị, ndị dara ogbenye n’ime ndị gị ga-eri ihe dị na ya; anụ ọhịa ga-eri ihe ha rifọrọ.+ Otú ahụ ka ị ga-eme ubi vaịn gị na ubi oliv gị.
34 “‘N’oge ahụ, ala unu ga-akwụ ụgwọ ụbọchị izu ike o ji n’ụbọchị niile ọ ga-atọgbọrọ n’efu, mgbe unu ga-anọ n’ala ndị iro unu. N’oge ahụ, ala unu ga-edebe ụbọchị izu ike, ebe ọ na-aghaghị ịkwụ ụgwọ ụbọchị izu ike o ji.+